Abụ Ọma 129:1-8

  • A lụsoro ọbụ abụ ọgụ, ma e merighị ya

    • E mechuru ndị kpọrọ Zayọn asị ihu (5)

Abụ Mgbago. 129  “Ha na-alụso m ọgụ mgbe niile kemgbe m bụ nwata,”+Ka ndị Izrel kwuo, sị,   “Ha na-alụso m ọgụ mgbe niile kemgbe m bụ nwata.+ Ma ha emeribeghị m.+   Ndị na-akọ ihe akọọla m ihe n’azụ.+ Ebe ndị ha kọrichara n’azụ m dị ogologo.”   Ma Jehova bụ onye ezi omume.+ Ọ dọbisiela ụdọ ndị ajọ omume kere m.+   A ga-emechu ndị niile kpọrọ Zayọn asị ihu,+Ha ga-agbaghachikwa azụ n’ihere.   Ha ga-adị ka ahịhịa puru n’elu ụlọ,Nke na-akpọnwụ tupu e fopụ ya,   Nke na-enweghịdị ike iju ọbụ aka onye na-ewe ihe ubi,Nke na-enweghịkwa ike iju aka onye na-achịkọta ọka n’ùkwù n’ùkwù.   Ndị na-agafe agafe agaghị ekwu, sị: “Ka Jehova gọzie unu. Anyị na-agọzi unu n’aha Jehova.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji