Abụ Ọma 115:1-18

  • Naanị Chineke ka e kwesịrị ito

    • Arụsị adịghị ndụ (4-8)

    • E nyere ndị mmadụ ụwa (16)

    • “Ndị nwụrụ anwụ anaghị eto Jaa” (17)

115  Jehova, ọ bụghị anyị ka e kwesịrị ito, ọ bụghị anyị,*Kama ọ bụ aha gị ka e kwesịrị ịna-eto+N’ihi ịhụnanya gị* nakwa n’ihi na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+  2  Gịnị mere ị ga-eji kwe ka mba dị iche iche sị: “Olee ebe Chineke ha nọ?”+  3  Chineke anyị nọ n’eluigwe. Ọ na-eme ihe ọ bụla dị ya mma.  4  E ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ arụsị ha na-efe. Ọ bụ mmadụ kpụrụ ha.+  5  Ha nwere ọnụ, ma ha anaghị ekwu okwu.+ Ha nwere anya, ma ha anaghị ahụ ụzọ.  6  Ha nwere ntị, ma ha anaghị anụ ihe. Ha nwere imi, ma ha anaghị anụ ísì.  7  Ha nwere aka, ma ha anaghị emetụ ihe aka. Ha nwere ụkwụ, ma ha anaghị aga ije.+ Ha anaghị eji akpịrị ha eme mkpọtụ ọ bụla.+  8  Ndị na-akpụ ha ga-adị nnọọ ka ha,+Ndị niile tụkwasịrị ha obi ga-adịkwa ka ha.+  9  Unu ndị Izrel, tụkwasịnụ Jehova obi.+ Ọ bụ ya na-enyere unu aka, bụrụkwa ọta unu.+ 10  Ezinụlọ Erọn,+ tụkwasịnụ Jehova obi. Ọ bụ ya na-enyere unu aka, bụrụkwa ọta unu. 11  Unu ndị na-atụ egwu Jehova, tụkwasịnụ Jehova obi.+ Ọ bụ ya na-enyere unu aka, bụrụkwa ọta unu.+ 12  Jehova na-echeta anyị, ọ ga-agọzikwa anyị. Ọ ga-agọzi ezinụlọ Izrel.+ Ọ ga-agọzi ezinụlọ Erọn. 13  Ọ ga-agọzi ndị na-atụ egwu Jehova,Ma ndị ukwu ma ndị nta. 14  Jehova ga-eme ka unu dị ọtụtụ,Ma unu ma ụmụ unu.+ 15  Ka Jehova, Onye kere eluigwe na ụwa,Gọzie unu.+ 16  Ọ bụ Jehova nwe eluigwe,+Ma, o nyere ndị mmadụ ụwa.+ 17  Ndị nwụrụ anwụ anaghị eto Jaa.+ Onye ọ bụla nke na-agbada n’ili* anaghịkwa eto ya.+ 18  Ma anyị ga na-eto JaaMalite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Toonụ Jaa!*

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “E nweghị ihe ruuru anyị, Jehova, e nweghị ihe ruuru anyị.”
Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”
Na Hibru, “n’ebe a na-anọ duu.”
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.