Abụ Ọma 70:1-5

  • Ọbụ abụ rịọrọ ka e nyere ya aka ngwa ngwa

    • “Mee ngwa ngwa nyere m aka” (5)

Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid, nke e ji echeta ihe. 70  Chineke, biko, zọpụta m. Jehova, biko, bịa ngwa ngwa nyere m aka.+  2  Ka ihere mee ndị na-achọ igbu m,*Ka e mechuokwa ha ihu. Ka ndị obi na-atọ ụtọ na ọdachi dakwasịrị mGbaghachi azụ n’ihere.  3  Ka a chụghachi ndị na-asị m: “Ntọọ! Ntọọ!” azụ,Ka ihere meekwa ha.  4  Ma, ka ndị niile na-achọ gịNwee obi ụtọ ma ṅụrịa ọṅụ n’ihi gị.+ Ka ndị obi na-atọ ụtọ na ị na-azọpụta ndị gị na-ekwu mgbe niile, sị: “Ka e too Chineke!”  5  Ma, m bụ ogbenye, e nweghịkwa onye na-enyere m aka.+ Chineke, biko, mee ngwa ngwa nyere m aka.+ Ọ bụ gị na-enyere m aka, ọ bụkwa gị na-anapụta m.+ Jehova, biko, egbula oge.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi m.”