Abụ Ọma 112:1-10
112 Toonụ Jaa!*+
א [Alef]
Onye na-atụ egwu Jehova na-enwe obi ụtọ,+ב [Bet]Ya bụ, onye iwu ya na-amasị nke ukwuu.+
ג [Gimel]
2 Ụmụ ya ga-abụ ndị ukwu n’ụwa,ד [Dalet]A ga-agọzikwa ìgwè* ndị na-eme ezi omume.+
ה [Hee]
3 Akụnụba juru n’ụlọ ya.
ו [Wọọ]Ọ ga na-eme ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.
ז [Zayin]
4 Ọ na-enwuru ndị obi ha dị ọcha ka ìhè nke na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị.+
ח [Het]
O nwere ọmịiko,* na-eme ebere,+ bụrụkwa onye ezi omume.
ט [Tet]
5 Ihe na-agaziri onye na-eji obi ya niile agbazinye ndị mmadụ ihe.+
י [Yod]
Ọ na-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile ọ na-eme.
כ [Kaf]
6 A gaghị eme ka ọ laa n’iyi.*+
ל [Lamed]
A ga na-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.+
מ [Mem]
7 Ọ gaghị atụ egwu akụkọ ọjọọ.+
נ [Nun]
Obi siri ya ike. Ọ tụkwasịrị Jehova obi.+
ס [Samek]
8 Obi anaghị amapụ ya. Ụjọ anaghị atụ ya.+
ע [Ayin]N’ikpeazụ, ọ ga na-ele ndị iro ya anya na-achị ha ọchị mgbe a na-emeri ha.+
פ [Pee]
9 O kesaarala mmadụ niile ihe. O nyela ndị ogbenye ihe.+
צ [Sadee]
Ọ ga na-eme ezi omume ruo mgbe ebighị ebi.+
ק [Kof]
A ga-eme ka o sikwuo ike, meekwa ka ọ dị ebube.
ר [Resh]
10 Onye ajọ omume ga-ahụ ya wee iwe.
ש [Shin]
Ọ ga-ata ikikere ezé wee laa n’iyi.
ת [Tọọ]
Ndị ajọ omume agaghị enweta ihe na-agụ ha.+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
^ Ma ọ bụ “ọgbọ.”
^ Ma ọ bụ “na-eme amara.”
^ Ma ọ bụ “A gaghị eme ka ọ maa jijiji.”