Abụ Ọma 93:1-5

  • Ọchịchị dị ebube nke Jehova

    • “Jehova abụrụla Eze” (1)

    • ‘E kwesịrị ịtụkwasị ihe ị na-echetara ndị gị obi’ (5)

93  Jehova abụrụla Eze.+ O yi ebube ka uwe. Jehova yi ike ka uwe. Ọ na-eke ya otú e si eke ájị̀. E kesiri ụwa* ike. A gaghị ebupụli ya ebupụ.*   Ọ bụ gị na-achị* kemgbe oge dị anya gara aga.+ Ị dị adị kemgbe ebighị ebi.+   Jehova, osimiri enugharịala,Osimiri enugharịala ma mee mkpọtụ. Osimiri na-enugharị, na-adakwa oké ụda.   Ma Jehova dị ebube n’eluigweKarịa mkpọtụ ọtụtụ mmiri na-eme,+Karịakwa nnukwu ebili mmiri niile nke oké osimiri.+   E kwesịrị nnọọ ịtụkwasị ihe ị na-echetara ndị gị obi.+ Jehova, ụlọ gị mara mma, ọ na-adịkwa nsọ*+ mgbe niile.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ala.”
Ma ọ bụ “eme ka ọ maa jijiji.”
Na Hibru, “Ocheeze gị kwụsiri ike.”
Ma ọ bụ “ụlọ gị kwesịrị ịdị nsọ.”