Abụ Ọma 93:1-5
93 Jehova abụrụla Eze.+
O yi ebube ka uwe.
Jehova yi ike ka uwe.
Ọ na-eke ya otú e si eke ájị̀.
E kesiri ụwa* ike.
A gaghị ebupụli ya ebupụ.*
2 Ọ bụ gị na-achị* kemgbe oge dị anya gara aga.+
Ị dị adị kemgbe ebighị ebi.+
3 Jehova, osimiri enugharịala,Osimiri enugharịala ma mee mkpọtụ.
Osimiri na-enugharị, na-adakwa oké ụda.
4 Ma Jehova dị ebube n’eluigweKarịa mkpọtụ ọtụtụ mmiri na-eme,+Karịakwa nnukwu ebili mmiri niile nke oké osimiri.+
5 E kwesịrị nnọọ ịtụkwasị ihe ị na-echetara ndị gị obi.+
Jehova, ụlọ gị mara mma, ọ na-adịkwa nsọ*+ mgbe niile.

