Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 A5

Otú Aha Chineke Si Gbaa n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst

Ndị ọkachamara n’ihe gbasara Baịbụl kwetara na aha Chineke, bụ́ mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ a (יהוה), gbara ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ugboro puku asaa (7,000) n’Akwụkwọ Nsọ Hibru n’oge e dere ya. Ma, ọtụtụ ndị chere na e denyeghị aha a n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’oge e dere ya. Ọ bụ ya mere na e deghị aha a bụ́ Jehova n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst (nke ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ọhụrụ) n’ọtụtụ Baịbụl Bekee nakwa n’ọtụtụ Baịbụl Igbo a sụgharịrị n’oge na-adịbeghị anya. Ọtụtụ ndị sụgharịrị Baịbụl edeghịdị aha Chineke mgbe ihe ha na-asụgharị n’Akwụkwọ Nsọ Grik bụ ihe e si n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nweta, n’agbanyeghị na Tetragramatọn gbara n’ebe ahụ. Ọ na-abụ ha rute n’ebe aha ahụ dị, ha edee ya “Onyenwe anyị” kama ide ya ezigbo aha Chineke.

Ndị sụgharịrị Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ emeghị ihe a ọtụtụ ndị sụgharịrị Baịbụl mere. Ha dere Jehova ugboro narị abụọ na iri atọ na asaa (237) n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. E nwere ihe abụọ dị ezigbo mkpa ha lebara anya mee otú ahụ: (1) Akwụkwọ Baịbụl Grik ndị dị taa abụghị ndị nke ndị dere Baịbụl ji aka ha dee. E nwere ọtụtụ puku akwụkwọ Baịbụl Grik taa. Ma, e depụtaghachiri ọtụtụ n’ime ha ihe dị ka narị afọ abụọ e dechara Akwụkwọ Nsọ Grik. (2) N’oge ahụ, ndị na-edepụtaghachi akwụkwọ Baịbụl Grik na-eji okwu Grik bụ́ Kyʹri·os nke pụtara “Onwenwe anyị” edochi Tetragramatọn ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha na-elere anya n’akwụkwọ Baịbụl Grik ndị e jirila “Onwenwe anyị” dochie aha Chineke na-edepụtaghachi ndị nke ọhụrụ.

Kọmitii Sụgharịrị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ kpebiri na e nwere ihe gosiri na e dere Tetragramatọn n’Akwụkwọ Nsọ Grik mgbe a na-ede ya. Ọ bụ ihe ndị a mere ha ji kpebie otú ahụ:

  • Tetragramatọn gbara n’ọtụtụ ebe n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị dị n’oge Jizọs na ndịozi ya nọ n’ụwa. N’oge gara aga, ụfọdụ ndị ekwetaghị na ihe a bụ eziokwu. Ma kemgbe a chọtara Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị e depụtaghachiri n’oge ndịozi Jizọs nọ n’ụwa, e nweghịzi onye ga-arụ ụka na Tetragramatọn gbara na ha. Ọ bụ n’ebe dị nso na Kumran ka a chọtara akwụkwọ ndị ahụ.

  • N’oge Jizọs na ndịozi ya nọ n’ụwa, Tetragramatọn gbara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ndị a sụgharịrị n’asụsụ Grik. Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ndị ọkachamara chere na Tetragramatọn adịghị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru a sụgharịrị n’asụsụ Grik, nke a na-akpọ Septuagint nke Grik. Ma n’ihe dị ka afọ 1950, e gosiri ndị ọkachamara  iberibe akwụkwọ ụfọdụ merela ezigbo ochie si na Septuagint nke Grik ndị dị n’oge Jizọs nọ n’ụwa. E dere aha Chineke na ha ná mkpụrụ akwụkwọ Hibru. N’ihi ya, n’oge Jizọs nọ n’ụwa, aha Chineke dị n’Akwụkwọ Nsọ ndị a sụgharịrị n’asụsụ Grik. Ma n’ihe dị ka afọ 300 Oge Ndị Kraịst, aha Chineke adịghịzi n’ọtụtụ Baịbụl Septuagint nke Grik ndị mmadụ na-agụkarị, malite n’akwụkwọ Jenesis ruo Malakaị (bụ́ ebe ha dịbu n’akwụkwọ Baịbụl ndị nke ochie). Dị ka ihe atụ, aha Chineke adịghị na Baịbụl a na-akpọ Kodeks Vatikanus na Kodeks Sinaitikus. Ọ bụ ya mere na o kwesịghị iju anyị anya na aha Chineke adịghị n’Akwụkwọ Nsọ Grik ndị e depụtaghachiri malite n’oge ahụ gawa.

    Jizọs kwuru hoo haa, sị: “Abịala m n’aha Nna m.” O kwukwara na ọ bụ “n’aha Nna” ya ka ọ rụrụ ọrụ niile ọ rụrụ

  • Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst gosiri na Jizọs kpọrọ aha Chineke ọtụtụ ugboro, meekwa ka ndị ọzọ mara ya. (Jọn 17:6, 11, 12, 26) Jizọs kwuru hoo haa, sị: “Abịala m n’aha Nna m.” O kwukwara na ọ bụ “n’aha Nna” ya ka ọ rụrụ ọrụ niile ọ rụrụ—Jọn 5:43; 10:25.

  • Ebe ọ bụ na e si n’ike mmụọ nsọ dee Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ka ya na Akwụkwọ Nsọ Hibru bụrụ otu Baịbụl, e kwesịghị ịchọwa aha Chineke achọwa n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. N’ihe dị ka n’afọ 50 Oge Ndị Kraịst, onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Jems gwara ndị okenye nọ na Jeruselem, sị: “Simiọn akọọrọla anyị nke ọma otú Chineke si cheta ndị mba ọzọ, malitezie isi n’ime ha na-ahọrọ ndị ga-aza aha ya.” (Ọrụ Ndịozi 15:14) O doro anya na Jems agaghị ekwu ihe a ma ọ bụrụ na e nweghị onye ma aha Chineke n’oge ahụ ma ọ bụkwanụ na-akpọ Chineke aha ahụ.

  • E dere mkpọbiri aha Chineke n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. E nwere okwu e dere ná Mkpughe 19:1, 3, 4, 6 nke aha Chineke dị na ya. Okwu ahụ bụ “Haleluja.” E si n’okwu Hibru nweta ya. Ọ pụtara “Toonụ Jaa.” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova. E si n’aha Chineke nweta ọtụtụ aha e dere n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwudịrị na aha Jizọs pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.”

  • Akwụkwọ ndị Juu dere n’oge gboo gosiri na ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst dere aha Chineke n’akwụkwọ ha dere. E nwere otu akwụkwọ aha ya bụ Tosefta. Ihe dị na ya bụ iwu ndị Juu a na-edebughị ede. E dechara akwụkwọ ahụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ asaa (1,700) gara aga. Akwụkwọ ahụ kwuru gbasara  akwụkwọ dị iche iche Ndị Kraịst dere bụ́ ndị a kpọrọ ọkụ n’Ụbọchị Izu Ike, sị: “Ha anaghị ewepụta Akwụkwọ Ndị Ozi Ọma na akwụkwọ ndị minim n’ọkụ [e chere na ndị minim bụ ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst]. Ha na-ahapụ ha ka ọkụ gbaa ha n’ebe ha dị, gbakọtakwa Aha Chineke e dere na ha.” Akwụkwọ ahụ kwukwara ihe otu onye Rabaị bụ́ onye Galili aha ya bụ Yosé kwuru. Yosé dịrị ndụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ itoolu (1,900) gara aga. Ọ sịrị na n’ụbọchị ndị ọzọ na-abụghị ụbọchị izu ike, “a na-achakapụta ebe e dere aha Chineke n’akwụkwọ ndị ahụ [ọ dị ka ọ̀ bụ akwụkwọ ndị ahụ Ndị Kraịst dere ka a na-ekwu] ma dowe ha iche, kpọzie akwụkwọ ndị ahụ ọkụ.”

  •   Ụfọdụ ndị ọkachamara n’ihe gbasara Baịbụl kwetara na ọ ga-abụ na aha Chineke gbara n’Akwụkwọ Nsọ Grik n’ebe ndị e dere ihe si n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. E nwere isiokwu gbara n’akwụkwọ bụ́ The Anchor Bible Dictionary. Isiokwu ahụ bụ “Ebe Ndị E Dere Tetragramatọn n’Agba Ọhụrụ.” E dere na ya, sị: ‘E nwere ihe ụfọdụ gosiri na n’oge e dere Agba Ọhụrụ, e dere Tetragramatọn, ya bụ, aha Chineke bụ́ Yahweh, n’ebe niile ma ọ bụ n’ebe ụfọdụ e si n’Agba Ochie nweta ihe e dere n’Agba Ọhụrụ.’ Ọkachamara bụ́ George Howard sịrị: ‘Ebe ọ bụ na a ka na-ede Tetragram na Baịbụl Grik [ya bụ, Septuagint], nke sokwanụ n’Akwụkwọ Nsọ chọọchị oge gboo nwere, anyị kwesịrị ikweta na ndị dere  Agba Ọhụrụ dere Tetragram ahụ n’akwụkwọ Baịbụl ndị ha dere n’oge ha na-ede ihe ndị si n’Agba Ochie.’

  • Ụfọdụ ndị a ma ama sụgharịrị Baịbụl dere aha Chineke n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ha sụgharịrị. Ụfọdụ n’ime ndị nsụgharị a dere aha Chineke n’Akwụkwọ Nsọ Grik ndị ahụ ọtụtụ afọ tupu e wepụta Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. Ihe a bụ aha ndị nsụgharị ahụ na Baịbụl ndị ha sụgharịrị: A Literal Translation of the New Testament . . . From the Text of the Vatican Manuscript, nke Heman Heinfeta sụgharịrị n’afọ 1863; The Emphatic Diaglott, nke Benjamin Wilsịn sụgharịrị n’afọ 1864; The Epistles of Paul in Modern English, nke Jọọji Baka Stivins sụgharịrị n’afọ 1898; St. Paul’s Epistle to the Romans, nke W. G. Rutherford sụgharịrị n’afọ 1900; The New Testament Letters, nke J.W.C. Wand, bụ́ Bishọp Lọndọn, sụgharịrị n’afọ 1946. Pablo Besson dekwara “Jehová” na Luk 2:15 nakwa na Jud 14 na Baịbụl ọ sụgharịrị n’asụsụ Spanish n’afọ 1919. E nwekwara ihe ndị o dere n’ala ala peeji Baịbụl ahụ. N’ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu narị n’ime ha, o dere ihe gosiri na o nwere ike ịbụ aha Chineke ka e kwesịrị ide n’ebe ndị ahụ. Ogologo oge tupu a sụgharịa Baịbụl ndị ahụ, a na-ede Tetragramatọn n’ọtụtụ ebe n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst a sụgharịrị n’asụsụ Hibru malite n’ihe dị ka narị afọ anọ gara aga gawa. Ọ dịkarịa ala, e nwere Baịbụl Jaman iri na otu e dere “Jehovah” (ma ọ bụ “Yahweh”) n’ime ha n’Akwụkwọ Nsọ  Grik nke Ndị Kraịst. E nwekwara Baịbụl Jaman anọ ndị sụgharịrị ha dere aha Chineke na ha mgbe ha dechara “Onyenwe anyị” ma werezie akara ngebichi a [ ] gebichie ya. N’ihe karịrị Baịbụl iri asaa a sụgharịrị n’asụsụ Jaman, e dere aha Chineke n’ala ala peeji ma ọ bụ n’ebe ndị a kọwara okwu ndị dị na Baịbụl.

    Aha Chineke gbara n’Ọrụ Ndịozi 2:34 na Baịbụl a na-akpọ The Emphatic Diaglott. Ọ bụ Benjamin Wilsịn sụgharịrị ya n’afọ 1864

  • E nwere Baịbụl ndị e dere aha Chineke na ha n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’ihe karịrị otu narị asụsụ. Ndị sụgharịrị Baịbụl n’ọtụtụ asụsụ a na-asụ n’Afrịka, Amerịka, Eshia, Yurop, nakwa ná mba ndị Oké Osimiri Pasifik gbara gburugburu dere aha Chineke n’ọtụtụ ebe n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. (Asụsụ ndị ahụ dị na  peeji nke 1942 na 1943.) Ọ bụ ihe ndị ahụ anyị kwurula mere ndị sụgharịrị Baịbụl ndị ahụ ji dee aha Chineke na ha. Ọ dịbedịghị anya a sụgharịrị ụfọdụ n’ime ha. Dị ka ihe atụ, a sụgharịrị Baịbụl Rotuman n’afọ 1999. “Jihova” gbara na ya ugboro iri ise na otu n’ime amaokwu iri anọ na asatọ. A sụgharịrị Baịbụl Batak (Toba) n’afọ 1989. A na-asụ asụsụ a n’Indoneshia. E dere “Jahowa” na ya ugboro otu narị na iri (110).

    Aha Chineke gbara na Mak 12:29, 30 na Baịbụl a sụgharịrị n’asụsụ Hawayan

O doro anya na e nwere ezigbo ihe mere e ji weghachi aha Chineke, bụ́ Jehova, n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ọ bụ ihe ndị sụgharịrị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ mere. Ha ejighị aha Chineke egwu egwu, ha agaghịkwa anwa anwa wepụ ihe ọ bụla n’ihe dị na Baịbụl n’oge e dere ya.—Mkpughe 22:18, 19.