Abụ Ọma 3:1-8

  • Tụkwasị Chineke obi n’agbanyeghị nsogbu

    • “Gịnị mere ndị iro m ji dị nnọọ ọtụtụ?” (1)

    • “Jehova, ọ bụ gị bụ onye nzọpụta” (8)

Abụ Devid bụrụ mgbe ọ na-agba ọsọ n’ihi Absalọm nwa ya.+ 3  Jehova, gịnị mere ndị iro m ji dị nnọọ ọtụtụ?+ Gịnị mere ọtụtụ ndị ji na-alụso m agha?+   Ọtụtụ ndị na-ekwu banyere m,* sị: “Chineke agaghị azọpụta ya.”+ (Sila)*   Ma gịnwa bụ́ Jehova bụ ọta gbara m gburugburu,+Ebube m+ na Onye na-eme ka obi sie m ike.*+   M ga-eweli olu m kpọọ Jehova,Ọ ga-esikwa n’ugwu nsọ ya+ za m. (Sila)   M ga-edina ala rahụ ụra. M ga-etetakwa n’udo,N’ihi na Jehova na-akwado m.+   Anaghị m atụ egwu puku kwuru puku mmadụNdị gbara m gburugburu ka ha lụso m agha.+   Jehova, biko, bilie. Zọpụta m,+ Chineke m. N’ihi na ị ga-akụ ndị iro m niile ihe n’agba. Ị ga-akụpịasị ezé ndị ajọ omume.+   Jehova, ọ bụ gị bụ Onye nzọpụta.+ Ị na-agọzi ndị gị. (Sila)

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “Onye na-ebuli isi m elu.”