Abụ Ọma 138:1-8

  • Chineke bi n’elu, ma ọ na-elebara mmadụ anya

    • ‘Ị zara ekpere m’ (3)

    • ‘M nọrọgodị ná nsogbu, ị na-anapụta m’ (7)

Abụ Devid. 138  M ga-eji obi m niile too gị.+ M ga-anọ n’ihu chi ọzọ dị iche icheBụkuo gị abụ otuto.   M ga-eche ihu n’ụlọ nsọ gị kpọọ isiala,+M ga-etokwa aha gị+N’ihi ịhụnanya gị* nakwa n’ihi na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. I meela ka okwu gị na aha gị dị ebube karịa ihe ọ bụla ọzọ.*   Ị zara m n’ụbọchị m kpọrọ gị.+ I mere ka obi sie m* ike, meekwa ka m dị ike.+   Jehova, ndị eze niile e nwere n’ụwa ga-eto gị,+N’ihi na ọ ga-abụ na ha anụla nkwa ndị i kwere.   Ha ga-abụ abụ banyere ihe dị iche iche Jehova na-eme,N’ihi na Jehova dị nnọọ ebube.+   Ọ bụ eziokwu na Jehova bi n’ebe dị elu, ọ na-ahụ onye dị umeala n’obi.+ Ma ọ naghị abịa ndị dị mpako nso.+   Ọ bụrụgodị na m nọ ná nsogbu, ị na-echebe m ndụ.+ Ị na-amatị aka gị mesie ndị iro m iwe ji ike. Aka gị siri ike* ga-azọpụta m.   Jehova ga-emezu ihe niile o bu n’obi imere m. Jehova, ịhụnanya gị na-adịru mgbe ebighị ebi.+ Ahapụla ọrụ aka gị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
O nwere ike ịbụ, “I meela ka okwu gị dị ebube karịa aha gị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “Aka nri gị.”