Abụ Ọma 123:1-4
Abụ Mgbago.
123 Gị onye nọ n’ocheeze n’eluigwe,Ọ bụ gị ka m na-ele anya.+
2 Otú ahụ ndị na-eje ozi si ele nna ha ukwu anya n’aka,Nwaanyị na-eje ozi ana-elekwa nne ya ukwu anya n’aka,Otú ahụ ka anya anyị dị n’ebe Jehova Chineke anyị nọ+Ruo mgbe ọ ga-emere anyị amara.+
3 Meere anyị amara, Jehova. Biko, meere anyị amara,N’ihi na a kparịala anyị nke ukwuu.+
4 Ndị onwe ha juru afọ na-akwa anyị emo mgbe niile,Ndị mpako na-akparịkwa anyị.