Abụ Ọma 149:1-9

  • Abụ e ji kelee Chineke maka na o meriela

    • Chineke hụrụ ndị ya n’anya (4)

    • A ga-akwanyere ndị na-erubere Chineke isi ùgwù (9)

149  Toonụ Jaa!* Bụkuonụ Jehova abụ ọhụrụ.+ Toonụ ya n’ọgbakọ ndị na-erubere ya isi.+  2  Ka Izrel ṅụrịa ọṅụ n’ihi Onye Ukwu kere ya.+ Ka ụmụ Zayọn ṅụrịa ọṅụ n’ihi Eze ha.  3  Ka ha gbaa egwú wee too aha ya+Ma jiri obere ịgbà na ụbọ akwara bụkuo ya abụ otuto.+  4  N’ihi na Jehova hụrụ ndị ya n’anya.+ Ọ na-azọpụta ndị dị umeala n’obi.+  5  Ka ndị na-erubere Chineke isi ṅụrịa ọṅụ n’ihi na ọ na-akwanyere ha ùgwù. Ka ha nọrọ n’àkwà* ha tie mkpu ọṅụ.+  6  Ka ha jiri ọnụ ha na-abụku Chineke abụ otuto,Ka ha jidekwa mma agha nwere ihu abụọ n’aka,  7  Ka ha wee bọọ ọbọ n’isi mba dị iche icheMa taa mba dị iche iche ahụhụ,  8  Ka ha kee ndị eze ha agbụ ígwèMa tụọ ndị a ma ama n’obodo ha ịga n’ụkwụ,  9  Ka ha wee mee ha ihe e dere ede nke e kpebiri na a ga-eme ha.+ Ọ bụ ndị niile na-erubere ya isi ka a ga-akwanyere ụdị ùgwù a. Toonụ Jaa!*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.