Abụ Ọma 10:1-18

  • Jehova na-enyere onye na-enweghị onye na-enyere ya aka aka

    • Ndị ajọ omume na-ekwu na Chineke adịghị (4)

    • Ndị nọ ná nsogbu na-arịọ Jehova arịrịọ (14)

    • ‘Jehova bụ Eze ruo mgbe ebighị ebi’ (16)

ל [Lamed] 10  Jehova, gịnị mere i ji guzoro n’ebe dị anya? Gịnị mere i ji zoo n’oge m na-ata ahụhụ?+   Mpako na-eme ka onye ajọ omume na-achụ onye na-enweghị onye na-enyere ya aka,+Ma nkata ọjọọ ọ na-akpa ga-ekpudo ya.+   N’ihi na onye ajọ omume na-eji ihe ndị na-agụ ya* agụụ etu ọnụ,+Ọ na-agọzikwa onye anyaukwu.* נ [Nun]Ọ na-elelị Jehova anya.   Mpako na-eme ka onye ajọ omume ghara ime nchọpụta. Naanị ihe ọ na-eche n’obi ya bụ na Chineke adịghị.+   Ihe na-agaziri ya,+Ma, o nweghị ike ịghọta iwu gị.+ Ọ na-achị ndị iro ya niile ọchị.   Ọ na-ekwu n’obi ya, sị: “E nweghị ihe ga-eme ka m daa.* Ọdachi agaghị adakwasị m+Malite n’ọgbọ ruo n’ọgbọ.” פ [Pee]   Ọ na-abụ ndị mmadụ ọnụ mgbe niile, na-agha ụgha, na-eyikwa ndị mmadụ egwu.+ Ọ na-eji ire ya akpata nsogbu, jirikwa ya na-ekwu okwu ọjọọ.+   Ọ na-ezo n’ebe dị nso n’obodo chechie ndị mmadụ. Ọ na-esi n’ebe o zoro pụta gbuo onye aka ya dị ọcha.+ ע [Ayin] Ọ na-achagharị anya, na-achọ onye ga-adaba n’aka ya.+   Ọ na-echere n’ebe o zoro ka ọdụm nọ n’ọgba ya.*+ Ọ na-echere ka o jide onye na-enweghị onye na-enyere ya aka. Ọ na-esechi ụgbụ ya, onye na-enweghị onye na-enyere ya aka atọ n’ime ya.+  10  Ọ na-echi onye o jidere ọnụ n’ala ma kwatuo ya. Ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha na-adaba n’aka ya.  11  Ọ na-asị n’obi ya: “Chineke echefuola.+ O wepụla ihu ya. Ọ naghị ahụ ihe na-eme.”+ ק [Kof] 12  Jehova, biko, bilie.+ Chineke, biko, kpaa ike.*+ Echefula ndị na-enweghị onye na-enyere ha aka.+ 13  Gịnị mere onye ajọ omume ji lelịa Chineke? Ọ na-asị n’obi ya: “Ị gaghị asị m zaa ajụjụ ihe m mere.” ר [Resh] 14  Ma ị na-ahụ ndị ahụ na-akpata nsogbu na ahụhụ. Ị na-ele anya hụ ha ma lebara ha anya.+ Onye dabara n’aka ha na-arịọ gị ka i nyere ya aka.+ Ọ bụ gị na-enyere nwa na-enweghị nna* aka.+ ש [Shin] 15  Napụ onye ajọ omume ike,*+Ka ọ ga-abụ ị chọọ ihe ọjọọ ọ na-eme,Ị gaghịzi ahụ ya. 16  Jehova bụ Eze ruo mgbe niile ebighị ebi.+ E bibiela mba dị iche iche, e wepụkwala ha n’ụwa.+ ת [Tọọ] 17  Ma Jehova, ị ga-anụ arịrịọ ndị dị umeala n’obi na-arịọ gị.+ Ị ga-eme ka obi sie ha ike+ ma gee ha ntị.+ 18  Ị ga-ekpere ụmụ na-enweghị nna na ndị a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi,+Ka mmadụ efu ọ bụla nọ n’ụwa wee ghara ime ka ha tụọ egwu ọzọ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
O nwere ike ịbụ, “Onye anyaukwu na-agọzi onwe ya.”
Ma ọ bụ “ka m zọhie ụkwụ.”
Ma ọ bụ “n’ọhịa.”
Na Hibru, “welie aka gị.”
Ma ọ bụ “nwa na-enweghị nne na nna.”
Na Hibru, “Gbajie aka onye ajo omume.”