Abụ Ọma 143:1-12
Abụ Devid.
143 Jehova, biko, nụrụ ekpere m.+
Ṅaa ntị n’arịrịọ m na-arịọ ka i nyere m aka.
Za m n’ihi na ị bụ onye ezi omume na onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.
2 Ekpela ohu gị ikpe,N’ihi na e nweghị onye dị ndụ ikpe na-agaghị ama n’ihu gị.+
3 N’ihi na onye iro na-achụ m ọsọ.
Ọ zọpịala m, zọba m n’ime ala.
O meela ka m biri n’ebe gbara ọchịchịrị ka ndị nwụrụ anwụ kemgbe.
4 Ike na-agwụ m.+
Obi adaala m mbà.+
5 Echetala m oge dị anya gara aga.
M na-atụgharị uche n’ọrụ gị niile.+
M ji obi m niile na-echebara ọrụ aka gị echiche.*
6 M gbasapụụrụ gị aka m na-ekpe ekpere.
M na-echere gị otú ala kpọrọ nkụ si eche ka mmiri zoo.+ (Sila)
7 Jehova, biko, za m ngwa ngwa.+
Ike agwụchaala m.+
Ezorola m ihu gị+Ka m ghara ịdị ka ndị na-agbada n’olulu.*+
8 Mee ka m nụ banyere ịhụnanya gị n’ụtụtụ,N’ihi na m tụkwasịrị gị obi.
Mee ka m mara ụzọ m kwesịrị ịna-eso,+N’ihi na ọ bụ gị ka m lekwasịrị anya.
9 Jehova, biko, napụta m n’aka ndị iro m.
M gbakwutere gị ka i chebe m.+
10 Kụziere m otú m ga-esi na-eme uche gị,+N’ihi na ị bụ Chineke m.
Mmụọ nsọ gị dị mma.
Ka ọ na-edu m n’ebe a na-enweghị ihe ọjọọ ga-eme m.*
11 Jehova, biko, dowe m ndụ n’ihi aha gị.
Napụta m* n’ahụhụ m na-ata n’ihi na ị bụ onye ezi omume.+
12 Bibie ndị iro m n’ihi ịhụnanya gị.*+
Bibie ndị niile na-achọ m okwu,+N’ihi na abụ m ohu gị.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “na-amụ banyere ọrụ aka gị.”
^ Ma ọ bụ “n’ili.”
^ Ma ọ bụ “na-edu m n’ala ezi omume.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “ịhụnanya gị pụrụ iche.”