Abụ Ọma 2:1-12

  • Jehova na onye o tere mmanụ

    • Jehova na-achị mba dị iche iche ọchị (4)

    • Jehova chiri onye ọ họpụtara eze (6)

    • Kwanyere ọkpara Chineke ùgwù (12)

2  Gịnị mere mba niile ji na-agba ghara ghara,Ndị dị iche iche ana-atamukwa ihe* na-enweghị isi?+   Ndị eze ụwa na-ejikere,Ndị isi na-ezukọtakwa ka otu ndị+Ka ha lụso Jehova na onye o tere mmanụ ọgụ.+   Ha na-asị: “Ka anyị dọbisịa agbụ ha kere anyị,Tụfusịakwa ụdọ ha.”   Onye nọ n’ocheeze n’eluigwe ga-achị ọchị. Jehova ga-akwa ha emo.   N’oge ahụ, ọ ga-eji iwe gwa ha okwu,Jirikwa oké iwe na-ewe ya yie ha egwu.   Ọ ga-asị: “Echiela m onye m họpụtara eze+Na Zayọn,+ bụ́ ugwu nsọ m.”   Ka m kọsaa ihe Jehova kwuru. Ọ gwara m, sị: “Ị bụ ọkpara m.+ Abụrụla m nna gị taa.+   Rịọ m, m ga-enye gị mba dị iche iche ka ha bụrụ ihe i ketara,Nyekwa gị ebe niile ụwa sọtụrụ ka ha bụrụ nke gị.+  Ị ga-eji mkpanaka ígwè kụpịa ha,+Ị ga-akụrikwa ha ka ite ụrọ.”+ 10  Ugbu a, unu ndị eze, gosinụ na unu na-aghọta ihe. Unu ndị na-ekpe ikpe n’ụwa, nabatanụ aka ná ntị a na-adọ unu.* 11  Na-atụnụ egwu Jehova mgbe unu na-efe ya,Na-amakwanụ jijiji mgbe unu na-aṅụrị ọṅụ. 12  Kwanyerenụ ọkpara ya ùgwù,*+ ma ọ́ bụghị ya, Chineke* ga-ewe iwe,Unu ewee laa n’iyi,+N’ihi na o nwere ike iwe iwe ngwa ngwa. Ndị niile na-agbaba n’ime ya na-enwe obi ụtọ.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ana-atụgharịkwa uche n’ihe.”
Ma ọ bụ “kpacharanụ anya.”
Na Hibru, “Susuonụ ọkpara ya ọnụ.”
Na Hibru, “ọ.”