Abụ Ọma 45:1-17
Ntụziaka e nyere onye na-eduzi abụ. A ga-eji ụda a na-akpọ “Okooko Lili” kpọọ ya. Abụ ụmụ Kora.+ Maskil.* Abụ ịhụnanya.
45 Ozi ọma emeela ka obi dị m ụtọ.
Ana m asị: “M na-abụ abụ gbasara eze.”+
Ka ọnụ* m dịrị ka mkpịsị odeakwụkwọ.*+
2 Ọ bụ gị kacha ụmụ nwoke niile maa mma.
Okwu dị mma na-esi n’ọnụ gị apụta.+
Ọ bụ ya mere Chineke ji gọzie gị ruo mgbe ebighị ebi.+
3 Gị dike,+ kee mma agha gị n’úkwù.+
Yiri ebube gị na ịma mma gị ka uwe.+
4 Gosi otú i si dị ebube, gaakwa meriwe.+
Gbaa ịnyịnya n’ihi eziokwu na ịdị umeala n’obi na ezi omume,+Ị ga-ejikwa ike gị mee* ihe ndị dị egwu.
5 Akụ́ gị dị nkọ. Ọ na-eme ka ndị dị iche iche na-ada n’ihu gị.+
Ọ na-agbapu obi ndị iro eze.+
6 Ọ bụ Chineke nyere gị ikike ịchị* ruo mgbe niile ebighị ebi.+
Mkpanaka alaeze gị bụ mkpanaka ezi omume.*+
7 Ị hụrụ ezi omume n’anya,+ ị kpọkwara ajọ omume asị.+
Ọ bụ ya mere Chineke, bụ́ Chineke gị, ji tee gị mmanụ+ ma mee ka ị na-aṅụrị ọṅụ+ karịa ndị ibe gị.
8 E ji mea na alo na kashịa mee ka uwe gị niile na-esi ísì ọma.
Ụda ụbọ akwara a na-akpọ ná nnukwu obí eze e ji ọdụ́ chọọ mma na-eme ka ị ṅụrịa ọṅụ.
9 Ndị ada eze so n’ụmụ agbọghọ ndị ị kwanyeere ùgwù.
Nwunye eze akwụrụla n’aka nri gị, e jikwa ọlaedo kacha mma* chọọ ya mma.+
10 Ada, biko, gee ntị, tọọkwa ntị n’ala nụrụ.
Chefuo ndị gị na ụlọ nna gị.
11 Mma ị mara ga-eme ka agụụ gị na-agụ ezeMaka na ọ bụ onyenwe gị,N’ihi ya, gbuoro ya ikpere n’ala.
12 Taya* ga-eji onyinye bịa.
Ndị kacha baa ọgaranya ga-achọ ka gị na ha dị ná mma.*
13 Ada eze bụ sọ mma n’obí eze.*
E ji ọlaedo chọọ uwe ya mma.
14 Ọ ga-eyi uwe a kpara nke ọma mgbe a ga-akpọrọ ya bịakwute eze.
A na-akpọbatara gị ụmụ agbọghọ ndị na-eso ya, bụ́ ndị na-amaghị nwoke.
15 A ga-eji obi ụtọ na ọṅụ kpọbata ha.
Ha ga-abata n’obí eze.
16 Ụmụ gị ndị nwoke ga-anọchi nna nna gị hà.
Ị ga-eme ha ndị isi n’ụwa niile.+
17 M ga-eme ka a mara aha gị n’ọgbọ niile na-abịa abịa.+
Ọ bụ ya mere ndị dị iche iche ga-eji na-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi.
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Gụọ Nkọwa Okwu.
^ Na Hibru, “ire.”
^ Ma ọ bụ “onye na-edepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ.”
^ Na Hibru, “Aka nri gị ga-akụzikwara gị.”
^ Na Hibru, “Chineke bụ ocheeze gị.”
^ Ma ọ bụ “ikpe ziri ezi.”
^ Ma ọ bụ “ọlaedo Ofa.”
^ Na Hibru, “Ada bụ́ Taya.”
^ Ma ọ bụ “ga-eme ka obi gị jụrụ.”
^ Na Hibru, “n’ime.”