Abụ Ọma 141:1-10
Abụ Devid.
141 Jehova, m na-akpọku gị.+
Biko, bịa ngwa ngwa nyere m aka.+
Gee ntị mgbe m na-akpọ gị.+
2 Ka ekpere m masị gị ka insens*+ a kwadebere nke ọma,+Ka aka m gbasara na-ekpe ekpere dịrị ka àjà ọka a na-achụ ná mgbede.+
3 Jehova, biko, nyere m aka ka m chee ọnụ m nche.
Nyere m aka ka m chee egbugbere ọnụ m nche.+
4 Ekwela ka obi m dịrị n’ihe ọjọọ ọ bụla,+Ka m ghara iso ndị ajọ omume mewe ihe ọjọọ.
E nweghị ihe ga-eme ka m soro ha rie nri ha a kwọrọ aka sie.
5 Ọ bụrụ na onye ezi omume etie m ihe, ọ pụtara na ọ hụrụ m n’anya.*+
Ọ bụrụ na ọ baara m mba, ọ ga-adị ka ebe a wụsara m mmanụ n’isi.+
A gaghị m ajụ ya.+
M ka ga na-ekpere ya ekpere mgbe ọdachi dakwasịrị ya.
6 Ọ bụrụgodị na e si n’elu ugwu na-atụda ndị ikpe,Ndị mmadụ ga-ege ntị n’ihe m na-ekwu n’ihi na ihe m na-ekwu dị mma.
7 A tụsasịala ọkpụkpụ anyị n’ọnụ ili*Otú onye na-egwu ala si atụsasị ihe ndị ọ na-egwupụta n’ala aghara aghara.
8 Ma Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, anya m dị n’ebe ị nọ.+
Agbabala m n’ime gị.
Ekwela ka m nwụọ.*
9 Chebe m ka m ghara ịdaba n’ọnyà ndị ajọ omume siiri m,Ka m ghara ịdaba n’ọnyà ha.
10 Ụgbụ ndị ajọ omume ji sie ọnyà ga-ejide ha niile,+Ma m ga-agafere n’enweghị ihe ga-eme m.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
^ Ma ọ bụ “na o gosiri m ịhụnanya pụrụ iche.”
^ Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Ma ọ bụ “Anapụla m ndụ m.”

