Abụ Ọma 100:1-5

  • Keleenụ Chineke

    • “Jirinụ ọṅụ na-efe Jehova” (2)

    • ‘Ọ bụ Chineke kere anyị’ (3)

Abụ ekele. 100  Unu niile ndị bi n’ụwa, toonụ Jehova, tiekwanụ mkpu ọṅụ.+   Jirinụ ọṅụ na-efe Jehova.*+ Tirinụ mkpu ọṅụ bịa n’ihu ya.   Maranụ* na Jehova bụ Chineke.+ Ọ bụ ya kere anyị, ọ bụkwa ya nwe anyị.*+ Anyị bụ ndị ya, bụrụkwa ìgwè atụrụ ọ na-enye nri.+   Batanụ n’ọnụ ụzọ ámá ụlọ ya kelee ya.+ Batanụ n’ogige ụlọ ya too ya.+ Keleenụ ya. Toonụ aha ya.+   N’ihi na Jehova dị mma.+ Ịhụnanya ya na-adịru mgbe ebighị ebi,Ọ bụkwa onye e kwesịrị ịtụkwasị obi n’ọgbọ niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “na-ejere ya ozi.”
Ma ọ bụ “Kwetanụ.”
O nwere ike ịbụ, “ọ bụghị anyị kere onwe anyị.”