Abụ Ọma 75:1-10

  • Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi

    • Ndị ajọ omume ga-aṅụ iko mmanya Jehova bu (8)

Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Alala M n’Iyi” kpọọ ya. Abụ Esaf.+ 75  Anyị na-ekele gị, Chineke. Anyị na-ekele gị. Ị nọ anyị nso,*+Ndị mmadụ na-akọsakwa ọrụ gị ndị dị ebube.  2  Ị sịrị: “M kpebie oge m ga-ekpe ikpe,M na-ekpe ikpe ziri ezi.  3  Mgbe ụwa na ndị niile bi n’ime ya mara jijiji,*Ọ bụ m mere ka ogidi ya dị iche iche kwụsie ike.” (Sila)  4  M gwara ndị na-etu ọnụ, sị: “Unu etula ọnụ,”Gwakwa ndị ajọ omume, sị: “Unu etola onwe unu na unu dị ike.*  5  Unu etola onwe unu na unu dị ezigbo ike,*Unu etukwala ọnụ.  6  N’ihi na ọ bụghị n’ebe ọwụwa anyanwụ ma ọ bụ n’ebe ọdịda anyanwụ ma ọ bụkwanụ n’ebe ndịdaKa onye na-eme ka mmadụ bụrụ onye ukwu si abịa.  7  N’ihi na ọ bụ Chineke bụ Onyeikpe.+ Ọ na-eweda otu onye ala, bulie onye ọzọ elu.+  8  N’ihi na e nwere iko Jehova bu n’aka.+ Mmanya nke dị n’ime ya na-agbọ ụfụfụ, a gwakwara ya nke ọma. Ọ ga-awụpụrịrị ya. Ndị ajọ omume niile nọ n’ụwa ga-aṅụkwa ya, ṅụchaa ya.”+  9  Ma m ga-akọsa ya ruo mgbe ebighị ebi. M ga-abụku Chineke Jekọb abụ otuto. 10  N’ihi na ọ na-asị: “M ga-anapụ ndị ajọ omume ike.”* Ma, m ga-eme ka onye ezi omume nwekwuo ike.*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Aha gị dị anyị nso.”
Na Hibru, “gbazere.”
Na Hibru, “Unu ebulila mpi unu elu.”
Na Hibru, “Unu ebulila mpi unu elu.”
Na Hibru, “M ga-agbaji mpi ndị ajọ omume.”
Na Hibru, “ga-ebuli mpi onye ezi omume elu.”