Abụ Ọma 120:1-7

  • Onye mbịarambịa nke chọrọ udo

    • ‘Napụta m n’aka ndị ire ha bụ aghụghọ aghụghọ’ (2)

    • “Achọrọ m udo” (7)

Abụ Mgbago.* 120  M kpọkuru Jehova n’oge m na-ata ahụhụ,+Ya aza m.+  2  Jehova, biko, napụta m* n’aka ndị ụghaNakwa n’aka ndị ire ha bụ aghụghọ aghụghọ.  3  Gị onye ire ya bụ aghụghọ aghụghọ,+Gịnị ka Chineke ga-eme gị? Oleekwa ụdị ahụhụ ọ ga-ata gị?  4  Ọ ga-eji akụ́ pịrị ọnụ+ nke onye aghaNakwa icheku ọkụ+ nke si n’osisi brum taa gị ahụhụ.  5  Efuola m n’ihi na m biela na Mishek ka onye mbịarambịa!+ M bi n’ụlọikwuu ndị Kida kemgbe.+  6  Mụ na ndị na-achọghị udo+Ebiteela aka.  7  Achọrọ m udo, ma mgbe ọ bụla m kwuru okwu,Ha na-ejikere ịlụso m agha.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”