Abụ Ọma 22:1-31

  • A napụtara ya, ya etoo Chineke

    • “Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?” (1)

    • ‘Ha feere uwe m nza’ (18)

    • A ga-eto Chineke n’ime ọgbakọ (22, 25)

    • Ndị niile bi n’ụwa ga-efe Chineke (27)

Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Nne Ele Isi Ụtụtụ”* kpọọ ya. Abụ Devid. 22  Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?+ Gịnị mere na ị bịaghị ka ị zọpụta m? Gịnị mere na ị naghị anụ ákwá arịrị m na-ebe?+   Chineke m, m na-akpọ gị n’ehihie, ma ị naghị aza.+ M na-akpọkwa gị n’abalị, anaghị m emechi ọnụ.   Ma ị dị nsọ.+ Izrel ji abụ otuto gbaa gị gburugburu.   Ọ bụ gị ka nna anyị hà tụkwasịrị obi.+ Ha tụkwasịrị gị obi, ị nọkwa na-anapụta ha.+   Ọ bụ gị ka ha kpọrọ ka i nyere ha aka, e wee zọpụta ha. Ha tụkwasịrị gị obi, i mechughịkwa ha ihu.*+   Ma ndị mmadụ ji m eme ihe ọchị, ha kpọkwara m asị,Ka à ga-asị na m bụ idide, na abụghị m mmadụ.+   Ndị niile na-ahụ m na-eji m eme ihe ọchị.+ Ha na-akwa m emo, na-efufekwa isi, na-asị:+   “Ọ tụkwasịrị Jehova obi. Ya napụta ya. Ya zọpụta ya, ebe ọ bụ na ọ hụrụ ya n’anya nke ukwuu.”+   Ọ bụ gị bụ Onye si n’afọ nne m kupụta m,+Onye mere ka obi ruo m ala mgbe m na-aṅụ ara nne m. 10  Malite mgbe a mụrụ m, e nyefere m n’aka gị ka i lekọtawa m. Ị bụ Chineke m malite mgbe m nọ n’afọ nne m. 11  Anọla m n’ebe dị anya n’ihi na nsogbu gbara m gburugburu,+Enweghịkwa m onye ọzọ ga-enyere m aka.+ 12  Ọtụtụ ndị iro gbara m gburugburu.+ Ha dị ka oké ehi siri ike ndị si Beshan.+ 13  Ha na-emeghe ọnụ ha na-eyi m egwu+Ka ọdụm na-agbọ ụja, nke na-adọrikwa anụ o jidere.+ 14  Ike agwụla m. Adịzi m ka mmiri a kwafuru akwafu. Ọkpụkpụ m niile ekwokapụla. Obi m dịzi ka mgbá aṅụ na-agbaze agbaze.*+ Obi na-awụnye m n’afọ.+ 15  Ike adịkwaghị m. Adịzi m ka mpekere ite ụrọ kpọrọ nkụ.+ Ire m na-arapara n’ágbụ̀ m.+ Ị na-ewetu m n’ájá ka m nwụọ.+ 16  Ndị iro gbara m gburugburu ka nkịta.+ Ha na-agba m gburugburu ka ìgwè ndị na-eme ihe ọjọọ.+ Ha na-ata m arụ n’aka nakwa n’ụkwụ ka ọdụm.+ 17  A na-ahụzi ọkpụkpụ m niile anya.*+ Ndị iro m na-ele m anya. Ha kporopụrụ anya na-ele m. 18  Ha kere uwe m,Ha fekwaara uwe m nza.+ 19  Ma Jehova, biko, anọzila m n’ebe dị anya.+ Ọ bụ gị bụ ike m. Bịa ngwa ngwa nyere m aka.+ 20  Zọpụta m* ka a ghara iji mma agha gbuo m. Zọpụta ndụ m* ka nkịta ghara ịdọri m.+ 21  Zọpụta m n’ọnụ ọdụm,+ zọpụtakwa m ka atụ́ ghara iji mpi ya sọgbuo m. Za m ma zọpụta m. 22  M ga-akọsara ụmụnna m aha gị.+ M ga-eto gị n’ime ọgbakọ.+ 23  Unu ndị na-atụ egwu Jehova, toonụ ya. Unu niile bụ́ ụmụ* Jekọb, jaanụ ya mma.+ Tụọnụ egwu ya, unu niile bụ́ ụmụ* Izrel. 24  N’ihi na o legharaghị ahụhụ onye a na-emegbu emegbu na-ata anya.+ O zoroghị ya ihu ya.+ Mgbe o besaara ya ákwá ka o nyere ya aka, ọ nụrụ ya.+ 25  M ga-anọ n’ọgbakọ buru ibu too gị.+ M ga-emezu nkwa m n’ihu ndị na-atụ egwu gị. 26  Ndị dị umeala n’obi ga-eri ihe rijuo afọ.+ Ndị na-achọ Jehova ga-eto ya.+ Na-enwenụ obi ụtọ* ruo mgbe ebighị ebi. 27  Ndị niile bi n’ebe niile n’ụwa ga-echeta Jehova ma laghachikwuru ya. Ezinụlọ niile si ná mba dị iche iche ga-akpọ isiala n’ihu gị.+ 28  N’ihi na ọ bụ Jehova bụ Eze.+ Ọ na-achị mba niile. 29  Ndị niile bara ọgaranya* n’ụwa ga-eri ihe ma kpọọ isiala. Ndị niile na-alaghachi n’ájá ga-egbu ikpere n’ala n’ihu ya. E nweghị onye n’ime ha ga-echebeli onwe ya.* 30  Ụmụ ha* ga-ejere ya ozi. A ga-akọrọ ọgbọ na-abịa abịa banyere Jehova. 31  Ha ga-abịa kọọ banyere ezi omume ya. Ha ga-akọrọ ndị a ka ga-amụ amụ ihe ndị o mere.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ihe a nwere ike ịbụ aha ụda egwú ma ọ bụ aha otú e si akpọ egwú.
Ma ọ bụ “i menyeghịkwa ha ihere.”
Mgbá aṅụ bụ ihe aṅụ na-anyụpụta nke na-adị n’ụgbụgbọ mmanụ aṅụ. Ihe a na-agbaze ngwa ngwa.
Na Hibru, “M ga-agụli ọkpụkpụ m niile ọnụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “Ka obi unu dị ndụ.”
Na Hibru, “buru ibu.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Na Hibru, “Mkpụrụ.”