Abụ Ọma 70:1-5
-
Ọbụ abụ rịọrọ ka e nyere ya aka ngwa ngwa
-
“Mee ngwa ngwa nyere m aka” (5)
-
Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid, nke e ji echeta ihe.
70 Chineke, biko, zọpụta m.
Jehova, biko, bịa ngwa ngwa nyere m aka.+
2 Ka ihere mee ndị na-achọ igbu m,*Ka e mechuokwa ha ihu.
Ka ndị obi na-atọ ụtọ na ọdachi dakwasịrị mGbaghachi azụ n’ihere.
3 Ka a chụghachi ndị na-asị m: “Ntọọ! Ntọọ!” azụ,Ka ihere meekwa ha.
4 Ma, ka ndị niile na-achọ gịNwee obi ụtọ ma ṅụrịa ọṅụ n’ihi gị.+
Ka ndị obi na-atọ ụtọ na ị na-azọpụta ndị gị na-ekwu mgbe niile, sị:
“Ka e too Chineke!”
5 Ma, m bụ ogbenye, e nweghịkwa onye na-enyere m aka.+
Chineke, biko, mee ngwa ngwa nyere m aka.+
Ọ bụ gị na-enyere m aka, ọ bụkwa gị na-anapụta m.+
Jehova, biko, egbula oge.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi m.”