Abụ Ọma 149:1-9

  • Abụ e ji kelee Chineke maka na o meriela

    • Chineke hụrụ ndị ya n’anya (4)

    • A ga-akwanyere ndị na-erubere Chineke isi ùgwù (9)

149  Toonụ Jaa!* Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ.+ Toonụ ya n’ọgbakọ ndị na-erubere ya isi.+   Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ n’ihi Onye Ukwu kere ya.+ Ka ụmụ Zayọn ṅụrịa ọṅụ n’ihi Eze ha.   Ka ha gbaa egwú wee too aha ya+Ma jiri obere ịgbà na ụbọ akwara bụkuo ya abụ otuto.+   N’ihi na Jehova hụrụ ndị ya n’anya.+ Ọ na-azọpụta ndị dị umeala n’obi.+   Ka ndị na-erubere Chineke isi ṅụrịa ọṅụ n’ihi na ọ na-akwanyere ha ùgwù. Ka ha nọrọ n’àkwà* ha tie mkpu ọṅụ.+   Ka ha jiri ọnụ ha na-abụku Chineke abụ otuto,Ka ha jidekwa mma agha nwere ihu abụọ n’aka,   Ka ha wee bọọ ọbọ n’isi mba dị iche icheMa taa mba dị iche iche ahụhụ,   Ka ha kee ndị eze ha agbụ ígwèMa tụọ ndị a ma ama n’obodo ha ịga n’ụkwụ,   Ka ha wee mee ha ihe e dere ede nke e kpebiri na a ga-eme ha.+ Ọ bụ ndị niile na-erubere ya isi ka a ga-akwanyere ụdị ùgwù a. Toonụ Jaa!*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.