Abụ Ọma 11:1-7

  • Iji Jehova mere ebe mgbaba

    • “Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya” (4)

    • Chineke kpọrọ onye tigbuo zọgbuo na-amasị asị (5)

Maka onye na-eduzi abụ. Abụ Devid. 11  Ọ bụ Jehova ka m ji mere ebe mgbaba.+ Oleezi ihe mere unu ji asị m:* “Fere ka nnụnụ gaa n’ugwu?   Legodị otú ndị ajọ omume si na-ekwe ụta. Ha na-etinye akụ́ ha n’eriri ụta haKa ha nọrọ n’ọchịchịrị gbaa ya ndị obi ha dị ọcha.   Gịnị ka ndị ezi omume ga-emeMgbe a na-anaghịzi ekpe ikpe ziri ezi, mgbe a na-enweghịzi ihe e ji iwu kpọrọ?”*   Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya.+ Ocheeze Jehova dị n’eluigwe.+ Anya ya na-ahụ ihe niile. Anya ya nke na-ahụ ụzọ nke ọma* na-eleru ndị mmadụ anya.+   Jehova na-eleru ma onye ezi omume ma onye ajọ omume anya.+ * kpọrọ onye ọ bụla tigbuo zọgbuo na-amasị asị.+   Ọ ga-esiri ndị ajọ omume ọnyà aghara aghara.* Ọ ga-eji ọkụ na sọlfọ+ na ifufe na-ekpo ọkụ bibie ha.   N’ihi na Jehova bụ onye ezi omume;+ ezi omume na-amasị ya.+ Ndị ezi omume ga-ahụ ihu ya.*+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m.”
Na Hibru, “Mgbe a kwaturu ntọala.”
Ma ọ bụ “nke na-enwu gbaa.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ya.”
O nwere ike ịbụ, “Ọ ga-awụ ndị ajọ omume icheku ọkụ.”
Ma ọ bụ “Ọ ga-emere ndị ezi omume amara.”