Abụ Ọma 82:1-8

  • Chineke chọrọ ka ndị ya na-ekpe ikpe ziri ezi

    • Chineke na-ekpe ikpe n’etiti “chi dị iche iche” (1)

    • “Kpechitenụ ọnụ onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya” (3)

    • “Unu bụ chi” (6)

Abụ Esaf.+ 82  Chineke eguzorola n’etiti ndị bụ́ chi.+ Ọ na-ekpe ikpe n’etiti chi dị iche iche,* na-asị:+   “Olee mgbe unu ga-akwụsị ikpe ikpe na-ezighị ezi,+Kwụsịkwa ikpelara ndị ajọ omume ikpe?+ (Sila)   Kpechitenụ ọnụ onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na nwa na-enweghị nna.+ Kpeenụ ogbenye na onye na-enweghị onye na-enyere ya aka ikpe ziri ezi.+   Napụtanụ ogbenye na onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya. Zọpụtanụ ha n’aka ndị ajọ omume.”   Ha* amaghị ihe, ha anaghịkwa aghọta ihe.+ Ha na-ejegharị n’ọchịchịrị. A naghị ekpe ikpe ziri ezi n’ụwa, e nweghịkwa ihe e ji iwu kpọrọ.*+   “M sịrị, ‘Unu bụ chi.*+ Unu niile bụ ụmụ Onye Kacha Elu.   Ma unu ga-anwụ otú ndị ọzọ si anwụ.+ Unu ga-adakwa otú ndị ọzọ bụ́ ndị isi si ada.’”+   Chineke, biko, bilie kpee ụwa ikpe,+N’ihi na ọ bụ gị nwe mba niile.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ndị yiri chi.” Ọ ga-abụ ndị ikpe Izrel ka a na-ekwu maka ha.
Ya bụ, chi ndị ahụ e kwuru okwu ha n’amaokwu 1.
Na Hibru, “Ntọala niile nke ụwa na-ama jijiji.”
Ma ọ bụ “Unu dị ka chi.” Ọ ga-abụ ndị ikpe Izrel ka a na-ekwu maka ha.