Abụ Ọma 84:1-12

  • Ịga n’ụlọikwuu Chineke gụrụ ọbụ abụ agụụ

    • Onye Livaị chọrọ ịna-anọ n’ụlọ nsọ ka nnụnụ (3)

    • “Ịnọ otu ụbọchị n’ogige ụlọ gị” (10)

    • ‘Chineke bụ anyanwụ na ọta’ (11)

Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ; nke ụda Gitit.* Abụ ụmụ Kora.+ Abụ ọma. 84  Jehova nke ụsụụ ndị agha,Ụlọikwuu gị nke dị ebube mara ezigbo mma.+   Ịga n’ogige ụlọ Jehova+Na-agụsi m* agụụ ike. Ọ gụkatala m ike agwụ m. Eji m obi m niile na ike m niile na-eti mkpu ọṅụ n’ihu Chineke dị ndụ.   Jehova nke ụsụụ ndị agha,Eze m na Chineke m,Nnụnụ na-ahụdị ebe ha ga-ebi n’akụkụ nnukwu ebe ịchụàjà gị. Elekentịọba kpakwara akwụ́ ya n’ebe ahụ,Bụ́ ebe ọ na-elekọta ụmụ ya.   Ndị bi n’ụlọ gị na-enwe obi ụtọ.+ Ha ga na-eto gị.+ (Sila)   Ndị ị bụ ike ha na-enwe obi ụtọ,+Ya bụ, ndị ọ na-agụ agụụ ka ha nọrọ n’ụzọ e si aga n’ụlọ gị.   Mgbe ha na-esi na Ndagwurugwu Beka* agafe,Ha na-ewere ebe ahụ ka isi mmiri. Mmiri ozuzo mbụ na-agọzikwa ala ahụ.*   Ha ga na-aga ebe ha na-aga, ma ike agaghị agwụ ha.+ Onye ọ bụla n’ime ha na-abịa n’ihu Chineke n’ime Zayọn.   Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, biko, nụrụ ekpere m. Chineke Jekọb, biko, ṅaa m ntị. (Sila)   Ọta anyị+ na Chineke anyị,*Meere onye i tere mmanụ amara.+ 10  N’ihi na ịnọ otu ụbọchị n’ogige ụlọ gị dị mma karịa ịnọ otu puku ụbọchị n’ebe ọ bụla ọzọ.+ Ọ kaara m mma iguzo ọtọ na-eje ozi* n’ọnụ ụzọ ụlọ Chineke mKama ibi n’ụlọikwuu ndị ajọ omume. 11  N’ihi na Jehova Chineke bụ anyanwụ anyị+ na ọta anyị.+ Ọ na-emere ndị mmadụ amara, na-emekwa ka a na-akwanyere ha ùgwù. Jehova agaghị ajụ inyeNdị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta ihe ọ bụla dị mma.+ 12  Jehova nke ụsụụ ndị agha,Onye tụkwasịrị gị obi na-enwe obi ụtọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
O nwere ike ịbụ, “Onye na-ezi ha ihe ji ngọzi ekpuchi onwe ya ka ákwà.”
Ma ọ bụ “ndagwurugwu osisi beka juru na ya.”
O nwere ike ịbụ, “Chineke, biko, lee ọta anyị.”
Na Hibru, “iguzo.”