Abụ Ọma 54:1-7

  • Ekpere ọbụ abụ kpere mgbe ọ nọ n’etiti ndị iro

    • “Chineke bụ onye na-enyere m aka” (4)

Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụbọ akwara kpọọ ya. Maskil.* Abụ Devid bụrụ mgbe ndị Zif bịara gwa Sọl, sị: “Devid zoro n’obodo anyị.”+ 54  Chineke, biko, jiri aha gị zọpụta m,+Jirikwa ike gị kpechite ọnụ m.+   Chineke, biko, nụrụ ekpere m.+ Gee ntị n’ihe m na-ekwu.   N’ihi na ndị m na-amaghị abịala ka ha mesie m ike,Ndị obi fere azụ na-achọkwa igbu m.*+ E nweghị ihe ha ji Chineke kpọrọ.*+ (Sila)   Ma Chineke bụ onye na-enyere m aka.+ Jehova nọnyeere ndị na-akwado m.*   Ọ ga-eji ihe ọjọọ ndị iro m na-eme kwụọ ha ụgwọ.+ Chineke m, bibie ha n’ihi na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.+   M ga-eji obi m niile chụọrọ gị àjà.+ Jehova, m ga-eto aha gị n’ihi na ọ dị mma.+   N’ihi na ị na-anapụta m ná nsogbu niile.+ M ga na-ele ndị iro m anya na-achị ha ọchị mgbe a na-emeri ha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “na-achọ mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “Ha anaghị eme ka Chineke nọrọ n’ihu ha.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”