Abụ Ọma 52:1-9

  • Tụkwasị Chineke obi n’ihi ịhụnanya ya

    • A dọrọ ndị ji ihe ọjọọ etu ọnụ aka ná ntị (1-5)

    • Ndị ọjọọ na-atụkwasị akụnụba obi (7)

Maka onye na-eduzi abụ. Maskil.* Abụ Devid bụrụ mgbe Doeg onye Ịdọm bịara kọọrọ Sọl na Devid bịara n’ụlọ Ahimelek.+ 52  Gị dike, gịnị mere i ji jiri ihe ọjọọ ndị ị na-eme na-etu ọnụ?+ Ịhụnanya Chineke na-adịru mgbe niile.+  2  I ji ire gị, nke na-aghọ nkọ ka agụba,+Na-akpa nkata ọjọọ, jirikwa ya na-aghọ aghụghọ.+  3  Ihe ọjọọ na-amasị gị karịa ihe ọma. Ịgha ụgha na-amasị gị karịa ikwu eziokwu. (Sila)  4  Gị onye ire ya bụ aghụghọ aghụghọ,Ihe na-amasị gị bụ okwu ọ bụla na-agbawa ndị mmadụ obi.  5  Ọ bụ ya mere Chineke ga-eji dọturuo gị ala.+ Ọ ga-adọrọ gị ma dọpụta gị n’ụlọikwuu gị.+ Ọ ga-ekpochapụ gị n’ụwa.*+ (Sila)  6  Ndị ezi omume ga-ahụ ya, ya erie ha ọnụ,+Ha ga-achịkwa ya ọchị, sị,+  7  “Lee nwoke na-ejighị Chineke mere ebe mgbaba ya,+Kama ọ tụkwasịrị obi ná nnukwu akụnụba ya+Nakwa na nkata ọjọọ ọ na-akpa.”*  8  Ma, m ga-ama pokopoko n’ụlọ Chineke otú osisi oliv si ama pokopoko. Obi siri m ike na Chineke ga-ahụ m n’anya*+ ruo mgbe niile ebighị ebi.  9  M ga-eto gị ruo mgbe ebighị ebi maka na i meela ihe.+ M ga-anọ n’ihu ndị na-erubere gị isiGosi na m tụkwasịrị obi n’aha gị+ maka na ọ dị mma.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “n’ala ndị dị ndụ.”
Ma ọ bụ “O jikwa nkata ọjọọ ọ na-akpa mere ebe mgbaba.”
Ma ọ bụ “ga-egosi m ịhụnanya pụrụ iche.”