Abụ Ọma 23:1-6
Abụ Devid.
23 Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ.+
E nweghị ihe ga-akọ m.+
2 Ọ na-eme ka m makpuru n’ebe ahịhịa ndụ juru.
Ọ na-eduga m n’ebe a na-ezu ike nke dị n’akụkụ mmiri.*+
3 Ọ na-eme ka m* nweta ume.+
Ọ na-edu m aga n’ụzọ ziri ezi n’ihi aha ya.+
4 Ọ bụrụgodị na mụ ejee ije na ndagwurugwu gbara oké ọchịchịrị,+Agaghị m atụ egwu na ihe ọ bụla ga-eme m,+N’ihi na ị nọnyeere m.+
Mkpara gị na mkpanaka gị na-eme ka obi sie m ike.*
5 Ị na-edosara m nri na tebụl n’ihu ndị iro m.+
Ị na-ete isi m mmanụ.*+
Iko m juru n’ọnụ.+
6 N’eziokwu, ị ga na-egosi m na ị dị mma nakwa na ị hụrụ m n’anya ná ndụ m niile,+M ga-ebikwa n’ụlọ Jehova ná ndụ m niile.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ O nwere ike ịbụ, “Ọ na-eduga m ná mmiri dị jụụ.”
^ Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
^ Ma ọ bụ “na-akasi m obi.”
^ Ma ọ bụ “Ị na-ete m mmanụ n’isi, ahụ́ eruo m ala.”