Abụ Ọma 137:1-9

  • N’akụkụ osimiri ndị dị na Babịlọn

    • Ha ekweghị abụ abụ a na-abụ na Zayọn (3, 4)

    • A ga-ebibi Babịlọn (8)

137  Anyị nọdụrụ ala n’akụkụ osimiri ndị dị na Babịlọn.+ Anyị bere ákwá mgbe anyị chetara Zayọn.+  2  Anyị konyere ụbọ akwara anyị+N’elu osisi pọpla ndị dị n’ebe ahụ.*  3  Ndị dọọrọ anyị n’agha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ n’ebe ahụ.+ Ndị na-akwa anyị emo chọrọ ka anyị meere ha ihe ọchị. Ha sịrị: “Bụọrọnụ anyị otu n’ime abụ ndị a na-abụ na Zayọn.”  4  Olee otú anyị ga-esi bụọ abụ JehovaN’ala ọzọ?  5  Jeruselem, ọ bụrụ na mụ echefuo gị,Ka aka nri m ghara ịba uru.*+  6  Ọ bụrụ na mụ echetaghị gị,Ọ bụrụ na emeghị m ka JeruselemBụrụ ihe kacha enye m ọṅụ,+Ka ire m tapara n’okpo ọnụ m.  7  Jehova, biko, chetaIhe ndị Ịdọm kwuru n’ụbọchị e meriri Jeruselem. Ha sịrị: “Kwatuo ya! Kwaturuo ya ala!”+  8  Babịlọn,* obodo a ga-ebibi n’oge na-adịghị anya,+Onye ga-emegwara gị ihe i mere anyị+Ga-enwe obi ụtọ.  9  Onye ga-ejide ụmụ gị Kụrie ha na nkume+ ga-enwe obi ụtọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

^ Ebe a na-ekwu bụ Babịlọn.
^ O nwere ike ịbụ, “kpọnwụọ.”
^ Na Hibru, “Ada bụ́ Babịlọn.”