AJỤJỤ NKE 5
Ajụjụ nke 5: Gịnị ka Baịbụl na-ekwu?
“M ga-eme ka gị na nwaanyị ahụ dịrị n’iro, meekwa ka nwa gị na nwa ya dịrị n’iro. Nwa ya ga-egwepịa gị isi, ị ga-emerụkwa ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ.”
“M ga-esi n’aka nwa gị gọzie mba niile dị n’ụwa n’ihi na i gere m ntị.”
“Ka Alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”
“Chineke, onye na-eme ka anyị nwee udo, ga-azọpịa Setan n’okpuru ụkwụ unu n’oge na-adịghị anya.”
“Mgbe Chineke dowechara ihe niile n’okpuru Ọkpara ya, Ọkpara ya ga-edowekwa onwe ya n’okpuru Chineke, onye dowere ihe niile n’okpuru ya. Naanị Chineke ga na-achịzi ihe niile.”
“Ọ bụ Ebreham na nwa ya ka e kwere nkwa ndị ahụ . . . , ya bụ, . . . Kraịst. Ọ bụrụkwa na unu bụ nke Kraịst, unu bụ ụmụ Ebreham n’eziokwu.”
“Alaeze ụwa aghọọla Alaeze nke Chineke na nke Kraịst ya. Chineke ga na-achịkwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”
“A chụdataziri nnukwu dragọn ahụ n’ụwa. Ọ bụ ya bụ agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa niile. A chụdatara ya na ndị mmụọ ozi ya.”
“O jidekwara dragọn ahụ, bụ́ agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, kee ya agbụ otu puku (1,000) afọ.”