Abụ Ọma 78:1-72
Maskil.* Abụ Esaf.+
78 Ndị m, ṅaanụ ntị n’iwu* m.
Geenụ ntị n’ihe m na-ekwu.
2 M ga-emeghe ọnụ m tụọ ilu.
M ga-atụ ilu ndị a na-atụ n’oge dị anya gara aga.+
3 Ihe anyị nụrụla na ihe anyị ma,Bụ́ ihe nna anyị hà kọọrọ anyị,+
4 Anyị agaghị ezoro ya ụmụ ha.
Anyị ga-akọrọ ọgbọ na-abịa abịa+Ihe ọma ndị Jehova mere nakwa otú o si gosi na ọ dị ike,+Ya bụ, ihe ndị dị ebube o mere.+
5 O nyere Jekọb ntụziaka,*Meekwa ka e nwee iwu n’Izrel.
O nyere nna nna anyị hà iwuKa ha mee ka ụmụ ha mara ihe ndị a,+
6 Ka ọgbọ na-abịa abịa,Ya bụ, ụmụ a ka ga-amụ amụ, mara ihe ndị a.+
Hanwa ga-akọkwara ụmụ nke ha ihe ndị a.+
7 Mgbe ahụ, ha ga-atụkwasị Chineke obi.
Ha agaghị echefu ihe ndị Chineke mere,+Kama ha ga na-edebe iwu ya.+
8 Ọ ga-eme ka ha ghara ịdị ka ndị nna nna ha,Bụ́ ọgbọ isi ike, nke nupụrụ isi,+Ọgbọ nke obi ha na-adịghị n’otu ebe,*+Nke na-atụkwasịghịkwa Chineke obi.
9 E nyere ụmụ Ifrem ụta,Ma ha gbara ọsọ n’ụbọchị ha gara agha.
10 Ha mebiri ọgbụgba ndụ ha na Chineke,+Ha erubeghịkwa isi n’iwu ya.+
11 Ha chefukwara ihe ndị o mere,+Bụ́ ọrụ ndị dị ebube o mere ka ha hụ.+
12 O mere ihe ndị dị ịtụnanya n’ihu ndị nna nna ha+N’Ijipt, n’ógbè Zoan.+
13 O kewara oké osimiri ka ha gafere,O mekwara ka mmiri guzoro ka mgbidi.+
14 O ji ígwé ojii na-edu ha n’ehihie,Jirikwa ìhè ọkụ na-edu ha n’abalị niile.+
15 O mere ka oké nkume ndị dị n’ala ịkpa gbawaa.
O mere ka ha ṅụjuo mmiri afọ ka à ga-asị na ọ̀ bụ mmiri si n’oké osimiri.+
16 O mere ka mmiri si ná nnukwu nkume na-agbapụta,Meekwa ka mmiri na-asọdata ka osimiri.+
17 Ma ha nọ na-emehie ya,Na-enupụrụ Onye Kacha Elu isi n’ọzara.+
18 Ha kpachaara anya maa Chineke aka,*+Na-ekwu ka e nye ha nri na-agụ ha agụụ.*
19 Ha wee kparịa Chineke,Sị: “Chineke ò nwere ike inye anyị nri n’ala ịkpa a?”+
20 Ọ bụ ya kụrụ ihe n’oké nkume,Mmiri wee gbapụta, iyi asọpụtakwa.+
N’agbanyeghị ya, ha jụrụ, sị: “Ò nwere ike inye anyị nri,Ka ò nwere ike inye ndị ya anụ ha ga-ata?”+
21 Mgbe Jehova nụrụ ihe ha kwuru, o were nnukwu iwe.+
O mere ka ọkụ+ regbuo ụfọdụ ụmụ Jekọb,O wesakwara Izrel oké iwe+
22 Maka na ha enweghị okwukwe na Chineke.+
Ha atụkwasịghị ya obi na ọ ga-azọpụtali ha.
23 O wee nye ígwé ojii nke dị n’elu iwu,O meghekwara ọnụ ụzọ eluigwe.
24 Ọ nọ na-eme ka mana na-ezoro ha ka mmiri ka ha rie.
O nyere ha nri si n’eluigwe.+
25 Ndị mmadụ riri nri ndị dike.*+
O nyere ha nri ga-ezuru ha.+
26 O mere ka ifufe si n’ebe ọwụwa anyanwụ fewe n’eluigwe,Jirikwa ike ya mee ka ifufe si n’ebe ndịda fewe.+
27 O mere ka anụ ju ebe niile ka ájá.
Nnụnụ juru ebe niile ka ájá dị n’akụkụ oké osimiri.
28 O mere ka ha na-ada n’ebe ha* mara ụlọikwuu,Gburugburu ụlọikwuu ha.
29 Ha riri ihe rifee afọ ha.
O nyere ha ihe gụrụ ha.+
30 Ma, tupu ha erie ya otú o si na-agụ ha,Mgbe ha ka kpụ nri ha n’ọnụ,
31 Chineke wesara ha oké iwe.+
O gburu ụmụ nwoke ha ndị kacha ike.+
O gburu ụmụ okorobịa Izrel.
32 N’agbanyeghị ihe a, ha mekwuru mmehie.+
Ha enweghị okwukwe n’agbanyeghị na ha hụrụ ọrụ ndị dị ebube ọ rụrụ.+
33 O wee mee ka ha kwụsị ịdị ndụ n’otu ntabi anya ka ebe e kupụrụ ume,+Meekwa ka nsogbu bịara ha na mberede, ha anwụọ.
34 Ma mgbe ọ bụla o gburu ụfọdụ n’ime ha, ha na-achọ ya.+
Ha na-alaghachi chọọ Chineke.
35 Ha na-echeta na Chineke bụ Oké Nkume ha+Nakwa na Chineke Onye Kacha Elu bụ Onye na-agbapụta ha.*+
36 Ma ha gbalịrị ka ha jiri okwu ọnụ ha ghọgbuo ya,Ha ghakwaara ya ụgha.
37 Obi ha adịghị n’ife ya.+
Ha ejighịkwa ọgbụgba ndụ ha na ya kpọrọ ihe.+
38 Ma ọ na-emere ha ebere.+
Ọ na-agbaghara ha* mmehie ha ma ghara ibibi ha.+
Ọ na-eme ka iwe ya dajụọ ugboro ugboro+Kama iwesa ha iwe otú ọ dị ya n’obi.
39 N’ihi na o chetara na ha bụ anụ ahụ́,+Na ha dị ka ifufe nke na-efefere ma ghara ịlọghachi.*
40 Ha nupụụrụ ya isi ọtụtụ ugboro n’ala ịkpa,+Kpasuokwa ya iwe n’ọzara.+
41 Ha nwara Chineke ọnwụnwa ọtụtụ ugboro,+Ha mekwara ihe wutere Onye Nsọ Izrel.
42 Ha echetaghị ike ọ kpara,*Ha echetaghị ụbọchị ọ napụtara ha n’aka onye iro,+
43 Otú o si mee ihe àmà dị iche iche n’Ijipt,+Rụọkwa ọrụ ebube dị iche iche n’ógbè Zoan,
44 Nakwa otú o si mee ka mmiri Naịl ghọọ ọbara,+Nke mere na ndị mmadụ enweghị ike ịṅụ mmiri ya.
45 O zitere odudu n’ìgwè n’ìgwè ka ha tagbuo ndị Ijipt+Nakwa mbàrá ka o mebie ala ha.+
46 O mere ka igurube ndị na-erichapụ ihe rie ihe ha kụrụ n’ubi,Meekwa ka igurube ndị na-abịa n’ìgwè richapụ ihe ha tara ahụhụ rụpụta.+
47 O ji akụ́ mmiri ígwé laa osisi vaịn ha n’iyi,+Jirikwa akụ́ mmiri ígwé bibichaa osisi sịkamọ ha.
48 O mere ka akụ́ mmiri ígwé dagbuo anụ ndị na-eburu ha ibu,+Meekwa ka àmụ̀mà see wee* gbuo anụ ụlọ ha.
49 O wesara ha iwe dị ọkụ,O were nnukwu iwe, taakwa ha ahụhụ.
Ìgwè ndị mmụọ ozi kpataara ha ọdachi.
50 O mere ka iwe ya zuo ha ahụ́.
Ọ napụtaghị ha* n’aka ọnwụ.
O mekwara ka ọrịa na-efe efe gbuo ha.
51 N’ikpeazụ, o gburu ndị niile e bu ụzọ mụọ n’Ijipt,+Bụ́ ndị e bu ụzọ mụọ n’ụlọikwuu ndị dị na Ham.
52 Ọ kpọpụtaziri ndị ya ka ìgwè atụrụ,+Duokwa ha n’ala ịkpa ka ìgwè ewu na atụrụ.
53 Ahụ́ ruru ha ala mgbe ọ na-edu ha,Egwu atụghịkwa ha.+
Oké osimiri kpuchiri ndị iro ha.+
54 O wee kpọbata ha n’ala ya dị nsọ,+N’ebe a bụ́ ugwu ugwu o ji ike* ya nweta.+
55 Ọ chụpụụrụ ha mba dị iche iche.+
O ji eriri e ji atụ̀ ihe tụọ ala, kenyezie ha ya.+
O mere ka ebo dị iche iche e nwere n’Izrel biri n’ụlọ nke ha.+
56 Ma ha nọ na-ama Chineke Onye Kacha Elu aka,* na-enupụkwara ya isi.+
Ha egeghị ntị ná ntụziaka ndị o nyere ha.*+
57 Ha gbakụtakwara ya azụ ma na-aghọ aghụghọ ka ndị nna nna ha.+
Ha dị ka ụta a na-ekwesighị ike, nke a na-atụkwasịghị obi.+
58 Ha nọ na-efe arụsị ha n’ebe ndị dị elu wee na-akpasu ya iwe,+
Ha jikwa arụsị ha a pịrị apị na-akpasu ya iwe.+
59 Chineke hụrụ ihe ha nọ na-eme, ya ewee oké iwe.+
O wee jụ Izrel kpamkpam.
60 O mechara jụ ụlọikwuu dị na Shaịlo,+Bụ́ ebe o bi mgbe o binyeere ndị mmadụ.+
61 O kwere ka ndị iro ya buru igbe ọgbụgba ndụ ya.
O kwere ka ha buru ihe nọchiri anya ike ya na ebube ya.+
62 Ọ hapụrụ ndị ya ka e jiri mma agha gbuo ha,+O wesakwara ndị o ketara oké iwe.
63 Ọkụ regburu ụmụ okorobịa ya.
A gụrụghị ụmụ agbọghọ ya na-amaghị nwoke egwú agbamakwụkwọ.*
64 E ji mma agha gbuo ndị nchụàjà ya,+Ndị nwunye ha ebeghịkwa ákwá.+
65 Jehova wee teta ka à ga-asị na o si n’ụra,+Ka dike+ mmanya pụrụ n’anya.
66 O wee chụghachi ndị iro ya azụ.+
O mere ka ihere na-eme ha mgbe niile.
67 Ọ jụrụ ụlọikwuu Josef.
Ọ họrọghị ebo Ifrem.
68 Kama ọ họọrọ ebo Juda,+Bụ́ Ugwu Zayọn ọ hụrụ n’anya.+
69 Ọ rụrụ ebe nsọ ya ka ọ na-adị mgbe niile ka eluigwe,+Meekwa ka ọ dị ka ụwa nke o kere ka ọ dịruo mgbe ebighị ebi.+
70 Ọ họọrọ ohu ya bụ́ Devid,+O sikwa n’ogige anụ ụlọ kpọrọ ya,+
71 N’ebe ọ na-elekọta nne atụrụ ndị na-enye ụmụ ara.
O mere ka ọ bụrụ onye na-azụ Jekọb, bụ́ ndị ya,+Nakwa Izrel, bụ́ ndị o ketara.+
72 O ji obi ọcha ya zụọ ha ka atụrụ,+O jikwa nkà duo ha.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “ná ntụziaka.”
^ Ma ọ bụ “ihe ncheta.”
^ Na Hibru, “nke na-akwadebeghị obi ha.”
^ Ma ọ bụ “nwaa Chineke ọnwụnwa.”
^ Ma ọ bụ “ka e nye mkpụrụ obi ha nri.”
^ Ma ọ bụ “nri ndị mmụọ ozi.”
^ Na Hibru, “ọ.” O nwere ike ịbụ ụlọikwuu Chineke ma ọ bụkwanụ nke ndị Izrel.
^ Ma ọ bụ “Onye na-abọrọ ha ọbọ.”
^ Ma ọ bụ “na-ekpuchi.”
^ O nwere ike ịbụ, “Ume ndụ ha na-apụ ma ghara ịlọghachi.”
^ Na Hibru, “aka ya.”
^ O nwere ike ịbụ, “ka oké ahụ́ ọkụ.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ha.”
^ Na Hibru, “aka nri.”
^ Na Hibru, “na-anwa Chineke Onye Kacha Elu.”
^ Ma ọ bụ “n’ihe o chetaara ha.”
^ Na Hibru, “A jaghị ụmụ agbọghọ ya na-amaghị nwoke mma.”