BAỊBỤL NSỌ NKE NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ (NKE E DEGHARỊRỊ N'AFỌ 2013)

Ihe Ndị Mere n’Oge Jizọs Nọ n’Ụwa—Ihe Ndị Mere Tupu Jizọs Amalite Ozi Ya

Igbo
Ihe Ndị Mere n’Oge Jizọs Nọ n’Ụwa—Ihe Ndị Mere Tupu Jizọs Amalite Ozi Ya
https://cms-imgp.jw-cdn.org/img/p/1001061100/univ/wpub/1001061100_univ_sqr_xl.jpg
nwt p. 1940-1941

A7-A

Ihe Ndị Mere n’Oge Jizọs Nọ n’Ụwa—Ihe Ndị Mere Tupu Jizọs Amalite Ozi Ya

Otú Ihe Ndị Dị na Matiu, Mak, Luk, na Jọn Si Mee n’Usoro

E nwere map ndị ha na chaatị ndị a so. Map ndị ahụ gosiri ebe dị iche iche Jizọs gara nakwa ebe ndị o kwusara ozi ọma. Ihe ndị yiri akụ́ e sere na map ndị ahụ anaghị egosi kpọmkwem ụzọ Jizọs si gaa n’ebe ndị ahụ, kama e ji ha egosi ụzọ e nwere ike isi gaa na ha. “dk.” pụtara “n’ihe dị ka.”

Ihe Ndị Mere Tupu Jizọs Amalite Ozi Ya

AFỌ

EBE IHE MERE

IHE MERENỤ

MATIU

MAK

LUK

JỌN

3 T.O.N.K.

Jeruselem, n’ụlọ nsọ

Mmụọ ozi Gebriel buru amụma na Zekaraya ga-amụ Jọn

   

1:5-25

 

dk. 2 T.O.N.K.

Nazaret; Judia

Mmụọ ozi Gebriel buru amụma na Meri ga-amụ Jizọs; Meri gara hụ Elizabet onye ikwu ya

   

1:26-56

 

2 T.O.N.K.

Obodo Judia bụ́ ugwu ugwu

A mụrụ Jọn Onye Na-eme Baptizim gụọ ya aha; Zekaraya buru amụma; Jọn ga-anọ n’ọzara

   

1:57-80

 

2 T.O.N.K., dk. Ọkt. 1

Betlehem

A mụrụ Jizọs; “Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ́”

1:1-25

 

2:1-7

1:14

Ebe dị Betlehem nso; Betlehem

Mmụọ ozi ziri ndị na-azụ atụrụ ozi ọma; ndị mmụọ ozi toro Chineke; ndị na-azụ atụrụ gara hụ nwa ọhụrụ

   

2:8-20

 

Betlehem; Jeruselem

E biri Jizọs úgwù (n’ụbọchị nke 8); ndị mụrụ ya ku ya gaa n’ụlọ nsọ (mgbe ụbọchị 40 gachara)

   

2:21-38

 

1 T.O.N.K. ma ọ bụ 1 O.N.K.

Jeruselem; Betlehem; Ijipt; Nazaret

Ndị ji kpakpando akọ ọdịnihu bịara; ezinụlọ Josef gbagara Ijipt; Herọd gburu ụmụaka ndị nwoke; ha si n’Ijipt pụta biri na Nazaret 2:1-23

2:1-23

 

2:39, 40

 

12, Ememme Ngabiga

Jeruselem

Mgbe Jizọs dị afọ 12, ọ nọ n’ụlọ nsọ na-ajụ ndị nkụzi ajụjụ

   

2:41-50

 
 

Nazaret

Ọ laghachiri Nazaret; doo onwe ya n’okpuru ndị mụrụ ya; ọ mụrụ ọrụ ịkwa nkà; Meri mụrụ ụmụ nwoke 4 ọzọ na ụmụ nwaanyị (Mt 13:55, 56; Mk 6:3)

   

2:51, 52

 

29, dk. Eprel

Ala ịkpa, Osimiri Jọdan

Jọn Onye Na-eme Baptizim bidoro ozi ya

3:1-12

1:1-8

3:1-18

1:6-8