Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 A3

Otú Anyị Si Nweta Baịbụl

Ọ bụ Onye e dere uche ya na Baịbụl na Onye anyị si n’aka ya nweta Baịbụl chebere Baịbụl ruo taa. Ọ bụ yanwa mere ka e dee, sị:

“Okwu Chineke anyị na-adịru mgbe ebighị ebi.”Aịzaya 40:8.

Ihe a bụ eziokwu n’agbanyeghị na e nweghị Akwụkwọ Nsọ Hibru na Arameik * ma ọ bụ nke Grik ndị dere Baịbụl ji aka ha dee ka dị n’oge a. Oleezi otú anyị ga-esi jide n’aka na ihe e dere na Baịbụl anyị nwere taa bụ ihe dị n’akwụkwọ ndị ahụ e si n’ike mmụọ nsọ dee?

NDỊ SO MEE KA OKWU CHINEKE DỊRỊ RUO TAA

Ihe so mee ka Akwụkwọ Nsọ Hibru dịrị ruo taa bụ na Chineke gwara ndị oge ochie ka ha na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ. * Dị ka ihe atụ, Jehova gwara ndị eze Izrel ka ha jiri aka ha depụta Iwu Mosis ha ga na-agụ. (Diuterọnọmi 17:18) Chineke nyekwara ndị Livaị ọrụ idowe akwụkwọ Iwu ahụ ka ihe ghara ime ya nakwa ịkụziri ya ndị Izrel. (Diuterọnọmi 31:26; Nehemaya 8:7) Mgbe ndị Juu si Babịlọn lọta, e nwere ndị ghọrọ ndị odeakwụkwọ (ndị Soferim) ma ọ bụ ndị na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ. (Ezra 7:6, ihe e dere n’ala ala peeji) Ndị odeakwụkwọ a mechara depụta akwụkwọ iri atọ na itoolu dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ọtụtụ ugboro.

N’ime ọtụtụ narị afọ gaferenụ, ndị odeakwụkwọ sara anya ná mmiri na-edepụta akwụkwọ ndị a. N’agbata afọ 500 na 1500, ndị Juu bụ́ ndị odeakwụkwọ a na-akpọ ndị Masoret nọ na-edepụta akwụkwọ ndị dị na Baịbụl. A na-akpọ akwụkwọ zuru ezu kacha ochie ha ji aka ha depụta Leningrad Kodeks. E dere ya n’agbata afọ 1008 na 1009. Ma n’ihe dị ka n’afọ 1950, a hụrụ akwụkwọ Baịbụl ma ọ bụ iberibe akwụkwọ Baịbụl dị ihe dị ka narị abụọ na iri abụọ (220) e ji aka dee. A hụrụ ha n’ime akwụkwọ mpịakọta ndị a chọtara n’akụkụ Oké Osimiri Nnu. E dere akwụkwọ ndị ahụ ihe karịrị otu puku afọ tupu e dee Leningrad Kodeks. Mgbe e lebachara anya n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ nakwa na  Leningrad Kodeks, a chọpụtara na n’agbanyeghị na e nwetụrụ ihe dị iche n’otú e si dee okwu ụfọdụ dị n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ, ha abụọ na-ekwu otu ihe.

Oleekwanụ maka akwụkwọ iri abụọ na asaa dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst? Ọ bụ ụfọdụ n’ime ndịozi Jizọs Kraịst na ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya dere ha. Ndị Kraịst oge ochie mere ihe ndị Juu bụ́ odeakwụkwọ na-eme. Ha depụtara akwụkwọ ndị ahụ. (Ndị Kọlọsi 4:16) N’agbanyeghị na eze ukwu Rom bụ́ Dayọklishan na ndị ọzọ gbalịrị ibibi akwụkwọ niile Ndị Kraịst oge ochie dere, ọtụtụ puku iberibe akwụkwọ Baịbụl na akwụkwọ Baịbụl Grik ndị e ji aka depụta n’oge ochie ka dị ruo taa.

A sụgharịkwara akwụkwọ ndị ahụ Ndị Kraịst dere n’asụsụ ndị ọzọ a na-asụ n’oge ochie. Ụfọdụ n’ime ha bụ Aminian, Etiopik, Jọjian, Kọptik, Latin, na Siriak.

ỊMATA BAỊBỤL HIBRU NA GRIK A GA-EJI ASỤGHARỊ BAỊBỤL

Mgbe ndị odeakwụkwọ na-edepụta akwụkwọ Baịbụl n’oge ochie, e nwere ebe ndị ha na-edeghị otu ihe. Oleezi otú anyị ga-esi mata ihe e dere na Baịbụl n’eziokwu?

Ihe mere n’oge ahụ dị ka ebe onye nkụzi gwara otu narị ụmụ akwụkwọ ka ha depụta ihe dị n’otu akwụkwọ. Akwụkwọ ahụ fugodị, e leruo otu narị akwụkwọ ụmụ akwụkwọ ahụ depụtara anya, a ga-achọpụta ihe dị n’akwụkwọ ahụ furu efu. Ọ bụ eziokwu na onye nke ọ bụla n’ime ha nwere ike idehie ihe n’akwụkwọ nke ya, o doro anya na ọ bụghị n’ebe otu onye dehiere ihe ka ndị ọzọ ga-edehie ihe. N’ihi ya, ọ bụrụ na ndị ọkachamara eleruo ọtụtụ puku iberibe akwụkwọ Baịbụl na akwụkwọ Baịbụl ndị e depụtara n’oge ochie anya, ha ga-achọpụta ebe ndị odeakwụkwọ dehiere ihe, jirizie ihe ha chọpụtara mata ihe ndị dere Baịbụl n’oge ochie dere.

‘E nwere ike ikwu na e nweghị akwụkwọ ọ bụla ọzọ e dere n’oge ochie e depụtara ihe dị na ya otú a n’ewepụghị ya ihe ọ bụla’

Obi ò kwesịrị isi anyị ike na ihe dị na Baịbụl anyị nwere ugbu a bụ ihe e dere na Baịbụl n’eziokwu? Otu ọkachamara bụ́ William H. Green kwuru gbasara ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, sị: ‘E nwere ike ikwu na e nweghị akwụkwọ ọ bụla ọzọ e dere n’oge ochie e depụtara ihe dị na ya otú a n’ewepụghị ya ihe ọ bụla.’ Otu ọkachamara n’ihe gbasara Baịbụl aha ya bụ F. F. Bruce kwuru gbasara Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, nke ụfọdụ na-akpọ Agba Ọhụrụ, sị: “Ihe ndị na-egosi na ihe e dere n’Agba Ọhụrụ bụ eziokwu juru eju. Ha karịrị ihe ndị na-egosi na ihe dị n’akwụkwọ ọgụgụ ndị e dere n’oge  ochie bụ eziokwu, n’agbanyeghị na e nweghị ndị na-agbagha ihe ndị e dere n’akwụkwọ ọgụgụ ndị ahụ.” Ọ sịkwara: “Ọ bụrụ na Agba Ọhụrụ bụ akwụkwọ ọgụgụ nkịtị a chịkọtara ọnụ, e nweghị ihe ga-eme ka a gbaghaa na ihe e dere na ya bụ eziokwu.”

Aịzaya isi 40. Ọ dị n’akwụkwọ mpịakọta ndị a chọtara n’akụkụ Oké Osimiri Nnu (e dere ya malite n’afọ 125 T.O.N.K. ruo n’afọ 100 T.O.N.K.)

Mgbe e leruru ya na Baịbụl Hibru ndị e depụtara n’ihe dị ka otu puku afọ e dechara ya anya, ihe ndị dị iche na ha bụ naanị ụmụ obere ihe. Ọtụtụ n’ime ha bụ otú e si sụpee okwu ụfọdụ

Aịzaya isi 40. Ọ dị na Baịbụl bụ́ Alepo Kodeks. Alepo Kodeks bụ Baịbụl Hibru bara ezigbo uru ndị Masoret ji aka dee n’ihe dị ka n’afọ 930

Akwụkwọ Nsọ Hibru: E ji Baịbụl Rudolf Kittel dere, nke a na-akpọ Biblia Hebraica, sụgharịa Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru Bekee (1953-1960). Kemgbe ahụ, e nweela Baịbụl Hibru ndị e degharịrị ihe na ha. Ha bụ Biblia Hebraica Stuttgartensia na Biblia Hebraica Quinta. Ọ bụ ihe ọhụrụ ndị a chọpụtara n’akwụkwọ mpịakọta ndị a chọtara n’akụkụ Oké Osimiri Nnu nakwa n’akwụkwọ Baịbụl ochie ndị ọzọ ka e ji degharịa ha. Ndị ọkachamara ndị wepụtara Baịbụl Hibru ndị ahụ depụtara ihe dị na Baịbụl Hibru bụ́ Leningrad Kodeks, denyekwa otú e si sụgharịa amaokwu ụfọdụ n’akwụkwọ Baịbụl ndị ọzọ n’ala ala peeji. Ụfọdụ n’ime Baịbụl ndị ọzọ ahụ bụ Pentatuk Ndị Sameria, akwụkwọ mpịakọta ndị a chọtara n’akụkụ Oké Osimiri Nnu, Septuagint nke Grik, Tagọm nke Arameik, Vulgate nke Latịn, na Peshitta nke SiriakE lebara anya na Biblia Hebraica Stuttgartensia na Biblia Hebraica Quinta mgbe a na-edegharị Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

Akwụkwọ Nsọ Grik: N’agbata afọ 1853 na 1881, ndị ọkachamara bụ́ B. F. Westcott na F.J.A. Hort wepụtara Baịbụl Grik a ga na-eji asụgharị Akwụkwọ Nsọ Grik. Obi siri ha ike na ihe e dere na ya bụ ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik n’eziokwu. Ha lebara anya na Baịbụl Grik ndị e ji aka dee nakwa n’iberibe akwụkwọ Baịbụl Grik ndị dị n’oge ahụ. N’ihe dị ka n’afọ 1950, Kọmitii Sụgharịrị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ji Baịbụl ahụ B. F. Westcott na F.J.A. Hort wepụtara sụgharịa Akwụkwọ Nsọ Grik. Ha lebakwara anya n’akwụkwọ papaịrọs ndị e kwuru na e dere n’ihe dị ka n’afọ 125 nakwa n’afọ 300. Kemgbe ahụ, e nwetakwuola akwụkwọ papaịrọs ndị ọzọ. E nweekwala Baịbụl Grik ndị ọzọ a na-eji asụgharị Akwụkwọ Nsọ Grik, dị ka nke Nestle na Aland dere nakwa nke ndị United Bible Societies dere. E nwere ihe ndị ọkachamara degharịrị na Baịbụl Grik ndị a n’ihi ihe ọhụrụ ndị ha chọpụtara. E denyere ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ mgbe a na-edegharị Baịbụl a.

Ihe a hụrụ na Baịbụl Grik ndị ahụ a na-eji asụgharị Akwụkwọ Nsọ Grik gosiri na e nwere amaokwu ụfọdụ ndị depụtara Baịbụl denyere n’Akwụkwọ Nsọ Grik n’ụfọdụ Baịbụl ndị o terela aka a sụgharịrị ha, dị ka Baịbụl King James Version. Amaokwu ndị ahụ adịghị na Baịbụl mgbe e ji ike mmụọ nsọ dee ya. Ma ebe ọ bụ na e kebiela Baịbụl n’amaokwu n’amaokwu kemgbe ihe dị ka afọ 1550, e nweghị ihe e denyere n’amaokwu ndị ahụ n’ọtụtụ Baịbụl, ya bụ, Matiu 17:21; 18:11; 23:14; Mak 7:16; 9:44, 46; 11:26; 15:28; Luk 17:36; 23:17; Jọn 5:4; Ọrụ Ndịozi 8:37; 15:34;  24:7; 28:29; na Ndị Rom 16:24. Na Baịbụl a, e tinyere akara na-egosi na e nwere ihe a kọwara n’ala ala peeji n’amaokwu ndị ahụ.

O doro anya na okwu mmechi dị ogologo e dere na Mak 16 (amaokwu 9-20) na okwu mmechi dị mkpirikpi e dere na Mak 16 nakwa ihe e dere na Jọn 7:53–8:11 adịghị na Baịbụl n’eziokwu. N’ihi ya, e denyeghị ha na Baịbụl a. *

A gbanwekwara okwu ụfọdụ ka ha daba n’ihe ndị ọkachamara kwetara na ha dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik n’oge e dere ya. Dị ka ihe atụ, ihe e dere na Matiu 7:13 n’ụfọdụ Baịbụl Grik ndị e ji aka dee bụ: “Sinụ n’ọnụ ụzọ ámá dị warara banye, n’ihi na ọnụ ụzọ ámá sara mbara na okporo ụzọ dị obosara na-eduba ná mbibi.” Ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ bu nke a ụzọ, e denyeghị “ọnụ ụzọ ámá” ugboro abụọ n’amaokwu a. Ma, mgbe e lerukwuru ihe dị na Baịbụl Grik ndị e ji aka dee anya, a chọpụtara na “ọnụ ụzọ ámá” gbara ugboro abụọ n’amaokwu ahụ. N’ihi ya, e denyere ya na Baịbụl a. E nwekwara ọtụtụ okwu ndị ọzọ e degharịrị ka ha ka mma. Ma, ha abụchaghị oké ihe, e nweghịkwa nke mere ka ihe e kwuru n’Okwu Chineke gbanwee.

Akwụkwọ papaịrọs e dere ihe dị ná 2 Ndị Kọrịnt 4:13–5:4. E dere ya n’ihe dị ka n’afọ 200

^ par. 5 A ga na-akpọzi Akwụkwọ Nsọ Hibru na Arameik Akwụkwọ Nsọ Hibru.

^ par. 7 Otu n’ime ihe mere e ji kwesị ịna-edepụta akwụkwọ Baịbụl ndị ahụ bụ na ndị dere Baịbụl dere ha n’ihe na-emebi emebi.

^ par. 18 Gụọ ihe ndị e dere n’ala ala peeji amaokwu ndị a na Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ, nke e bipụtara n’afọ 2007, ka ị matakwuo ihe mere e ji kwuo na amaokwu ndị a adịbughị na Baịbụl.