Abụ Ọma 99:1-9
99 Jehova abụrụla Eze.+ Ka ndị dị iche iche maa jijiji.
Ọ nọ n’ocheeze dị n’elu* ndị cherob.+ Ka ụwa maa jijiji.
2 Jehova bụ onye ukwu na Zayọn,Ọ kakwa ndị niile elu.+
3 Ka ha too aha gị dị ebube+N’ihi na e kwesịrị ịna-atụ egwu aha gị, aha gị dịkwa nsọ.
4 Chineke bụ nnukwu eze nke ikpe ziri ezi na-amasị.+
I meela ka a mata ihe bụ́ ihe ziri ezi.
I meela ka a na-ekpe ikpe ziri ezi ma na-eme ezi omume+ na Jekọb.
5 Toonụ Jehova Chineke+ anyị, kpọọkwanụ isiala n’ihu ya.*+
Ọ dị nsọ.+
6 Mosis na Erọn so ná ndị nchụàjà ya,+Samuel sokwa ná ndị na-akpọku aha ya.+
Ha kpọkuru Jehova,Ọ zakwara ha.+
7 O si n’ogidi ígwé ojii gwa ha okwu.+
Ha echefughị ihe ndị o chetaara ha, ha debekwara iwu ndị o nyere ha.+
8 Jehova Chineke anyị, ị zara ha.+
Ị gbaghaara ha mmehie ha,+Ma ị tara ha ahụhụ* maka mmehie ha.+
9 Toonụ Jehova Chineke anyị,+Kpọọkwanụ isiala* n’ugwu nsọ ya,+N’ihi na Jehova Chineke anyị dị nsọ.+

