Abụ Ọma 141:1-10

  • Ekpere ọbụ abụ kpere ka e chebe ya

    • “Ka ekpere m masị gị ka insens” (2)

    • Mba onye ezi omume baara m ga-adị ka mmanụ (5)

    • Ụgbụ ndị ajọ omume ji sie ọnyà ga-ejide ha (10)

Abụ Devid. 141  Jehova, m na-akpọku gị.+ Biko, bịa ngwa ngwa nyere m aka.+ Gee ntị mgbe m na-akpọ gị.+  2  Ka ekpere m masị gị ka insens*+ a kwadebere nke ọma,+Ka aka m gbasara na-ekpe ekpere dịrị ka àjà ọka a na-achụ ná mgbede.+  3  Jehova, biko, nyere m aka ka m chee ọnụ m nche. Nyere m aka ka m chee egbugbere ọnụ m nche.+  4  Ekwela ka obi m dịrị n’ihe ọjọọ ọ bụla,+Ka m ghara iso ndị ajọ omume mewe ihe ọjọọ. E nweghị ihe ga-eme ka m soro ha rie nri ha a kwọrọ aka sie.  5  Ọ bụrụ na onye ezi omume etie m ihe, ọ pụtara na ọ hụrụ m n’anya.*+ Ọ bụrụ na ọ baara m mba, ọ ga-adị ka ebe a wụsara m mmanụ n’isi.+ A gaghị m ajụ ya.+ M ka ga na-ekpere ya ekpere mgbe ọdachi dakwasịrị ya.  6  Ọ bụrụgodị na e si n’elu ugwu na-atụda ndị ikpe,Ndị mmadụ ga-ege ntị n’ihe m na-ekwu n’ihi na ihe m na-ekwu dị mma.  7  A tụsasịala ọkpụkpụ anyị n’ọnụ ili*Otú onye na-egwu ala si atụsasị ihe ndị ọ na-egwupụta n’ala aghara aghara.  8  Ma Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, anya m dị n’ebe ị nọ.+ Agbabala m n’ime gị. Ekwela ka m nwụọ.*  9  Chebe m ka m ghara ịdaba n’ọnyà ndị ajọ omume siiri m,Ka m ghara ịdaba n’ọnyà ha. 10  Ụgbụ ndị ajọ omume ji sie ọnyà ga-ejide ha niile,+Ma m ga-agafere n’enweghị ihe ga-eme m.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ.”
Ma ọ bụ “na o gosiri m ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “Anapụla m ndụ m.”