Abụ Ọma 66:1-20

  • Ọrụ Chineke na-eme ka a na-atụ egwu ya

    • ‘Bịanụ hụ ọrụ Chineke na-arụ’ (5)

    • “M ga-emezu nkwa m kwere gị” (13)

    • Chineke na-anụ ekpere (18-20)

Maka onye na-eduzi abụ. Abụ ọma. Abụ. 66  Unu niile ndị bi n’ụwa, tienụ mkpu ọṅụ, tookwanụ Chineke.+   Bụọnụ abụ iji too aha ya dị ebube. Toonụ ya, jaakwanụ ya mma.+   Sịnụ Chineke: “Ọrụ gị niile na-eme nnọọ ka a na-atụ egwu gị!+ Ndị iro gị ga-ama jijiji n’ihu gị+Maka na ike gị dị ukwuu.   Ndị niile bi n’ụwa ga-akpọrọ gị isiala.+ Ha ga-abụku gị abụ otuto. Ha ga-abụ abụ iji too aha gị.”+ (Sila)   Bịanụ hụ ọrụ dị iche iche Chineke na-arụ. Ihe ọ na-emere ndị mmadụ dị ịtụnanya.+   O mere ka oké osimiri bụrụ ala nkịtị.+ Ha ji ụkwụ gafee osimiri.+ Anyị ṅụrịrị ọṅụ n’ebe ahụ n’ihi ihe o meere anyị.+   O ji ike ya na-achị ruo mgbe ebighị ebi.+ Anya ya na-ahụ mba niile.+ Ndị isi ike ekwesịghị ibuli onwe ha elu.+ (Sila)   Unu ndị dị iche iche, toonụ Chineke anyị,+Ka e jirikwa olu dara ụda too ya.   Ọ na-edowe anyị* ndụ.+ Ọ naghị ekwe ka anyị zọhie ụkwụ.*+ 10  N’ihi na i nyochaala anyị, Chineke.+ Ị nụchaala anyị otú e si anụcha ọlaọcha. 11  I meela ka ụgbụ e ji siere anyị ọnyà jide anyị. I boro anyị ibu na-anyịgbu anyị. 12  I kwere ka mmadụ efu zọpịa anyị.* Anyị tara nnukwu ahụhụ ka à ga-asị na anyị si n’etiti ọkụ nakwa n’etiti mmiri gafere. I wee kpọbata anyị n’ebe obi ga-eru anyị ala. 13  M ga-eji àjà a na-esucha ọkụ bata n’ụlọ gị.+ M ga-emezu nkwa m kwere gị,+ 14  Bụ́ nkwa m ji ọnụ m kwee,+Nke m kwere mgbe m na-ata ahụhụ. 15  M ga-eji anụ ndị gbara agba chụọrọ gị àjà a na-esu ọkụ,M ga-eji ebule chụọrọ gị àjà. M ga-achụ oké ehi na mkpi n’àjà. (Sila) 16  Unu niile ndị na-atụ egwu Chineke, bịanụ gee ntị,M ga-akọkwara unu ihe o meere m.*+ 17  M ji ọnụ m kpọkuo ya,M jikwa ire m too ya. 18  Ọ bụrụ na m bu ihe ọjọọ ọ bụla n’obi m,Jehova agaraghị ege m ntị.+ 19  Ma Chineke nụrụ olu m.+ Ọ ṅara ntị n’ekpere m.+ 20  Toonụ Chineke, onye na-elegharaghị ekpere m anya,Onye na-akwụsịghịkwa ịhụ m n’anya.*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”
Ma ọ bụ “ka ụkwụ anyị maa jijiji.”
Na Hibru, “jiri ịnyịnya wụfee anyị n’isi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “igosi m ịhụnanya pụrụ iche.”