Abụ Ọma 6:1-10

  • Arịrịọ Devid rịọrọ ka e meere ya amara

    • Ndị nwụrụ anwụ anaghị eto Chineke (5)

    • Chineke na-anụ arịrịọ a na-arịọ ya (9)

Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụbọ akwara kpọọ ya n’ụda Sheminit.* Abụ Devid. 6  Jehova, biko, ejila iwe baara m mba,Ejikwala ọnụma dọọ m aka ná ntị.+  Jehova, biko, meere m amara,* n’ihi na ike na-agwụ m. Jehova, biko, gwọọ m,+ n’ihi na ọkpụkpụ m na-ama jijiji.   N’eziokwu, obi ekweghị ezu m ike,+Biko, Jehova, m na-ajụ gị, sị, olee mgbe ọ ga-ebi?+   Jehova, biko, lọghachi ka ị napụta m.*+ Zọpụta m n’ihi ịhụnanya gị.*+   N’ihi na onye nwụrụ anwụ anaghị akpọ aha* gị. Ònye ga-anọli n’ili* too gị?+   Ude m na-asụ emeela ka ike gwụ m.+ Anya mmiri m na-ede àkwà* m abalị niile. Ákwá m na-ebe na-eme ka anya mmiri m dee ihe m ji edina ala.+   Uju m na-eru emeela ka anya m gharazie ịna-ahụcha ụzọ.+ Ọ na-ahụzi inyoghi inyoghi n’ihi ndị niile na-achọ m okwu.   Pụọnụ n’ebe m nọ, unu niile ndị na-eme ihe ọjọọ,N’ihi na Jehova ga-anụ ákwá m na-ebe.+   Jehova ga-anụ arịrịọ m na-arịọ ka o meere m amara.+ Jehova ga-aza ekpere m. 10  A ga-eme ka ihere mee ndị iro m niile, obi adaa ha mbà. Ihere ga-ejide ha na mberede, ha alaghachi azụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ebere.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “anaghị echeta.”
Ma ọ bụ “na Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “ihe ndina.”