Abụ Ọma 67:1-7

  • Ndị niile bi n’ụwa ga-atụ egwu Chineke

    • Ụwa ga-amara ihe Chineke na-eme (2)

    • ‘Ka mmadụ niile too Chineke’ (3, 5)

    • ‘Chineke ga-agọzi anyị’ (6, 7)

Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụbọ akwara kpọọ ya. Abụ ọma. Abụ. 67  Chineke, ị ga-emere anyị amara ma gọzie anyị. Ị ga-enwe mmasị n’ebe anyị nọ,*+ (Sila)   Ka ụwa niile wee mara ihe ndị ị na-eme,+Mba niile amarakwa otú i si azọpụta ndị gị.+   Chineke, ka ndị mmadụ too gị. Ka mmadụ niile too gị.   Ka mba dị iche iche ṅụrịa ọṅụ ma tie mkpu ọṅụ,+N’ihi na ị ga-ekpe ndị mmadụ ikpe ziri ezi.+ Ị ga na-edu mba dị iche iche dị n’ụwa. (Sila)   Chineke, ka ndị mmadụ too gị. Ka mmadụ niile too gị.   Ala ga-emepụta nri nke ọma.+ Chineke, bụ́ Chineke anyị, ga-agọzi anyị.+   Chineke ga-agọzi anyị,Ndị bi n’ebe niile ụwa sọtụrụ ga-atụkwa egwu* ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Ọ ga-eme ka ihu ya nwuoro anyị ìhè.”
Ma ọ bụ “ga-asọpụrụ.”