Nkọwa Okwu Ndị Dị na Baịbụl
A B D E F G H I Ị J K KP L M N NW O Ọ P R S SH T U Ụ V Y Z
A
-
Ab.
Ọ bụ aha a na-akpọ ọnwa nke ise na kalenda dị nsọ nke ndị Juu. Ọ bụkwa ọnwa nke iri na otu na kalenda nkịtị (kalenda ọrụ ubi) nke ndị Juu. A malitere ịkpọ ya Ab mgbe ndị Juu si Babịlọn lọta. Ọnwa a na-amalite n’etiti ọnwa Julaị ruo n’etiti ọnwa Ọgọst. A kpọghị ya Ab na Baịbụl. Naanị ihe a kpọrọ ya bụ “ọnwa nke ise.” (Ọg 33:38; Ezr 7:9)—Gụọ B15.
-
Abis.
O si n’okwu Grik bụ́ aʹbys·sos. Okwu Grik a pụtara “ihe dị ezigbo omimi” ma ọ bụ “ihe na-enweghị nsọtụ, ihe na-enweghị ngwụcha.” N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, abis pụtara ịtụ ihe mkpọrọ ma ọ bụ ebe a tụrụ ihe mkpọrọ. Ili so n’ihe a kpọrọ abis, ma e nwekwara ihe ndị ọzọ a kpọrọ abis.—Lu 8:31; Ro 10:7; Mkp 20:3.
-
Abụ iru uju.
-
Abụ Mgbago.
Ọ bụ ihe e dere n’okwu mmeghe Abụ Ọma nke 120 ruo na nke 134. Ọ bụ eziokwu na e nwere ihe dị iche iche ndị mmadụ chere okwu a pụtara, ọtụtụ ndị kweere na ọ bụ ndị Izrel na-efe Chineke na-eji ọṅụ abụ abụ ọma iri na ise a ka ha ‘na-agbago’ Jeruselem. Obodo a dị n’ugwu dị na Juda. Ha na-aga ebe ahụ ka ha mee nnukwu ememme atọ a na-eme kwa afọ.
-
Abụ Ọma.
Ọ bụ abụ e ji eto Chineke. A na-edepụta ihe ndị dị n’abụ ọma, ndị mmadụ ana-abụ ha n’oge dị iche iche, ma mgbe ha gbakọrọ ife Jehova Chineke n’ụlọ nsọ ya dị na Jeruselem.—Lu 20:42; Ọrụ 13:33; Jes 5:13.
-
Achịcha a na-enye Chineke.
-
Adịghị ọcha.
-
Afọ Nnwere Onwe (Jubili).
Ọ bụ afọ nke iri ise ọ bụla, malite mgbe ndị Izrel banyechara n’Ala Nkwa. A na-akpọkwa ya afọ Jubili. N’afọ ahụ, a naghị akọ ihe ọ bụla, a na-ahapụkwa ndị Hibru na-agba ohu ka ha nwere onwe ha. Ọ bụrụ na e rere ala e ketara eketa, a na-enwetaghachi ya n’afọ ahụ. Afọ Nnwere Onwe bụ afọ e ji eme naanị ememme. Ọ bụ n’afọ a ka ihe na-adịghachiri ndị Izrel otú ihe dịịrị ha mgbe Chineke mere ka ha bụrụ mba.—Le 25:10.
-
Ahịhịa amị.
Ọ bụ ihe a na-akpọ ụdị ahịhịa dị iche iche na-eto ebe dị mmiri mmiri. Ma, ahịhịa a na-ebukarị n’obi ma e kwuwe gbasara ahịhịa amị bụ nke a na-akpọ Arundo donax. (Job 8:11; Aịz 42:3; Mt 27:29; Mkp 11:1)—Gụọ OKPORO AHỊHỊA AMỊ E JI ATỤ̀ IHE.
-
Ahịhịa ilu.
Ọ bụ ahịhịa dị iche iche na-elu ezigbo ilu, na-esikwa nnọọ ísì ọma. Baịbụl ji otú ahịhịa ilu si elu ilu tụnyere nsogbu omume rụrụ arụ, ịgba ohu, ikpe na-ezighị ezi, na mmadụ ịkwụsị ife Chineke na-akpata. “Ahịhịa ilu” e kwuru gbasara ya ná Mkpughe 8:11 pụtara ihe na-elu ilu na ihe na-egbu mmadụ.—Di 29:18; Ilu 5:4; Jer 9:15; Em 5:7.
-
Àjà a na-efegharị efegharị.
Ọ bụ àjà ọ na-abụ a chọwa ịchụ, onye wetara ya eburu ya n’aka, onye nchụàjà etinye aka ya n’okpuru aka onye ahụ ma na-efegharị àjà ahụ. Onye nchụàjà nwekwara ike iburu àjà ahụ naanị ya ma na-efegharị ya. Nfegharị a na-efegharị àjà a bụ otú e si eche ya n’ihu Jehova.—Le 7:30.
-
Àjà a na-esu ọkụ.
-
Àjà ekele.
Ọ bụ àjà udo mmadụ na-achụ iji too Chineke maka ihe ndị o nyere ya nakwa maka otú Chineke si hụ ya n’anya. A na-eri anụ e ji chụọ àjà a, taakwa achịcha koro eko na nke na-ekoghị eko. Ọ bụ ụbọchị a chụrụ àjà a ka a na-erikwa anụ ahụ.—2Ih 29:31.
-
Àjà ikpe ọmụma.
Ọ bụ àjà mmadụ na-achụ maka mmehie ndị o mere. Ọ dịtụ iche n’àjà ndị ọzọ a na-achụ maka mmehie n’ihi na ihe mere e ji achụ ya bụ ka onye ahụ mehiere ma chegharịa nwee ike imewekwa ihe ụfọdụ a kwụsịburu ya ime n’ihi mmehie ya, nakwa ka a ghara ịta ya ahụhụ a gaara ata ya.—Le 7:37; 19:22; Aịz 53:10.
-
Àjà mmanya.
-
Àjà mmehie.
Ọ bụ àjà a na-achụ maka mmehie mmadụ na-akpachaghị anya mee, nke onye ahụ mere n’ihi na o zughị okè. A na-eji anụmanụ dị iche iche ma ọ bụ nnụnụ achụ àjà a. O nwere ike ịbụ oké ehi ma ọ bụkwanụ kpalakwukwu. Ọ bụ onye mmadụ bụ ma ọ bụ otú ihe si dịrị ya ka e ji ekpebi ihe onye ahụ ga-eji chụọ àjà maka mmehie ya.—Le 4:27, 29; Hib 10:8.
-
Àjà udo.
Ọ bụ àjà mmadụ na-achụrụ Jehova iji rịọ ya ka ya na ya dịrị n’udo. Onye wetara àjà ahụ, ndị ezinụlọ ya, onye nchụàjà chụrụ àjà ahụ, na ndị nchụàjà ndị bịara ọrụ n’ụbọchị ahụ ga-eri anụ ahụ e ji chụọ àjà. Jehova na-anabata àjà ahụ mgbe ọ nụrụ ísì ọma abụba anụ ahụ e suru ọkụ na-esi. A na-enyekwa Jehova ọbara anụ ahụ maka na ọ nọchiri anya ndụ anụ ahụ. Ọ dị ka à ga-asị na Jehova na ndị nchụàjà na onye wetara àjà ahụ nọ ọdụ na-erikọ nri ọnụ. Ihe a na-egosi na ha na Jehova dịzi n’udo.—Le 7:29, 32; Di 27:7.
-
Ajọ onye ahụ.
-
Akeya.
-
Akpa a na-anya n’obi.
Ọ bụ akpa nnukwu onye nchụàjà n’Izrel na-anya n’obi ya mgbe ọ bụla ọ na-abanye n’Ebe Nsọ. A kwụnyere nkume ndị dị oké ọnụ n’akpa a. A kpọrọ ya “akpa a na-anya n’obi nke e ji ekpe ikpe” maka na Yurim na Tọmịm na-adị n’ime ya. E ji Yurim na Tọmịm amata ihe Jehova kpebiri. (Ọp 28:15-30)—Gụọ B5.
-
Akpụkpọ anụ e dere ihe na ya.
Ọ bụ akpụkpọ atụrụ, akpụkpọ ewu, ma ọ bụ akpụkpọ nwa ehi e mere otú e nwere ike ịna-ede ihe na ya. Ọ na-adịte aka karịa papaịrọs. E jikwa ya mee akwụkwọ mpịakọta e ji dee Baịbụl. Akpụkpọ anụ ndị ahụ e dere ihe na ha, nke Pọl ziri Timoti ka o wetara ya, nwere ike ịbụ ndị nke e dere ihe ụfọdụ dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ụfọdụ akwụkwọ mpịakọta ndị a chọtara n’akụkụ Oké Osimiri Nnu bụ akpụkpọ anụ.—2Ti 4:13.
-
Ákwà iru uju.
-
Ákwà isi.
Ọ bụ ákwà a na-eke n’isi. Nnukwu onye nchụàjà na-eke ákwà isi e ji ezigbo ákwà linin mee n’isi. A na-ejikwa eriri na-acha anụnụ anụnụ ekegide ihe dị mbadamba e ji ọlaedo mee n’ihu ya. Ndị eze na-eke ákwà isi n’isi, kpukwasịkwa ya okpueze ha. Job ji otú o si ekpe ikpe ziri ezi tụnyere ákwà isi.—Ọp 28:36, 37; Job 29:14; Ezi 21:26.
-
Ákwà mgbochi.
-
Akwụkwọ mpịakọta.
Ọ bụ akwụkwọ na-adị ogologo e ji ede ihe. A na-eji akpụkpọ anụ ma ọ bụ papaịrọs arụ ya. Ọ bụ n’ihu ya ka a na-ede ihe, ọ na-enwekwa osisi na-adị na ya a na-eji apịakọta ya. E ji ya dee Akwụkwọ Nsọ, jirikwa ya depụtaghachi ya. Ọ bụ ya bụ akwụkwọ e ji ede ihe n’oge a na-ede Baịbụl.—Jer 36:4, 18, 23; Lu 4:17-20; 2Ti 4:13.
-
Akwụkwọ Nsọ.
-
Akwụna.
Ọ bụ onye na-akwa iko ka o nweta ego. (Okwu Grik a sụgharịrị “akwụna” bụ porʹne. Ọ pụtara “ire ihe.”) Ọ na-abụkarị ụmụ nwaanyị ka Baịbụl na-akpọ aha a, ma, e nwekwara ụmụ nwoke ndị Baịbụl kwuru na ha bụ ndị akwụna. Iwu Mosis kwuru na e nweghị onye kwesịrị ịbụ onye akwụna nakwa na mmadụ ekwesịghị iji ego ọ gbatara n’akwụna nye onyinye n’ụlọ Jehova. Ma, ndị na-ekpere arụsị na-eme ihe dị iche. Ha na-eji ndị na-agba akwụna n’ụlọ arụsị ha akpa ego. (Di 23:17, 18; 1Ez 14:24) E nwekwara ndị ọzọ Baịbụl kpọrọ ndị akwụna. Ha bụ ndị mmadụ, obodo dị iche iche, nakwa òtù dị iche iche na-ekpere arụsị ma na-ekwu na ha na-efe Chineke. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ Mkpughe kpọrọ “Babịlọn Ukwu ahụ” akwụna. Ọ bụ okpukpe ụgha niile dị n’ụwa bụ “Babịlọn Ukwu ahụ.” Ihe mere Baịbụl ji kpọọ ha akwụna bụ maka na ha so ndị na-achị ụwa a na-eri n’otu efere n’ihi akpịrị ego nakwa n’ihi na ha chọrọ ka ha soro na-atụ ihe a na-eme n’ụwa.—Mkp 17:1-5; 18:3; 1Ih 5:25.
-
Alabasta.
Ọ bụ aha a na-akpọ obere mkpọ̀ e ji nkume a na-enweta n’ebe dị nso n’Alabastrọn, dị n’Ijipt, eme. A na-emekarị mkpọ̀ ndị ahụ ka olu ha dị warara nke na e nwere ike ikwuchi ha ka ihe na-esi ísì ọma dị n’ime ha ghara ikupụsị. E mechakwara kpọwa nkume e ji arụ alabasta otu aha ahụ.—Mk 14:3.
-
Alaeze Chineke.
-
Alamọt.
Ọ bụ okwu gbasara egwú. Ọ pụtara “Ụmụ Agbọghọ.” O nwere ike ịbụ olu na-ada gịrịgịrị ụmụ agbọghọ ji agụ egwú ka e ji ya akọwa. Ọ ga-abụ na e dere ya iji gosi na e kwesịrị ịkpọ abụ ọ dị na ya ka ebe e ji olu gịrịgịrị na-abụ abụ.—1Ih 15:20; Ọm 46:0 (Okwu Mmeghe).
-
Alfa na Omega.
-
Alo.
-
Amagedọn.
E si n’okwu Hibru bụ́ Har Meghid·dohnʹ nweta okwu a. Ihe okwu Hibru a pụtara bụ “Ugwu Megido.” E ji ya akọwa “agha a ga-alụ n’oké ụbọchị Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” N’agha a, “ndị eze niile nọ n’ụwa” ga-ezukọta ka ha lụso Jehova agha. (Mkp 16:14, 16; 19:11-21)—Gụọ OKÉ MKPAGBU.
-
Amara.
Okwu Grik e si sụgharịta okwu a pụtara ihe dị nnọọ mma na ihe na-emetụ n’ahụ́. A na-ekwukarị ya n’ihe gbasara onyinye onye nyere ya ji obi ya nye. E kwuo na Chineke meere mmadụ amara, ọ pụtara na Chineke nyere onye ahụ onyinye, n’atụwaghị anya ka ọ kwụghachi ya. Ọ na-egosi na Chineke na-eji obi ya niile enye ụmụ mmadụ ihe, na otú o si hụ ha n’anya enweghị atụ, nakwa na ọ na-emere ha ihe ọma. Ihe ọzọ e nwekwara ike ịkpọ okwu Grik ahụ bụ “ihe ọma” na “onyinye onye nyere ya ji obi ya nye.” Ọ bụ onyinye onye e nyere ya na-arụtaghị n’ọrụ nakwa ihe ọ na-agbataghị ná mbọ. Ọ bụ naanị na onye nyere ya kpebiri inye ya onye ahụ.—2Kọ 6:1; Efe 1:7.
-
Amen.
Ọ pụtara “ka ọ dị otú ahụ,” ma ọ bụ “n’eziokwu.” Amen si n’okwu Hibru bụ́ ʼa·manʹ. Ihe okwu Hibru a pụtara bụ “ihe e kwesịrị ịtụkwasị obi, ihe e ji n’aka.” Ndị mmadụ na-asị “Amen” iji gosi na ha kwetara n’iyi a ṅụrụ, n’ihe e kpere n’ekpere, ma ọ bụkwanụ n’ihe e kwuru. Ná Mkpughe, Amen bụ aha e turu Jizọs.—Di 27:26; 1Ih 16:36; Mkp 3:14.
-
Amụma.
Ọ bụ ozi si n’aka Chineke. O nwere ike ịbụ ime ka a mara ihe bụ́ uche Chineke ma ọ bụkwanụ ikwusa ya ekwusa. Amụma nwere ike ịbụ ihe Chineke kwuru ka a gwa ndị mmadụ gbasara otú ọ chọrọ ka ha si na-akpa àgwà. O nwekwara ike ịbụ ịgwa ndị mmadụ iwu Chineke nyere ha ma ọ bụ ịgwa ha ihe o kpebiri ime ha. Amụma nwekwara ike ịbụ ịgwa ndị mmadụ ihe ga-eme n’ọdịnihu.—Ezi 37:9, 10; Da 9:24; Mt 13:14; 2Pi 1:20, 21.
-
Arameik.
Ọ bụ asụsụ yiri nnọọ asụsụ Hibru. Mkpụrụ akwụkwọ ya na nke asụsụ Hibru bụ otu. Ọ bụ ndị Eram nwe asụsụ a, ma mba dị iche iche Asiria na Babịlọn chịrị mechara sụwa ya, jiri ya na-akparịta ụka ma na-azụ ahịa. Ọ bụkwa ya bụ asụsụ ndị ọchịchị Alaeze Peshia na ndị rụụrụ ha ọrụ sụrụ. (Ezr 4:7) E ji asụsụ Arameik dee ebe ụfọdụ n’akwụkwọ Ezra, Jeremaya, na Daniel.—Ezr 4:8–6:18; 7:12-26; Jer 10:11; Da 2:4b–7:28.
-
Ariopagọs.
Ọ bụ ugwu dị n’Atens, n’ebe ugwu Akropọlis. Ọ bụkwa aha a na-akpọ ndị ikpe (kansụl) na-ezukọ n’ebe ahụ ekpe ikpe. Ndị òtù Stoik na ndị òtù Epikurọs kpụgara Pọl n’Ariopagọs ka ọ kọwaa ihe o kweere.—Ọrụ 17:19.
-
Arụsị; Ikpere arụsị.
Arụsị bụ ihe a kpụrụ akpụ, ihe a pịrị apị, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ mmadụ ji efe ofufe, ma ihe ahụ ò yiri ihe dị adị ma ò yiri ihe na-adịghị adị. Ikpere arụsị bụ mmadụ ife ihe na-abụghị Chineke, ịhụ ihe ahụ n’anya, ma ọ bụ ịkwanyere ihe ahụ ùgwù pụrụ iche.—Ọm 115:4; Ọrụ 17:16; 1Kọ 10:14.
-
Aselgeia.—
-
Ashtọret.
Ọ bụ chi ndị Kenan. Ha weere ya ka chi agha na chi ọmụmụ, werekwa ya ka nwunye Bel.—1Sa 7:3.
-
Azazel.
B
-
Balsam.
-
Baptizim; Ime baptizim.
Ọ pụtara “imikpu” ma ọ bụ itinye n’ime mmiri. Jizọs mere ka o doo anya na onye ọ bụla chọrọ ịbụ onye na-eso ụzọ ya ga-emerịrị baptizim. E nwere baptizim dị iche iche e kwuru okwu ha n’Akwụkwọ Nsọ. Ụfọdụ n’ime ha bụ baptizim Jọn mere, iji mmụọ nsọ eme mmadụ baptizim, na iji ọkụ eme mmadụ baptizim.—Mt 3:11, 16; 28:19; Jn 3:23; 1Pi 3:21.
-
Bat.
Ọ bụ ihe e ji atụ̀ ihe dị mmiri mmiri. Ọ na-adị ihe dị ka lita 22 (ihe dị ka galọn 5.81). Otú e si mata bụ na e gwutere mpekere ite dị iche iche e dere “bat” n’ahụ́ ha. A na-eji otú bat hà agbakọ otú ọtụtụ n’ime ihe ndị ọzọ e ji atụ̀ ihe hà, ya bụ, ihe ndị e dere na Baịbụl e ji atụ̀ ihe dị mmiri mmiri na ihe dị gharị gharị. (1Ez 7:38; Ezi 45:14)—Gụọ B14.
-
Bel.
Ọ bụ chi ndị Kenan. Ha weere ya ka chi ọmụmụ, chi nwe mbara ígwé, na chi na-eme ka mmiri zoo. A kpọkwara ụfọdụ ụmụ obere chi “Bel.” Okwu Hibru a sụgharịrị Bel pụtara “Onye nwe; Nna Ukwu.”—1Ez 18:21; Ro 11:4.
-
Bielzebọb.
-
Bul.
D
-
Darik.
-
Degọn.
Ọ bụ chi ndị Filistia. A maghị ebe okwu a si, ma ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na o yiri okwu Hibru bụ́ dagh (azụ̀).—Ikp 16:23; 1Sa 5:4.
-
Dikapọlis.
Ọ bụ aha a na-akpọ obodo ndị Grik nke nwere obodo nta iri n’ime ya (e si n’okwu Grik bụ́ deʹka, nke pụtara “iri” nakwa poʹlis, nke pụtara “obodo,” nweta ya). Ọ bụkwa aha a na-akpọ mpaghara ebe ọwụwa anyanwụ Oké Osimiri Galili nakwa Osimiri Jọdan, bụ́ ebe ọtụtụ n’ime obodo ndị a dị. Ọtụtụ ndị Grik na-azụ ahịa n’obodo ndị ahụ, a na-emekwa omenala ndị Grik na ha. Jizọs gafere ógbè ahụ, ma e nweghị ebe Baịbụl kwuru na ọ gara na nke ọ bụla n’ime obodo ndị ahụ. (Mt 4:25; Mk 5:20)—Gụọ A7 na B10.
-
Dinarịọs.
-
Drakma.
E
-
Èbè.
Ọ bụ eriri e ji akpụkpọ anụ mee ma ọ bụ eriri a kpara akpa nke e ji akwara anụ ma ọ bụ ajị anụ mee. Etiti ya na-adị mbadamba. A na-etinye ihe a chọrọ ịgbapụ na ya. Ihe a na-etinyekarị na ya bụ okwute. A na-eke otu isi èbè ahụ n’aka, jide isi nke ọzọ n’aka. A na-agbapụkwa ihe dị na ya ma e fegharịchaa ya. Ndị agha mba ndị e nwere n’oge ochie na-eji èbè alụ agha.—Ikp 20:16; 1Sa 17:50.
-
Ebe a na-anọ efe ofufe.
Ọ bụ ebe dị nsọ a rụrụ ka a nọrọ na-efe Chineke. Ma n’ọtụtụ ebe e kwuru okwu ya, ọ bụ ụlọikwuu ma ọ bụ ụlọ nsọ dị na Jeruselem ka a na-ekwu. A na-akpọkwa ya ebe nsọ. A kpọrọ ebe Chineke bi n’eluigwe ebe nsọ.—Ọp 25:8, 9; Le 19:30; 26:2, 31; 2Ez 10:25; 1Ih 28:10; Mkp 11:19.
-
Ebe a na-azọchapụta mmanya.
Ọ na-abụkarị olulu abụọ e gwuru n’ala ụrọ. Otu na-adị elu karịa ibe ya, a na-enwekwa obere oghere na-esi n’otu gaa na nke ọzọ. A nọrọ na nke ahụ dị elu na-azọcha mkpụrụ vaịn, mmanya a na-azọchapụta ana-esi n’oghere ahụ na-asọba na nke dị ala. A na-ejikwa okwu a ama atụ ahụhụ Chineke ga-ata ndị ọ mara ikpe.—Aịz 5:2; Mkp 19:15.
-
Ebe dị elu.
-
Ebe ịchụàjà.
Ọ bụ ebe a rụliri elu nke a na-anọ achụrụ Chineke àjà ma ọ bụ amụrụ ya insens. Ihe e ji arụ ya bụ ájá, nnukwu nkume, obere nkume, ma ọ bụ osisi e ji ọla machie. N’ọnụ ụlọ nke mbụ n’ụlọikwuu nakwa n’ụlọ nsọ, e nwere obere “ebe ịchụàjà e ji ọlaedo rụọ” a na-amụ insens n’elu ya. E ji osisi rụọ ebe ịchụajà a, werezie ọlaedo machie ya. Ma e nwere nnukwu “ebe ịchụàjà e ji ọla kọpa rụọ” n’ogige ụlọikwuu. A na-esu àjà ọkụ n’ebe ịchụàjà a. (Ọp 27:1; 39:38, 39; Je 8:20; 1Ez 6:20; 2Ih 4:1; Lu 1:11)—Gụọ B5 na B8.
-
Ebe Kacha Nsọ.
Ọ bụ ọnụ ụlọ dị n’ime ime n’ụlọikwuu nakwa n’ụlọ nsọ. Ọ bụ n’ebe ahụ ka a dọsara igbe ọgbụgba ndụ. A na-akpọkwa ya Ebe Nsọ Kacha Ebe Nsọ. Iwu Mosis kwuru na ọ bụ naanị nnukwu onye nchụàjà na-aba n’Ebe Kacha Nsọ. Ọ bụkwa naanị n’Ụbọchị Ikpuchi Mmehie ka o nwere ike ịba n’ebe ahụ.—Ọp 26:33; Le 16:2, 17; 1Ez 6:16; Hib 9:3.
-
Ebe Nsọ.
Ọ bụ ọnụ ụlọ nke mbụ nakwa nke kacha ibu n’ụlọikwuu ma ọ bụ n’ụlọ nsọ. Ọ dị iche n’Ebe Kacha Nsọ nke dị n’ime ime. N’ụlọikwuu, ihe ndị dị n’Ebe Nsọ bụ ihe e ji ọlaedo rụọ e ji adọsa ọkụ, ebe ịchụàjà insens e ji ọlaedo rụọ, tebụl nke achịcha a na-enye Chineke na-adị n’elu ya, na arịa dị iche iche e ji ọlaedo rụọ. N’ụlọ nsọ, ihe ndị dị n’Ebe Nsọ bụ ebe ịchụàjà e ji ọlaedo rụọ, ihe iri e ji ọlaedo rụọ e ji adọsa ọkụ, tebụl iri e ji edosa achịcha a na-enye Chineke. (Ọp 26:33; Hib 9:2)—Gụọ B5 na B8.
-
Ebib.
Ọ bụ aha a na-akpọbu ọnwa nke mbụ na kalenda dị nsọ nke ndị Juu. Ọ bụkwa ọnwa nke asaa na kalenda nkịtị (kalenda ọrụ ubi) nke ndị Juu. Ebib pụtara “Oko (Ọka) Na-akpọbeghị Akpọ.” Ọnwa a na-amalite n’etiti ọnwa Mach ruo n’etiti ọnwa Eprel. Mgbe ndị Juu si Babịlọn lọta, a kpọwara ya ọnwa Naịsan. (Di 16:1)—Gụọ B15.
-
Eda.
-
Efa.
-
Efọd.
-
Ekpenta; Onye ekpenta.
-
Ekwensu.
Aha a kpọrọ Setan n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ọ pụtara “Onye Nkwutọ.” A kpọrọ Setan Ekwensu n’ihi na ọ bụ ya bụ onye mbụ kwutọrọ Jehova, bụrụkwa onyeisi ndị na-ekwutọ ya. Ọ na-ebokwa Jehova ebubo, na-ekwutọ aha nsọ ya, na-ekwukwa ihe na-abụghị eziokwu gbasara ihe o kwuru.—Mt 4:1; Jn 8:44; Mkp 12:9.
-
Ekwú.
-
Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko.
-
Ememme Inyefe Chineke Ụlọ.
Ọ bụ ememme a na-eme kwa afọ e ji echeta oge e mere ka ụlọ nsọ dị ọcha mgbe Antiokọs Epifanes merụchara ya. Ememme a na-amalite n’abalị 25 n’ọnwa Kislev. A na-eme ya ụbọchị asatọ.—Jn 10:22.
-
Ememme Ngabiga.
Ọ bụ ememme a na-eme n’abalị iri na anọ n’ọnwa Ebib (nke e mechara kpọwa Naịsan). E ji ya echeta oge Chineke napụtara ndị Izrel n’aka ndị Ijipt. N’ụbọchị Ememme Ngabiga, a na-egbu nwa atụrụ (ma ọ bụ ewu), hụọ ya n’ọkụ. A na-erikọtazi ya na achịcha na-ekoghị eko na akwụkwọ nri na-elu ilu.—Ọp 12:27; Jn 6:4; 1Kọ 5:7.
-
Ememme Owuwe Ihe Ubi; Ememme Izu.—
Gụọ PENTIKỌST.
-
Ememme Ụlọ Ndò.
A na-akpọkwa ya Ememme Ụlọikwuu ma ọ bụ Ememme Ịchịkọbata Ihe. A na-eme ya malite n’abalị iri na ise ruo abalị iri abụọ na otu n’ọnwa Etanim. Ndị Izrel na-eme ememme a ná ngwụcha oge ọrụ ubi mgbe ha wechara ihe ubi. Ọ bụ oge ndị mmadụ ji enwe obi ụtọ na oge ha ji ekele Jehova maka na ọ gọziri ihe ha kụrụ n’ubi. N’oge a na-eme ememme a, ndị Izrel na-ebi n’ụlọ ndò iji cheta mgbe ha si n’Ijipt pụta. Ememme a so n’ememme atọ e nyere ụmụ nwoke ndị Izrel iwu ka ha gaa Jeruselem mee ha.—Le 23:34; Ezr 3:4.
-
Eram; Ndị Eram.
Ọ bụ nwa Shem a na-akpọ Eram mụrụ ndị Eram. Ha biri n’ógbè ndị malitere n’Ugwu Lebanọn ruo na Mesopotemia nakwa malite n’Ugwu Tọrọs nke dị n’ebe ugwu ruo na Damaskọs, gbadaakwa Damaskọs ruo n’ebe ndịda. Aha a na-akpọ ebe ndị a n’asụsụ Hibru bụ Eram. Ma e mechara kpọwa ya Siria, kpọwazie ndị biri na ya ndị Siria.—Je 25:20; Di 26:5; Ho 12:12.
-
Eshia.
N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ọ bụ aha a na-akpọ ebe ndị Rom chịrị. Ebe ọdịda anyanwụ mba Tọki oge a nakwa obodo ụfọdụ mmiri gbara gburugburu n’ógbè ahụ, dị ka Semọs na Patmọs, so n’ebe a a kpọrọ Eshia. Isi obodo Eshia bụ Efesọs. (Ọrụ 20:16; Mkp 1:4)—Gụọ B13.
-
Etanim.
-
Etiopia.
Ọ bụ aha a na-akpọ otu mba nke dị n’ebe ndịda Ijipt kemgbe oge ochie. Ebe ndịda ndịda Ijipt oge a nakwa ebe ugwu Sudan oge a so n’ebe bụ́ Etiopia n’oge ochie. Mgbe ụfọdụ, ihe a na-akpọ “Kush” n’asụsụ Hibru bụ Etiopia.—Es 1:1.
-
Eze Nwaanyị nke Eluigwe.
Ọ bụ ihe a na-akpọ chi ndị Izrel ụfọdụ fewere mgbe ha kwụsịrị ife Chineke n’oge Jeremaya dị ndụ. Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ chi ndị Babịlọn bụ́ Ishta (Astati) ka a na-akpọ Eze Nwaanyị nke Eluigwe. Ihe a na-akpọ chi dị ka ya nke ndị Sumeria na-efe bụ Inanna. Inanna pụtara “Eze Nwaanyị nke Eluigwe.” E wezụga na a na-akpọ ya Eze Nwaanyị nke Eluigwe, a na-akpọkwa ya chi na-enye nwa. N’ihe ndị Ijipt dere, a kpọrọ Astati “Nwaanyị nke Eluigwe.”—Jer 44:19.
-
Ezi Chineke.
Ihe a sụgharịrị okwu Hibru abụọ bụ́ Ha-Elohim na Ha-El bụ “Ezi Chineke.” N’ọtụtụ ebe na Baịbụl, a na-eji okwu Hibru abụọ a egosi otú Jehova, onye naanị ya bụ ezi Chineke, si dị iche na chi ndị ọzọ na-abụghị ezigbo chi. Ebe ndị a sụgharịrị ha “ezi Chineke” dabara adaba n’ihi na o mere ka ihe ha pụtara na Hibru doo nnọọ anya.—Je 5:22, 24; 46:3; Di 4:39.
-
Ezi omume.
F
-
Fatọm.
-
Fero.
-
Filistia; Ndị Filistia.
-
Frankinsens.
Ọ bụ esó (gọm) kpụkọrọ akpụkọ na-esi n’osisi ụfọdụ ma ọ bụ n’ahịhịa ụfọdụ agbapụta. A na-akpọ ya Boswellia. Frankinsens na-esi ísì ọma ma a mụnye ya ọkụ. O so n’ihe ndị e ji eme insens a na-amụ n’ụlọikwuu nakwa n’ụlọ nsọ. A na-atụkwasị ya n’elu àjà ọka nakwa n’elu achịcha ndị a na-edosa n’Ebe Nsọ.—Ọp 30:34-36; Le 2:1; 24:7; Mt 2:11.
G
-
Gehena.
Ọ bụ aha a na-akpọ Ndagwurugwu Hinọm n’asụsụ Grik. Ọ dị n’agbata ebe ndịda na ebe ọdịda anyanwụ Jeruselem oge ochie. (Jer 7:31) E buru n’amụma na ọ bụ ebe a ga na-atụsa ozu. (Jer 7:32; 19:6) E nweghị ihe gosiri na a na-atụba mmadụ dị ndụ ma ọ bụ anụmanụ dị ndụ n’ebe ahụ ka a kpọọ ya ọkụ ma ọ bụ ka a taa ya ahụhụ. N’ihi ya, Gehena apụtaghị ebe a na-anaghị ahụ anya a na-anọ ata mkpụrụ obi ndị mmadụ ahụhụ ebighị ebi n’ọkụ. Kama, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ji Gehena maa atụ mbibi ebighị ebi nke a kpọrọ “ọnwụ nke abụọ.”—Mkp 20:14; Mt 5:22; 10:28.
-
Gilied.
-
Gira.
-
Gitit.
Ọ bụ okwu gbasara egwú. A maghị kpọmkwem ihe ọ pụtara, ma ọ ga-abụ na e si n’okwu Hibru bụ́ gath nweta ya. Ebe ọ bụ na gath pụtara ebe a na-azọchapụta mmanya, ụfọdụ chere na “Gitit” nwere ike ịbụ ụda egwú na-ekwu gbasara imepụta mmanya.—Ọm 81:0 (Okwu Mmeghe).
-
Gọvanọ.
-
Grik.
H
-
Hedis.
Ọ bụ okwu Grik nke ya na okwu Hibru bụ́ “Shiol” bụ otu ihe. A sụgharịrị ya “ili” ma tinye akara (*) gosiri na e nwere ebe a kọwakwuru ya. E si otú a gosi na ọ dị iche n’ili nkịtị. Hedis bụ okwu na-egosi na ndị nwụrụ anwụ adịghịzi ndụ.—Gụọ ILI.
-
Hemis.
Ọ bụ chi ndị Grik, bụrụkwa nwa Zus. N’obodo Listra, a kpọrọ Pọl Hemis n’ihi na ndị obodo ahụ weere chi ahụ ka chi na-ejere chi ndị ọzọ ozi, werekwa ya ka chi bụ́ ọkà n’ikwu okwu.—Ọrụ 14:12.
-
Herọd.
Ọ bụ aha otu ezinụlọ ndị eze chịrị ndị Juu. Ọ bụ ndị Rom họpụtara ha ka ha chịwa. A ma Herọd Onye Ukwu ama n’ihi na ọ bụ ya rụghachiri ụlọ nsọ dị na Jeruselem nakwa n’ihi na o nyere iwu ka e gbuo ụmụaka niile maka na ọ chọrọ igbu Jizọs. (Mt 2:16; Lu 1:5) Herọd Akeleyọs na Herọd Antipas bụ ụmụ Herọd Onye Ukwu. A họpụtara ha ka ha chịa mpaghara ụfọdụ nna ha chịrị. (Mt 2:22) Antipas chịrị ógbè Galili. A na-akpọkarị ya “eze.” Ọ bụ ya na-achị mgbe Kraịst jere ozi n’ụwa afọ atọ na ọkara ruo n’oge ihe ndị a kọrọ n’Ọrụ Ndịozi isi 12 mere. (Mk 6:14-17; Lu 3:1, 19, 20; 13:31, 32; 23:6-15; Ọrụ 4:27; 13:1) Mgbe ọ chịchara, Herọd Agrịpa nke Mbụ, bụ́ nwa nwa Herọd Onye Ukwu, chịrị obere oge tupu mmụọ ozi Chineke egbuo ya. (Ọrụ 12:1-6, 18-23) Nwa ya, bụ́ Herọd Agrịpa nke Abụọ, malitere ịchị. Ọ chịgidere ruo n’oge ndị Juu nupụụrụ ndị Rom isi.—Ọrụ 23:35; 25:13, 22-27; 26:1, 2, 19-32.
-
Higeyọn.
Ọ bụ okwu gbasara otú e si eduzi egwú. N’ebe e dere ya n’Abụ Ọma 9:16, o nwere ike ịbụ na ọ pụtara na a ga-eji nwayọọ kpọọ ụbọ akwara ma e rute n’ebe ahụ ma ọ bụkwanụ na a ga-agbatụ nkịtị n’ebe ahụ ka e nwee ike ichebara abụ ahụ echiche.
-
Hin.
-
Hisop.
Ọ bụ ahịhịa nwere ọmarịcha alaka na akwụkwọ. A na-eji ya efesa ọbara ma ọ bụ mmiri ma e mewe ka ihe dị ọcha. O nwere ike ịbụ ya ka a na-akpọ majọram (Origanum maru; Origanum syriacum). O nwere ike ịbụ na hisop e kwuru okwu ya na Jọn 19:29 bụ ahịhịa majọram e kenyere n’okporo ahịhịa sọgọm (Sorghum vulgare). Ogbo ahụ e tinyere ná mmanya gbara ụka ruru n’ọnụ Jizọs maka na okporo sọgọm na-adị ezigbo ogologo.—Ọp 12:22; Ọm 51:7.
-
Homa.
-
Horeb; Ugwu Horeb.
I
-
Ibikwasị aka n’isi.
-
Ibi úgwù.
-
Ibu ọnụ.
Ọ pụtara mmadụ ịhapụ iri nri ọ bụla ruo oge ụfọdụ. Ndị Izrel na-ebu ọnụ n’Ụbọchị Ikpuchi Mmehie, n’oge nsogbu, nakwa n’oge ha chọrọ ka Chineke gwa ha ihe ha ga-eme. Ndị Juu na-ebu ọnụ ugboro anọ n’afọ. Ha ji ya echeta oge ndị ọdachi dakwasịrị obodo ha. Iwu ejighị Ndị Kraịst ibu ọnụ.—Ezr 8:21; Aịz 58:6; Lu 18:12.
-
Ife Chineke otú ọ chọrọ.
-
Ife nza.
Ọ bụ kịrịkịrị okwute ma ọ bụ obere osisi ka a na-eji efe nza ma a chọọ ikpebi ihe. A na-awụnye ha n’uwe ma ọ bụ n’ihe, yọgharịa ha. A na-ahọrọzi okwute ma ọ bụ osisi nke dapụtara ma ọ bụ nke e wepụtara. A na-ekpekarị ekpere tupu e mee ihe a.—Jos 14:2; Ilu 16:33; Mt 27:35.
-
Ifrem.
-
Igurube.
-
Igbe ọgbụgba ndụ.
Ọ bụ igbe e ji osisi akeshia rụọ ma jiri ọlaedo machie ya. A dọsara igbe a n’Ebe Kacha Nsọ n’ụlọikwuu, mechaakwa dọsa ya n’Ebe Kacha Nsọ n’ụlọ nsọ Solomọn rụrụ. E ji ọlaedo rụọ okwuchi ya, jirikwa ọlaedo kpụọ ndị cherob abụọ chere ibe ha ihu n’elu ya. Ihe bụ́ isi e tinyere n’ime igbe ọgbụgba ndụ ahụ bụ mbadamba nkume abụọ e dere Iwu Iri ahụ. (Di 31:26; 1Ez 6:19; Hib. 9:4)—Gụọ B5 na B8.
-
Ihe a kwatara n’agha.
Ọ bụ ihe mmadụ nwe ma ọ bụ ngwá ụlọ ya, anụmanụ ya, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru onye ahụ nwe, nke onye iro ya kwakọọrọ mgbe o meriri ya n’agha.—Jos 7:21; 22:8; Hib 7:4.
-
Ihe àmà.
O nwere ike ịbụ ihe ma ọ bụ ọnọdụ nwere ihe ọ nọchiri anya ya, ma ọ bụkwanụ ihe e mere iji gosi ihe merenụ ma ọ bụ ihe na-aga ime. O nwekwara ike ịbụ ihe pụrụ iche e mere iji gosi otú ihe ọzọ si mee ma ọ bụ otú ihe na-aga ime ga-esi mee.—Je 9:12, 13; 2Ez 20:9; Mt 24:3; Mkp 1:1.
-
Ihe Àmà ahụ.
E kwuo “Ihe Àmà ahụ,” ihe ọ na-apụtakarị bụ Iwu Iri ahụ Chineke dere ná mbadamba nkume abụọ nye Mosis.—Ọp 31:18.
-
Ihe àmà dị nsọ.
-
Ihe e ji agụnye owu a mụrụ amụ; Ihe e ji agụnye ọkụ.
Ọ bụ ihe e ji ọlaedo, ọlaọcha, ma ọ bụ ọla kọpa rụọ e ji rụọ ọrụ n’ụlọikwuu nakwa n’ụlọ nsọ. A na-eji ya amụ insens, na-eji ya agụpụ icheku ọkụ n’ebe ịchụàjà, na-ejikwa ya agụpụ owu a mụrụ amụ n’ihe e ji adọsa ọkụ nke e ji ọlaedo rụọ. A na-akpọkwa ya ihe e ji etinye insens.—Ọp 37:23; 2Ih 26:19; Hib 9:4.
-
Ihe e ji aka ihe akara.
Ọ bụ ihe a na-eji aka ihe akara iji gosi onye nwe ihe ahụ, ma ọ bụ iji gosi na ihe bụ nke ezigbo ya, ma ọ bụkwanụ iji gosi na e kwekọrịtala n’otu ihe. (A na-akakarị akara a n’elu ihe e ji ụrọ ma ọ bụ mgbá aṅụ mee). N’oge ochie, ọ na-abụ ihe siri ike (dị ka okwute, ọdụ́, ma ọ bụ osisi) ka a na-eji arụ ihe e ji aka ihe akara. A na-asụgharị ihe a chọrọ ide ma ọ bụ ihe a chọrọ ise n’ihu ya isi. E kwuo na a kara ihe akara, o nwere ike ịpụta na ihe ahụ bụ ihe a na-enweghị ike ịgbagha agbagha ma ọ bụ ihe e zochiri ezochi. O nwekwara ike ịbụ na e ji akara ahụ gosi onye nwe ihe ahụ.—Ọp 28:11; Neh 9:38; Mkp 5:1; 9:4.
-
Ihe e ji emenyụ ọkụ.
Ọ bụ ihe e ji rụọ ọrụ n’ụlọikwuu nakwa n’ụlọ nsọ. E ji ọlaedo ma ọ bụ ọla kọpa rụọ ya. Ọ ga-abụ na o yiri mkpà. E ji ya achabi owu ọkụ.—2Ez 25:14.
-
Ihe ibé.
-
Ihe iko achịcha; Ihe na-eko achịcha.
Ọ bụ ihe a na-etinye ná ntụ ọka a gwara agwa ka o nwee ike iko ma ọ bụ nke a na-etinye n’ihe dị mmiri mmiri ka ọ gbakaa ma hikwuo nne. Ọ na-abụkarị ntụ ọka e si na nke e tinyeburu ihe na-eko achịcha wepụta ka a na-eji eme ihe iko achịcha ọhụrụ. Na Baịbụl, “ihe iko achịcha” na-anọchikarị anya mmehie ma ọ bụ ihe rụrụ arụ. E jikwa ya egosi ihe zoro ezo nke na-amụba amụba mgbe mmadụ na-amaghị.—Ọp 12:20; Mt 13:33; Ga 5:9.
-
Ihe mgbapụta.
Ọ bụ ụgwọ a na-akwụ ka a hapụ onye e ji eji, kwụsị ịta mmadụ ahụhụ, gbaghara onye mere mmehie, ma ọ bụ hapụ onye na-emeghị ihe o kwesịrị ime. Ọ bụghị mgbe niile ka ụgwọ ahụ na-abụ ego. (Aịz 43:3) E nwere ihe dị iche iche a na-eji maka ha akwụ ihe mgbapụta. Dị ka ihe atụ, n’Izrel, nwa nwoke mbụ ọ bụla bụ nke Jehova. Oké mbụ ọ bụla anụmanụ mụrụ bụkwa nke ya. Ma, e nwere ike ịkwụ ihe a ga-eji gbara ha n’aka Jehova. (Ọg 3:45, 46; 18:15, 16) Ọ bụrụ na ehi nke na-akpa ike, nke na-enweghịkwa onye du ya, egbuo mmadụ, onye nwe ya ga-akwụ ihe ọ ga-eji gbara isi onwe ya. (Ọp 21:29, 30) Ma, e nweghị ihe onye ma ụma gbuo mmadụ ga-akwụ ga-eme ka a hapụ ya. (Ọg 35:31) Ihe mgbapụta kacha ihe mgbapụta ndị ọzọ niile mkpa bụ nke Baịbụl kwuru na Kraịst ji ndụ ya chụọ àjà iji napụta ụmụ mmadụ na-erubere Chineke isi n’aka mmehie na ọnwụ.—Ọm 49:7, 8; Mt 20:28; Efe 1:7.
-
Ihe nzuzo dị nsọ.
-
Ijere Chineke ozi.
-
Iko nwaanyị.
-
Ikpuchi mmehie.
N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, e nwere àjà dị iche iche a na-achụ iji kpuchie mmehie ndị mmadụ, ka ha nwee ike ịbịaru Chineke nso na ife ya. Iwu Mosis kwuru ka ndị Izrel na-achụ àjà dị iche iche, karịchaa, n’Ụbọchị Ikpuchi Mmehie, ka e wee mee ka ndị mmadụ ma ọ bụ mba Izrel niile na Chineke dịghachi ná mma n’agbanyeghị mmehie ha. Àjà ndị ahụ gosiri àjà Jizọs mechara chụọ, nke kpuchiri mmehie mmadụ niile otu ugboro, mezie ka ndị mmadụ na Jehova nwee ike ịdị ná mma.—Le 5:10; 23:28; Kọl 1:20; Hib 9:12.
-
Ili.
Ọ bụrụ na a na-ekwu gbasara ili nkịtị, a na-ede ya “ili” n’etinyeghị akara gosiri na e nwere ebe a kọwakwuru ya. Ma ọ bụrụ na a na-ekwu gbasara “ili” nke e si n’okwu Hibru bụ́ “Shiol” na okwu Grik bụ́ “Hedis” sụgharịa, a na-ede ya “ili” ma tinye akara (*) gosiri na e nwere ebe a kọwakwuru ya. “Shiol” na “Hedis” abụghị ili nkịtị, kama ha bụ okwu na-egosi na ndị nwụrụ anwụ adịghịzi ndụ. Baịbụl gosiri na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, e nweghịkwa ihe ọ bụla ha na-eme.—Ọm 16:10; Ilu 27:20; Ek 9:10; Ọrụ 2:31.
-
Ili ncheta.
Ọ bụ ebe a na-eli onye nwụrụ anwụ. Ọ bụ okwu Grik bụ́ mne·meiʹon ka a sụgharịrị “ili ncheta.” E si n’okwu Grik pụtara “icheta” nweta ya. Ọ na-egosi na a na-echeta onye ahụ nwụrụ anwụ.—Jn 5:28, 29.
-
Ilirikọm.
-
Ilọl.
-
Ilu.
Ọ bụ okwu amamihe ma ọ bụ obere akụkọ na-akụzi ihe. E jikwa ya ekwu ihe bụ́ eziokwu gbara ọkpụrụkpụ n’ekwughị ogologo okwu. Ilu dị na Baịbụl nwere ike ịgbagwoju anya ma ọ bụ sie ike nghọta. Ihe a tụrụ n’ilu na-abụ eziokwu, ma, a na-ekwu ya ka ihe atụ. Ụfọdụ ilu mechara ghọọ okwu a na-ejikarị ama njakịrị ma ọ bụ ihe a na-ekwu ma a chọọ ịkparị mmadụ.—Ek 12:9; 2Pi 2:22.
-
Ime ihe ọjọọ n’asọghị anya.
E si n’okwu Grik bụ́ a·selʹgei·a sụgharịa ya. Ọ pụtara mmadụ ịkpachara anya mebie iwu Chineke n’emeghị ihere ọ bụla, n’asọghịkwa onye ọ bụla anya. Mmadụ ime omume a na-egosi na e nweghị ihe o ji ndị isi ma ọ bụ iwu ma ọ bụ ntụziaka kpọrọ. Ọ na-egosidị na ọ na-eleda ha anya. Ọ bụghị na mmadụ mere obere ihe ọjọọ bụ na onye ahụ emeela ihe ọjọọ n’asọghị anya.—Ga 5:19; 2Pi 2:7.
-
Insens.
Ọ bụ ihe na-esi ísì ọma a na-amụnye ọkụ, ya ejiri nwayọọ nwayọọ na-ere, ísì ọma ya ana-esipụta. A na-eji esó (gọm) dị iche iche na-esi ísì ọma a gwakọtara ya na balsam eme ya. Ọ bụ ihe anọ pụrụ iche ka e ji eme insens a na-amụ n’ụlọikwuu nakwa n’ụlọ nsọ. A na-amụnye ya ọkụ n’ụtụtụ nakwa n’abalị n’ebe ịchụàjà insens nke dị n’Ebe Nsọ. N’Ụbọchị Ikpuchi Mmehie, a na-amụnye ya n’Ebe Kacha Nsọ. Ọ nọchiri anya ekpere ndị ji obi ha niile na-efe Chineke na-ekpe, nke Chineke na-anabata. Ọp 30:34, 35; Le 16:13; Mkp 5:8.
A gwaghị Ndị Kraịst ka ha na-amụ insens.— -
Iru uju.
Ọ bụ ihe mmadụ na-eme iji gosi na ọnwụ mmadụ na-ewute ya ma ọ bụ na ọdachi dakwasịrị ya na-ewute ya. N’oge a na-ede Baịbụl, ndị mmadụ na-eru uju ruo oge ụfọdụ. Ọ bụghị naanị ákwá ka ndị na-eru uju na-ebe, ha na-eyikwa uwe pụrụ iche ha ji eru uju, kpokwasị ntụ n’isi ha, dọwaa uwe ha, na-etikwa onwe ha aka n’obi. E nwekwara mgbe ụfọdụ a na-akpọ ndị ọrụ ha bụ iru uju ka ha bịa mgbe a na-eli onye nwụrụ anwụ.—Je 23:2; Es 4:3; Mkp 21:4.
-
Ite mmanụ.
Ihe okwu Hibru a sụgharịrị ite mmanụ pụtara bụ “ite mmadụ ma ọ bụ ihe ọzọ ihe dị mmiri mmiri.” A na-ete mmadụ mmanụ iji gosi na a họpụtala onye ahụ ka ọ rụọ ọrụ pụrụ iche, a na-etekwa ihe na-abụghị mmadụ mmanụ iji gosi na a ga-eji ihe ahụ rụọ ọrụ pụrụ iche. N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, e kwukwara na e tere ndị a họọrọ ka ha gaa eluigwe mmanụ, ya bụ, na a wụsara ha mmụọ nsọ.—Ọp 28:41; 1Sa 16:13; 2Kọ 1:21.
-
Iwu.
-
Iwu Mosis.
-
Izrel.
Ọ bụ aha Chineke kpọrọ Jekọb. O mechara bụrụ aha a na-akpọ ndị niile si n’agbụrụ ya. A na-akpọkarị ụmụ ndị ụmụ Jekọb iri na abụọ mụtara ụmụ Izrel, ụmụ nwoke Izrel, ezinụlọ Izrel, ma ọ bụ ndị Izrel. Izrel bụkwa aha a kpọrọ ebo iri nke kewapụrụ n’ebo abụọ dị n’ebe ndịda wee bụrụ alaeze ebe ugwu. E mechakwara kpọwa Ndị Kraịst e tere mmanụ “Izrel nke Chineke.”—Ga 6:16; Je 32:28; Ikp 7:23; 2Sa 7:23; Ro 9:6.
Ị
-
Ịbụ ọnụ.
Ọ bụ ịgwa mmadụ ma ọ bụ ihe ọzọ na ihe ọjọọ ga-eme ya. Ọ pụtaghị ịgwa mmadụ okwu ọjọọ ma ọ bụ iwesa mmadụ iwe ọkụ. A na-asị na a bụrụ mmadụ ọnụ mgbe e kwuru na ihe ọjọọ ga-eme onye ahụ. Ọ bụrụkwa na ọ bụ Chineke ma ọ bụ onye ọ họpụtara bụrụ mmadụ ọnụ, ọ na-adị ka amụma, ọ na-emezukwa.—Je 12:3; Ọg 22:12; Ga 3:10.
-
Ịchụ àjà.
Ọ bụ onyinye a na-enye Chineke iji kelee ya ma ọ bụ iji gosi na mmadụ kwetara na o mere ihe ọjọọ ma ọ bụkwanụ iji mee ka mmadụ na Chineke dịghachi ná mma. Ebel bụ onye mbụ chụrụ àjà. Kemgbe ahụ, ndị mmadụ na-eji ma anụmanụ ma ihe ndị ọzọ achụ àjà. O mechara soro n’ihe a gwara ndị Izrel ka ha na-eme n’Iwu Mosis. Mgbe Jizọs bịara jiri ndụ ya zuru okè chụọ àjà, a kwụsịrị iji anụmanụ achụrụ Chineke àjà. Ma, Ndị Kraist ka na-esi n’ụzọ dị iche iche ha si efe Chineke achụrụ ya àjà.—Je 4:4; Hib 13:15, 16; 1Jn 4:10.
-
Ịdị ọcha.
Na Baịbụl, a sị na ihe dị ọcha, ọ pụtaghị naanị na ihe ahụ erughị unyi. Ọ pụtakwara ime ka ihe na-adị ọcha, ime ka ọ ghara ịrụ arụ, ka ọ ghara inwe ntụpọ, ka a ghara itinye ya ihe ga-emebi ya. Ihe ọzọ ọ pụtara bụ ime ka ihe rụrụ arụ ma ọ bụ ihe nwere ntụpọ dịrịzie ọcha. Ọ pụtakwara na omume mmadụ arụghị arụ nakwa na onye ahụ na Chineke dị ná mma. N’Iwu Mosis, a sị na ihe dị ọcha, ọ pụtara na e meela ka ihe ahụ dị ọcha otú e kwuru n’iwu ahụ.—Le 10:10; Ọm 51:7; Mt 8:2; 1Kọ 6:11.
-
Ịdọm.
-
Ịdọrọ ndị mmadụ n’agha.
Ihe ọ pụtara bụ ịkpụrụ ndị bi n’otu obodo laa n’obodo ọzọ. Ọ na-abụkarị ndị meriri obodo n’agha na-adọrọ ha n’agha. Okwu Hibru e si na ya nweta okwu a pụtara “ọpụpụ.” E nwere ugboro abụọ doro anya a dọọrọ ndị Izrel n’agha. Ọ bụ ndị Asiria dọọrọ alaeze Izrel nke dị ebo iri n’agha. Mgbe e mechara, ndị Babịlọn dọọrọ alaeze abụọ dị n’ebe ndịda n’agha. Mgbe Saịrọs eze Peshia chịwara, ụfọdụ n’ime ndị Izrel ahụ a dọọrọ n’agha laghachiri n’ala ha.— 2Ez 17:6; 24:16; Ezr 6:21.
-
Ịgba afa.
Ọ bụ iji ike ndị mmụọ ọjọọ eme ihe dị iche iche.—2Ih 33:6.
-
Ịhụnanya pụrụ iche.
N’ọtụtụ n’ihe e dere n’ala ala peeji Baịbụl a, a sụgharịrị okwu Hibru bụ́ cheʹsedh ịhụnanya pụrụ iche. Ọ pụtara ịhụnanya si n’ala ala obi, ịhụnanya nke na-eme ka otu onye jiri obi ya niile na-akwado onye ọzọ ma ghara ịhapụ ya. Ọ pụtakwara ịhụnanya nke na-eme ka mmadụ na-erube isi. Ọp 34:6; Ru 3:10.
A na-ejikarị ya akọwa otú Chineke si hụ ndị mmadụ n’anya. Ma mmadụ nwekwara ike ịhụ mmadụ ibe ya n’anya otú ahụ.— -
Ịkwa iko.
Okwu Grik e si nweta ya bụ por·neiʹa. Ọ pụtara mmadụ inwe mmekọahụ rụrụ arụ. Dị ka ihe atụ, nwaanyị nọ na di na nwoke ọzọ inwe mmekọahụ ma ọ bụ nwoke lụrụ nwaanyị na nwaanyị ọzọ inwe mmekọahụ, ịgba akwụna, nwoke na nwaanyị inwe mmekọahụ mgbe ha na-alụbeghị, nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị inwe mmekọahụ, nakwa mmadụ idina anụmanụ. N’akwụkwọ Mkpughe, e kwuru na “Babịlọn Ukwu ahụ,” ya bụ, okpukpe ụgha niile dị n’ụwa, na-akwa iko. Ihe mere Baịbụl ji sị na ha na-akwa iko bụ maka na ha na ndị na-achị ụwa a na-eri n’otu efere n’ihi akpịrị ego nakwa n’ihi na ha chọrọ ka ha soro na-atụ ihe a na-eme n’ụwa. (Mkp 14:8; 17:2; 18:3; Mt 5:32; Ọrụ 15:29; Ga 5:19)—Gụọ AKWỤNA.
-
Ịkwụsị ife Chineke fewe chi ọzọ.
Okwu Grik e si na ya nweta okwu a bụ a·po·sta·siʹa. Ihe ọ bụ ma a sụgharịa ya kpọmkwem otú e si dee ya na Grik bụ “ịkwụrụ iche.” Ihe ọ pụtara bụ “ịgbahapụ, ịhapụ, ma ọ bụ inupụ isi.” N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, e ji okwu bụ́ “ịkwụsị ife Chineke fewe chi ọzọ” akọwa ndị hapụrụ ofufe Chineke gbawazie ya ụkwụ.—Ilu 11:9; Aịz 32:6; Jer 23:15; 2Te 2:3.
-
Ịṅụ iyi.
Ọ bụ ihe a na-ekwu iji gosi na ihe e kwuru bụ eziokwu. O nwekwara ike ịbụ nkwa mmadụ ji obi ya niile kwe na ya ga-eme otu ihe ma ọ bụ na ya agaghị eme ya. Ọ na-abụkarị nkwa otu onye kwere onye ka ya, nke ka nke, nkwa e kwere Chineke. Jehova ṅụrụ iyi iji gosi na ọ ga-emezurịrị nkwa o kwere Ebreham mgbe ya na ya gbara ndụ.—Je 14:22; Hib 6:16, 17.
-
Ịtụtụ ihe ubi.
Ọ pụtara ịtụtụrụ ihe ubi onye na-ewe ihe ubi kpachaara anya hapụ ma ọ bụ ndị ọ na-akpachaghị anya hapụ. Iwu Mosis gwara ndị Izrel ka ha ghara iwerecha ihe niile dị n’ọnụ ọnụ ubi ha nakwa ka ha ghara ịghọrọcha mkpụrụ oliv ha na mkpụrụ vaịn ha. Ọ bụ Chineke nyere iwu ka ndị ogbenye, ndị na-ata ahụhụ, ndị mbịarambịa, ụmụ na-enweghị nna, na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ na-atụtụrụ ihe ndị e wefọrọ n’ubi.—Ru 2:7.
-
Ịzọcha ọka; Ebe a na-azọcha ọka.
Ịzọcha ọka bụ itichapụta ọka dị n’okporo ọka nakwa nke dị ná mkpo ọka. Ihe a na-akpọ ebe a na-arụ ọrụ a bụ ebe a na-azọcha ọka. A na-eji osisi eticha ọka. Mana, ọ bụrụ nke hiri nne, a na-eji ngwá ọrụ pụrụ iche, dị ka ihe e ji ígwè ma ọ bụ osisi rụọ anụmanụ na-adọkpụ. A na-eji ya rịa ọka ndị a wụsara n’ebe a na-azọcha ọka elu. Ebe ahụ na-adị larịị, dịkwa gburugburu. A na-arụkarị ya n’ebe dịtụ elu ikuku na-efe ọfụma.—Le 26:5; Aịz 41:15; Mt 3:12.
J
-
Jedutọn.
Ọ dị n’okwu mmeghe Abụ Ọma nke 39, nke 62, na nke 77. A maghị kpọmkwem ihe ọ pụtara. O yiri ka ọ̀ bụ ntụziaka otú a ga-esi bụọ abụ ọma ndị ahụ ma ọ bụ kpọọ ha ma ọ bụkwanụ ya abụrụ ụdị ngwá egwú a ga-eji kpọọ ha. E nwere onye Livaị aha ya bụ Jedutọn na-akpọ egwú. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na e si n’aka ya ma ọ bụ n’aka ụmụ ya nweta ngwá egwú ahụ ma ọ bụkwanụ mụta otú e si akpọ ya mgbe a na-abụ abụ ọma ndị ahụ.
-
Jehova.
-
Jekọb.
Ọ bụ nwa Aịzik na Ribeka mụtara. Chineke mechara gụọ ya Izrel. O mechara bụrụ nna ochie ndị Izrel (ndị e mechara kpọwa ndị Juu). Ọ bụ Jekọb mụtara ụmụ nwoke iri na abụọ ndị ha na ụmụ ha mechara bụrụ ebo iri na abụọ nke mba Izrel. A nọkwa na-akpọ mba Izrel ma ọ bụ ndị Izrel “Jekọb.”—Je 32:28; Mt 22:32.
-
Juda.
Ọ bụ nwa nwoke nke anọ Lia mụụrụ Jekọb. Mgbe Jekọb nọ n’ọnụ ọnwụ, o buru amụma na e nwere nnukwu eze ga-esi n’ezinụlọ Juda chịa nakwa na ọchịchị eze ahụ ga-adịte aka. Ọ bụ n’ezinụlọ Juda ka a mụrụ Jizọs. E nwekwara ebo a na-akpọ ebo Juda, e mechakwara nwee alaeze a kpọwara alaeze Juda. A na-akpọ alaeze ahụ alaeze dị n’ebe ndịda. Ọ bụ ebo Juda na ebo Benjamin nakwa ndị nchụàjà na ndị Livaị nọ n’alaeze Juda. Juda dị n’ebe ndịda ala Izrel, bụ́ ebe Jeruselem na ụlọ nsọ dị.—Je 29:35; 49:10; 1Ez 4:20; Hib. 7:14.
K
-
Kab.
-
Kaldia; Ndị Kaldia.
Ọ bụ aha a na-akpọbu ndị bi n’akụkụ Osimiri Taịgris na Osimiri Yufretis nakwa ala ebe ha bi. Ka oge na-aga, ọ bụzi aha a kpọwara ala Babịlonia niile na ndị bi na ya. E nwekwara ndị gụrụ akwụkwọ Ezr 5:12; Da 4:7; Ọrụ 7:4.
a kpọrọ “ndị Kaldia.” Ha gụrụ gbasara sayensị, ihe ndị mere n’oge ochie, asụsụ dị iche iche, nakwa gbasara mbara igwe. Ma ha na-eme anwansi, ha na-ejikwa kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.— -
Karama akpụkpọ mmanya.
Ọ bụ karama akpụkpọ a na-eji agbanye mmanya. A na-eji akpụkpọ anụ arụ ya. O nwere ike ịbụ akpụkpọ ewu ma ọ bụ nke atụrụ. Ọ bụ karama akpụkpọ dị ọhụrụ ka a na-agbanye mmanya, n’ihi na mmanya bido ịgbaka, ụfụfụ ọ na-agbọpụta nwere ike ịgbawa karama akpụkpọ e kwuchiri ekwuchi. Ọ bụrụ karama akpụkpọ ọhụrụ, ọ na-eme ka o koo. Mana, ọ bụrụ nke ochie, ike ụwa gwụrụla, ọ na-agbawa ya.—Jos 9:4; Mt 9:17.
-
Kashịa.
-
Kenan.
-
Kimọsh.
Ọ bụ chi ndị Moab fere. Ha weere ya ka chi kacha chi ha niile.—1Ez 11:33.
-
Kislev.
-
Kọọ.
-
Kọral.
Ọ bụ ihe siri ike ka nkume nke na-adị n’ime osimiri. Ọ bụrụ na obere anụmanụ ndị bi n’osimiri anwụọ, ọkpụkpụ ha na-aghọ kọral. Ụcha kọral na-adị iche iche. E nwere ndị na-acha ọbara ọbara, ndị na-acha ọcha, na ndị na-eji oji. Kọral juru eju n’Oké Osimiri Uhie. N’oge a na-ede Baịbụl, kọral ndị na-acha ọbara ọbara na-adị ezigbo ọnụ, a na-ejikwa ya eme ihe dị iche iche e ji achọ mma.—Ilu 8:11.
-
Kraịst.
-
Kubit.
Ọ bụ otú ihe hà n’ogologo. Otu kubit nwere ike ịha ka ihe si n’ikpere aka ruo ná mkpịsị aka nke etiti. N’Izrel, otu kubit na-adịkarị ihe dị ka sentimita 45.5 (inch 17.5). Ma n’oge ahụ, e nwekwara kubit katụ ogologo. Ọ na-eji otu uhiè ọbụ aka mmadụ akarị nke mbụ ahụ, ya bụ, ọ na-adị ihe dị ka sentimita 51.8 (inch 20.4). (Je 6:15; Lu 12:25)—Gụọ B14.
KP
-
Kpakpando ụtụtụ.
Ọ bụ kpakpando ikpeazụ na-apụta na mbara igwe n’ebe ọwụwa anyanwụ tupu anyanwụ awaa. Kpakpando a na-egosi na chi abọọla.—Mkp 22:16; 2Pi 1:19.
L
-
Leptọn.
-
Levayatan.
O yiri ka ọ̀ bụ anụ mmiri. Ihe e dere na Job 3:8 nakwa 41:1 n’asụsụ Hibru bụ Levayatan. O yiri ka ọ̀ bụ agụ iyi ka a na-ekwu n’amaokwu ndị ahụ ma ọ bụkwanụ ya abụrụ nnukwu anụ mmiri ọzọ siri ezigbo ike. N’Abụ Ọma 104:26, o nwere ike ịbụ azụ̀ weel ka a na-ekwu. N’ebe ndị ọzọ, ọ bụghị anụmanụ nkịtị ka a na-ekwu, e nweghịkwanụ anụmanụ a ga-asị na ọ bụ.—Ọm 74:14; Aịz 27:1.
-
Livaị; Ndị Livaị.
Ọ bụ nwa nwoke nke atọ Lia mụụrụ Jekọb. Ọ bụkwa aha a kpọrọ ebo si n’agbụrụ ya. Ọ bụ ụmụ ya ndị nwoke atọ mụtara ndị Livaị bụ́ ndị nchụàjà, e kebikwara ndị nchụàjà a ụzọ atọ. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ ndị niile so n’ebo Livaị ka a na-akpọ “ndị Livaị.” Ma ọtụtụ mgbe, ndị ezinụlọ Erọn bụ́ ndị nchụàjà anaghị eso ná ndị a na-akpọ “ndị Livaị.” E kenyeghị ebo Livaị ala n’Ala Nkwa ahụ, kama e nyere ha obodo iri anọ na asatọ ndị dị n’ebe e kenyere ebo ndị ọzọ ala.—Di 10:8; 1Ih 6:1; Hib 7:11.
-
Lọg.
Ọ bụ ihe e ji atụ̀ ihe dị mmiri mmiri. Ọ bụ ya kacha pee mpe n’ime ihe dị iche iche e ji atụ̀ ihe a kpọrọ aha na Baịbụl. N’akwụkwọ ndị Juu a na-akpọ Talmud, e kwuru na ọ bụ otu ụzọ n’ime ụzọ iri na abụọ nke otu hin. E jiri ihe a ha kwuru gbakọọ ya, ọ pụtara na otu lọg bụ ihe dị ka lita 0.31. (Le 14:10)—Gụọ B14.
M
-
Maịl.
Ọ bụ otú e si akọwa otú ebe dị iche iche dịruru anya. Ọ gbara naanị na Matiu 5:41 n’asụsụ Grik e ji dee Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. O nwere ike ịbụ maịl ndị Rom nke na-adị mita 1,479.5 (amaụkwụ 4,854) ka e bu n’obi. Ebe atọ ọzọ e dere “maịl” na Baịbụl a bụ n’ihe e dere n’ala ala peeji Luk 24:13, Jọn 6:19, na Jọn 11:18. Ọ bụ stediọm ka e dere ya n’asụsụ Grik e ji dee Baịbụl. Ma, a gbakọrọ ya, dezie ya na maịl.—Gụọ B14.
-
Maịna.
A kpọkwara ya mene n’akwụkwọ Ezikiel. Ọ bụ ihe e ji atụ̀ otú ego na ihe ndị ọzọ hà. Ihe ndị e gwutere n’ala gosiri na otu maịna na shekel 50 hà, otu shekel na-adịkwa gram 11.4 n’arọ. E jiri ihe a gbakọọ ya, ọ pụtara na otu maịna e kwuru okwu ya n’Akwụkwọ Nsọ Hibru dị ihe dị ka gram 570 n’arọ. O nwekwara ike ịbụ na e nwere ụdị maịna abụọ, otú ahụ e nwere ụdị kubit dị iche iche. E nwere maịna nke ndị eze na nke ndị nkịtị. N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, otu maịna na otu narị drakma hà n’arọ. Ọ na-adị gram 340 n’arọ. Maịna 60 na otu talent hà. (Ezr 2:69; Lu 19:13)—Gụọ B14.
-
Malkam.
-
Mana.
Ọ bụ ya bụ nri ndị Izrel riri n’ime afọ iri anọ ha nọrọ n’ala ịkpa. Ọ bụ Jehova nyere ha ya. A na-ahụ ya n’ala ma igirigi dara n’ụtụtụ kọọ. Ma, a naghị ahụ ya n’Ụbọchị Izu Ike. Mgbe mbụ ndị Izrel hụrụ ya, ha sịrị, “Gịnị ka ọ bụ?” ma ọ bụ, “man huʼ?” n’asụsụ Hibru. (Ọp 16:13-15, 35) N’ebe ndị ọzọ na Baịbụl, a kpọrọ ya “nri si n’eluigwe” (Ọm 78:24), “achịcha si n’eluigwe” (Ọm 105:40), nakwa “nri ndị dike” (Ọm 78:25). Jizọs jikwa mana maa atụ.—Jn 6:49, 50.
-
Masedonia.
-
Maskil.
Ọ bụ okwu Hibru gbara n’okwu mmeghe abụ ọma iri na atọ dị iche iche. A maghị kpọmkwem ihe ọ pụtara. Ma o nwere ike ịbụ na ọ pụtara “abụ a na-echebara echiche.” E nwere okwu yiri ya nke a sụgharịrị ‘mmadụ ije ozi otú na-egosi na ọ ma ihe.’ Ụfọdụ chere na ya na maskil nwere ike ịpụta otu ihe.—2Ih 30:22; Ọm 32:0 (Okwu Mmeghe).
-
Mbilite n’ọnwụ.
Ọ bụ mmadụ isi n’ọnwụ bilie. Okwu Grik bụ́ a·naʹsta·sis pụtara “ịkpọlite mmadụ; ibili ọtọ.” Baịbụl kwuru gbasara mmadụ itoolu a kpọlitere n’ọnwụ. Otu n’ime ha bụ Jizọs. Ọ bụ Jehova Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ Ịlaịja, Ịlaịsha, Jizọs, Pita, na Pọl kpọlitere mmadụ asatọ ndị nke ọzọ n’ọnwụ, o doro anya na ọ bụ Chineke nyere ha ike ha ji kpọlite ha. “Chineke ga-akpọlite ndị ezi omume na ndị ajọ omume nwụrụ anwụ” n’ụwa a iji mezuo nzube ya. (Ọrụ 24:15) Baịbụl kwukwara gbasara ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe. Ha bụ “ndị a ga-ebu ụzọ kpọlite n’ọnwụ.” Baịbụl kpọrọ mbilite n’ọnwụ nke a “mbilite n’ọnwụ mbụ.” Ndị a ga-akpọlite na nke a bụ ụmụnna Jizọs e ji mmụọ nsọ tee mmanụ.—Fil 3:11; Mkp 20:5, 6; Jn 5:28, 29, ihe e dere n’ala ala peeji ya; 11:25.
-
Mea.
Ọ bụ esó (gọm) na-esi ísì ọma ụdị osisi ogwu ụfọdụ ma ọ bụ obere osisi ụfọdụ a na-akpọ Commiphora na-agbapụta. Mea so n’ihe e ji eme mmanụ dị nsọ e ji ete mmadụ mmanụ. A na-efesa ya n’uwe ma ọ bụ n’ihe e ji edina ala nakwa n’ihe ndị ọzọ, ka ha siwe ísì ọma. A na-etinye ya ná mmanụ e ji ahịa mmadụ aka n’ahụ́ nakwa ná mmanụ otite. A na-ejikwa ya akwadebe ozu tupu e lie ya.—Ọp 30:23; Ilu 7:17; Jn 19:39.
-
Mehalat.
O yiri ka ọ̀ bụ okwu gbasara egwú. Ọ dị n’okwu mmeghe Abụ Ọma nke 53 na nke 88. Ọ ga-abụ na e si n’okwu Hibru pụtara “ike ọgwụgwụ” ma ọ bụ “ịrịa ọrịa” nweta ya. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na ọ bụ olu ákwá na olu onye obi na-adịghị mma ka e ji abụ abụ ndị ahụ. Ụdị olu a dabara n’ihe e dere n’abụ abụọ a.
-
Merodak.
Ọ bụ chi ndị Babịlọn fere. Ha weere ya ka chi kacha chi ha niile. Mgbe eze Babịlọn na omeiwu aha ya bụ́ Hamurabi mechara ka Babịlọn bụrụ isi obodo Babịlonia, Merodak (ma ọ bụ, Maduk) bịara bụrụ chi a kacha akwanyere ùgwù. Ọ nọchiziri chi ọzọ dị iche iche bu ya ụzọ dịrị, si otú ahụ bụrụ chi ndị Babịlọn weere ka chi kacha chi ha niile. Ka oge na-aga, aha a na-etu ya bụ́ “Belu” (nke pụtara “Onyenwe”) naara ya aha ya bụ́ Merodak (ma ọ bụ, Maduk). Ihe a na-akpọkarị Merodak bụ Bel.—Jer 50:2.
-
Mezaya.
-
Mgbaaka e ji aka ihe akara.
Ọ bụ ihe e ji aka ihe akara a na-agba na mkpịsị aka. E nwekwara ike ịganye ya n’ihe ma nyara ya n’olu. Ọ na-egosi na eze ma ọ bụ onyeisi nwere ikike. (Je 41:42)—Gụọ IHE E JI AKA IHE AKARA.
-
Mgbaasị.
Onye na-eme mgbaasị kweere na mmadụ nwụọ, mmụọ ya ka dị ndụ nakwa na onye nwụrụ anwụ nwere ike isi n’aka ndị dibịa afa gwa ndị dị ndụ okwu. Okwu Grik a sụgharịrị “ime mgbaasị” bụ phar·ma·kiʹa. Ihe ọ pụtara na Grik bụ “ọgwụ.” Na Grik, e kwuwe gbasara ọgwụ, ihe ga-agbata mmadụ n’obi bụ ime mgbaasị maka na n’oge ochie, ndị na-agba afa na-eji ọgwụ nkịtị akpọku ndị mmụọ ọjọọ ka ha meere ha ihe ha chọrọ.—Ga 5:20; Mkp 21:8.
-
Miktam.
-
Milkọm.
Ọ bụ chi ndị Amọn fere. O nwere ike ịbụ ya bụkwa chi Molek. (1Ez 11:5, 7) Ná ngwụcha ọchịchị Solomọn, ọ rụụrụ chi ụgha a ebe ndị dị elu.—Gụọ MOLEK.
-
Milo.
-
Mkpanaka.
-
Mkpà ndị e ji ejide owu.
Ọ bụ ngwá ọrụ e ji ọlaedo mee. A na-eji ya emenyụ ọkụ n’ụlọikwuu nakwa n’ụlọ nsọ.—Ọp 37:23.
-
Mkpo.
-
Mkpụrụ mbụ.
Ọ bụ mkpụrụ osisi mbụ e wetara n’ubi n’oge a na-ewe ihe ubi. Ọ bụkwa ihe mbụ e nwetara n’ihe ọ bụla mmadụ nwere. Jehova gwara mba Izrel ka ha na-enye ya mkpụrụ mbụ ha nwetara, ma ọ̀ bụ mmadụ ma ọ̀ bụ anụmanụ ma ọ̀ bụ ihe ha wetara n’ubi. Mba Izrel niile na-eji mkpụrụ mbụ ha nwetara achụrụ Chineke àjà n’Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko nakwa na Pentikọst. A kpọkwara Kraịst na ndị ọzọ e tere mmanụ “mkpụrụ mbụ.”—1Kọ 15:23; Ọg 15:21; Ilu 3:9; Mkp 14:4.
-
Mkpụrụ obi.
Ọ bụ ihe a na-asụgharị okwu Hibru bụ́ neʹphesh na nke Grik bụ́ psy·kheʹ. Mgbe e leruru ebe ndị e dere okwu abụọ a anya na Baịbụl, ọ bịara doo anya na ihe ha pụtara bụ (1) mmadụ, (2) anụmanụ, ma ọ bụ (3) ndụ mmadụ ma ọ bụ anụmanụ dị. (Je 1:20; 2:7; Ọg 31:28; 1Pi 3:20; gụọkwa ihe e dere n’ala ala peeji ha) Ihe ọtụtụ ndị okpukpe na-ekwu na “mkpụrụ obi” pụtara dị iche n’ihe Baịbụl kwuru. Ihe Baịbụl kwuru na-egosi na e kwuo neʹphesh na psy·kheʹ mgbe a na-ekwu gbasara ihe ndị Chineke kere n’ụwa, ihe ọ pụtara bụ ihe dị adị, ihe a ga-emetụli aka, ihe a na-ahụ anya, na ihe nwere ike ịnwụ anwụ. Na Baịbụl a, ọ bụ ihe okwu abụọ a pụtara n’amaokwu ndị ha gbara ka a sụgharịrị ha. Ihe ụfọdụ a kpọrọ ha bụ “ndụ,” “onye,” na “mmadụ.” E nwekwara ebe ndị e dere nnọchiaha, dị ka “m,” kama ide “mkpụrụ obi m.” N’ọtụtụ amaokwu, ihe e dere n’ala ala peeji bụ “mkpụrụ obi” iji gosi otú ọzọ e nwere ike isi kwuo ya. N’amaokwu ọ bụla e dere “mkpụrụ obi,” ma ọ̀ bụ n’ime Baịbụl ma ọ bụ n’ala ala peeji, ọ bụ ihe a kọwara ebe a ka ọ pụtara. Ebe ndị e kwuru gbasara mmadụ iji mkpụrụ obi ya niile na-eme ihe, ihe ọ pụtara bụ mmadụ iji onwe ya, obi ya niile, ma ọ bụ ndụ ya niile na-eme ihe ahụ. (Di 6:5; Mt 22:37) N’amaokwu ụfọdụ, e dere na agụụ na-agụ onye dị ndụ mgbe a na-ekwu gbasara mkpụrụ obi. E nwekwara ebe mkpụrụ obi pụtara onye nwụrụ anwụ ma ọ bụ ozu mmadụ.—Ọg 6:6; Ilu 23:2; Aịz 56:11; Hag 2:13.
-
Mmadụ ikuchi nwunye nwanne ya.
-
Mmụọ.
Ihe a na-asụgharịkarị okwu Hibru bụ́ ruʹach na okwu Grik bụ́ pneuʹma bụ “mmụọ.” Ma, e nwere ihe dị iche iche ha pụtara. Ihe ha niile pụtara bụ ihe mmadụ na-enweghị ike ịhụ anya na ihe nwere ike ịkpa ike. Okwu Hibru na Grik a nwere ike ịpụta (1) ifufe, (2) ume ndụ dị n’ime ihe ndị e kere eke dị n’ụwa, (3) ihe na-emetụ mmadụ n’obi, nke na-eme ka onye ahụ na-ekwu ihe ndị ọ na-ekwu ma ọ bụ na-eme ihe ndị ọ na-eme, (4) okwu si n’aka onye bụ́ mmụọ, (5) ndị bụ́ mmụọ, na (6) ike Chineke, ma ọ bụ mmụọ nsọ.—Ọp 35:21; Ọm 104:29; Mt 12:43; Lu 11:13.
-
Mmụọ nsọ.
-
Molek.
Ọ bụ chi ndị Amọn. O nwere ike ịbụ ya bụkwa Malkam, Milkọm, na Molọk. Ọ ga-abụ na e nweghị chi ezigbo aha ya bụ Molek, kama o nwere ike ịbụ na Molek bụ aha ndị Amọn na-etu chi ha. Iwu Mosis kwuru na a ga-egbu onye ọ bụla ji ụmụ ya chụọrọ Molek àjà.—Le 20:2; Jer 32:35; Ọrụ 7:43.
-
Molọk.—
Gụọ MOLEK.
-
Mọt-laben.
Ọ bụ okwu dị n’okwu mmeghe Abụ Ọma nke 9. O nwere ike ịbụ na ọ pụtara “gbasara ọnwụ nwa nwoke.” Ụfọdụ ndị kwuru na ọ bụ aha ụda a ma ama n’abụ a ma ọ bụkwanụ na ọ bụ okwu mmeghe ụda a ma ama n’abụ a.
-
Mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà.
-
Mpi; Opi.
Ọ bụ mpi anụmanụ. A na-eji ya agbanye mmanya, mmanụ, ink, na ihe ndị a na-ete n’ahụ́. E jikwa ya emere opi e ji ezi ndị mmadụ ozi ma ọ bụkwanụ opi a na-afụ ma a kụwa egwú. (1Sa 16:1, 13; 1Ez 1:39; Ezi 9:2) Ọtụtụ mgbe, a na-eji “mpi” ama atụ ike na mmeri.—Di 33:17; Maị 4:13; Zek 1:19.
N
-
Nad.
Nad bụ mmanụ na-adị oké ọnụ. Ọ na-esi ísì ọma, na-achakwa ọbara ọbara. A na-eji ahịhịa a na-akpọ spaịknad eme ya. Otú mmanụ a si adị oké ọnụ mere na ndị mmadụ na-agwa ya mmanụ na-abụghị ezigbo mmanụ mgbe ụfọdụ, nke mere e ji enwe nke na-abụghị nke ezigbo ya. Mak na Jọn kwuru na e tere Jizọs “ezigbo mmanụ nad.”—Mk 14:3; Jn 12:3.
-
Naịsan.
-
Nchegharị.
Na Baịbụl, nchegharị pụtara mmadụ ịgbanwe obi ya ma jiri obi ya niile kwaa ụta maka otú o si bie ndụ, ihe ọjọọ ndị o mere, ma ọ bụ maka ihe o kwesịrị ime ọ na-emeghị. Mmadụ chegharịa n’eziokwu, ọ na-emewe ihe dị mma, àgwà ya na-agbanwekwa.—Mt 3:8; Ọrụ 3:19; 2Pi 3:9.
-
Ndagwurugwu.
-
Ndị cherob.
Ha bụ ndị mmụọ ozi ọkwá ha gbagotere. Ọrụ ndị ha na-arụ pụrụ iche. Ha dị iche ná ndị seraf.—Je 3:24; Ọp 25:20; Aịz 37:16; Hib 9:5.
-
Ndị Farisii.
Ha bụ ndị isi n’okpukpe ndị Juu n’oge ndịozi Jizọs. Ha esighị n’ezinụlọ ndị nchụàjà, ma ha na-edebe Iwu Mosis ruo n’isi. Ha na-achọ ka ndị mmadụ na-edebe iwu ha a na-edeghị ede otú e si edebe Iwu Mosis. (Mt 23:23) Ha anaghị achọ iji anya ahụ ebe ndị mmadụ na-eme ihe ọ bụla gbasara omenala ndị Grik. Ebe ha bụ ndị ọkà n’ihe gbasara Iwu Mosis na omenala ndị Juu, ha na-atụrụ ndị mmadụ ihe ha ga-eme. (Mt 23:2-6) Ụfọdụ n’ime ha sokwa ná ndị Sanhedrin. Ha anaghị anabatakarị ihe Jizọs na-ekwu gbasara idebe Ụbọchị Izu Ike, ọdịnala, na iso ndị mmehie na ndị ọnaụtụ emekọ ihe. Ụfọdụ n’ime ha ghọrọ Ndị Kraịst. Otu n’ime ha bụ Sọl onye Tasọs.—Mt 9:11; 12:14; Mk 7:5; Lu 6:2; Ọrụ 26:5.
-
Ndị ikpe.
Ha bụ ụmụ nwoke Jehova họpụtara ka ha zọpụta ndị ya tupu ndị mmadụ achịwa n’Izrel.—Ikp 2:16.
-
Ndị Juu.
Ọ bụ aha a na-akpọ ndị si n’ebo Juda mgbe e merichara ebo iri nke Izrel. (2Ez 16:6) Mgbe ndị Izrel si Babịlọn lọta, a kpọwaziri ndị Izrel niile laghachiri Izrel “ndị Juu,” n’agbanyeghị ebo ha si. (Ezr 4:12) Mgbe e mechara, ọ bụzi aha ụwa niile na-akpọ ndị Izrel iji gosi na ha dị iche ná ndị Jentaịl. (Es 3:6) Pọl onyeozi jikwa okwu a mee ihe atụ mgbe ọ na-akọwa na ebe mmadụ si enweghị ihe ọ bụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst.—Ro 2:28, 29; Ga 3:28.
-
Ndị Kraịst.
Aha Chineke kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst.—Ọrụ 11:26; 26:28.
-
Ndị Midia; Midia.
Ha bụ ndị si n’agbụrụ nwa Jefet bụ́ Medaị. Ha bi ná mpaghara dị larịị n’ebe bụ́ ugwu ugwu n’obodo Ịran. Ọ bụ ebe ahụ mechara bụrụ obodo Midia. Ndị Midia sonyeere ndị Babịlọn merie ndị Asiria. N’oge ahụ, Peshia so n’obodo Midia na-achị. Ma Saịrọs nupụrụ isi, e wee jikọọ Midia na Peshia. Ha jikọrọ aka merie Alaeze Ukwu Babịlọn n’afọ 539 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ndị Midia so ná ndị bịara Jeruselem na Pentikọst afọ 33. (Da 5:28, 31; Ọrụ 2:9)—Gụọ B9.
-
Ndị mmụọ ozi.
E si n’okwu Hibru bụ́ mal·ʼakhʹ na okwu Grik bụ́ agʹge·los nweta okwu a. Nke ọ bụla n’ime okwu ndị a pụtara “onye ozi.” Ma a na-asụgharị ya “mmụọ ozi” mgbe ọ bụla a na-ekwu gbasara ndị mmụọ na-ejere Chineke ozi. (Je 16:7; 32:3; Jes 2:25; Mkp 22:8) Ndị mmụọ ozi bụ ndị mmụọ siri ike Chineke kere ogologo oge tupu ya ekee mmadụ. Na Baịbụl, a kpọkwara ha “ọtụtụ iri puku ndị nsọ,” “ụmụ Chineke,” na “kpakpando ụtụtụ.” (Di 33:2, ihe e dere n’ala ala peeji ya; Job 1:6; 38:7) E keghị ha ka ha na-amụ ibe ha, kama e kere ha otu otu. Ha ruru ihe karịrị otu narị nde. (Da 7:10) Ihe Baịbụl kwuru gosiri na nke ọ bụla n’ime ha nwere aha nke ya, nweekwa àgwà e ji mara ya. Ma ha dị umeala n’obi. N’ihi ya, ha anaghị ekwe ka e fee ha. Ọtụtụ n’ime ha ekweghị ekwu aha ha. (Je 32:29; Lu 1:26; Mkp 22:8, 9) Ha nwere ọkwá dị iche iche, e nyekwara ha ọrụ dị iche iche ha na-arụ. Ụfọdụ n’ime ọrụ ndị ahụ bụ ije ozi n’ihu ocheeze Jehova, izi ozi e dunyere ha, ịgbachitere ndị ohu Jehova nọ n’ụwa, imezu ihe Chineke kpebiri, na ịkwado ọrụ ikwusa ozi ọma. (2Ez 19:35; Ọm 34:7; Lu 1:30, 31; Mkp 5:11; 14:6) N’ọdịnihu, ha ga-eso Jizọs lụọ agha Amagedọn.—Mkp 19:14, 15.
-
Ndị mmụọ ọjọọ.
Ha bụ ndị mmụọ a na-anaghị ahụ anya. Ha bụ ndị ọjọọ, ike ha karịkwara nke mmadụ. A kpọrọ ha “ụmụ ezi Chineke” na Jenesis 6:2 nakwa “ndị mmụọ ozi” na Jud 6 maka na ha abụghị ndị ọjọọ mgbe e kere ha, kama ha bụ ndị mmụọ ozi ndị ji aka ha mee onwe ha ndị iro Chineke. Ha nupụụrụ Chineke isi n’oge Noa ma soro Setan na-ama Chineke aka.—Di 32:17; Lu 8:30; Ọrụ 16:16; Jes 2:19.
-
Ndị na-enyere ndị ikpe aka.
Mgbe ndị Babịlọn na-achị, e nwere ndị na-enyere ndị ikpe aka n’ógbè dị iche iche. Ha ma iwu obodo, ha na-ekpekwa ikpe ụfọdụ. N’ebe ndị Rom chịrị, ọ bụ ndị na-enyere ndị ikpe aka na-anọchi anya ndị ọchịchị. Ọrụ ha bụ ime ka ihe na-aga aga n’obodo, ikpebi ihe e ji ego gọọmenti eme, ikpe ndị dara iwu ikpe, na inye iwu ka a taa mmadụ ahụhụ.—Ezr 7:25; Da 3:2.
-
Ndị Nche Eze Rom.
Ha bụ otu ìgwè ndị agha Rom a họpụtara ka ha na-eche eze ukwu ndị Rom nche. Ndị nche a mechara bụrụ ndị e ji akwatu ọchịchị ma ọ bụ ndị e ji eme ka ọchịchị sie ike.—Fil 1:13.
-
Ndị Nefilim.
Ha bụ ndị gbara ajọ dimkpa, bụrụkwa ndị tigbuo zọgbuo. Ọ bụ ndị mmụọ ozi bịara n’ụwa ghọọ mmadụ na ụmụ nwaanyị ha lụrụ mụtara ha tupu e nwee Iju Mmiri.—Je 6:4.
-
Ndị Netinim.
Ha abụghị ndị Izrel, ma, ha na-eje ozi n’ụlọ nsọ. Ihe Netinim pụtara na Hibru bụ “Ndị E Nyere n’Onyinye.” Aha a na-egosi na e ji ha nye onyinye ka ha na-eje ozi n’ụlọ nsọ. Ọ ga-abụ na ọtụtụ ndị Netinim si n’ezinụlọ ndị Gibiọn, ndị Joshụa họpụtara ka ha “na-akpata nkụ, na-esetakwa mmiri maka ndị Izrel niile nakwa maka ebe ịchụàjà Jehova.”—Jos 9:23, 27; 1Ih 9:2; Ezr 8:17.
-
Ndị òtù Epikurọs.
Ha bụ ndị na-eso ụzọ otu ọkachamara aha ya bụ Epikurọs. Epikurọs bụ onye Grik (ọ dịrị ndụ n’agbata afọ 341 na afọ 270 Tupu Oge Ndị Kraịst). Isi ihe ha kweere bụ na ọ bụ ikpori ndụ bụ ihe kacha mkpa ná ndụ.—Ọrụ 17:18.
-
Ndị òtù Herọd.
Ndị a bụ ụmụ amaala Juu ndị nọ n’òtù na-akwado mba ha nakwa ọchịchị ndị eze si n’ezinụlọ Herọd. N’oge ahụ, ọ bụ ndị Rom na-achị ndị Juu. Ụfọdụ ndị Sadusii so n’òtù a. Ndị òtù Herọd so ndị Farisii gbaa izu otú ha ga-esi egbu Jizọs.—Mk 3:6.
-
Ndị òtù Stoik.
Ha bụ ndị Grik bụ́ ndị ọkachamara. Ndị a kweere na mmadụ ga na-enwe obi ụtọ ma ọ na-ebi ndụ ka onye nwere ọgụgụ isi, na-ewerekwa ụwa ya otú o si hụ ya. Ha chere na onye ma ihe n’eziokwu bụ onye ihe ọ bụla na-anaghị enye nsogbu n’obi nakwa onye ikpori ndụ na-anaghị amasị.—Ọrụ 17:18.
-
Ndị Sadusii.
Ha bụ ndị isi n’okpukpe ndị Juu. Ha na-abụkarị ndị ọgaranya na ndị oké ozu nakwa ndị nchụàjà na-atụ ihe na-eme n’ụlọ nsọ. Ha anaghị edebe ọtụtụ iwu a na-edeghị ede ndị Farisii na-edebe. Ihe ha kweere dịkwa iche n’ihe ndị Farisii kweere. Ha ekweghị na a na-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ nakwa na ndị mmụọ ozi dị. Ha ejighị anya ahụ Jizọs.—Mt 16:1; Ọrụ 23:8.
-
Ndị Sameria.
Ọ bụ ndị Izrel nọ n’alaeze ebo iri nke dị n’ebe ugwu Izrel bụ ndị mbụ zawara ndị Sameria. Ma, mgbe ndị Asiria merichara ha n’afọ 740 Tupu Oge Ndị Kraịst, ndị mba ọzọ ndị Asiria kpọtara ebe ahụ sozi zawa ndị Sameria. N’oge Jizọs nọ n’ụwa, e kwuwe okwu kpọta ndị Sameria aha, ihe na-agbata mmadụ n’uche abụghị otu agbụrụ ma ọ bụ obodo nwere ndị na-achị ya, kama, ọ na-abụkarị ndị na-ekpe otu okpukpe bi ná mpaghara Sameria na Shikem oge ochie. Ụfọdụ ihe ndị okpukpe a kweere dị nnọọ ezigbo iche n’ihe ndị okpukpe ndị Juu kweere.—Jn 8:48.
-
Ndị seraf.
-
Ndụdụ e ji achị anụ.
Ọ bụ ogologo osisi ndị ọrụ ugbo ji achị anụ. Ọnụ ya na-abụ ígwè pịrị ọnụ. E ji ndụdụ a tụnyere okwu onye ma ihe nke na-eme ka ndị na-ege ya ntị nabata ezigbo ndụmọdụ o nyere ha. N’oge ụfọdụ, ehi ndị na-eme isi ike na-agba ndụdụ e ji achị ha ụkwụ iji gosi na ha achọghị ime ihe onye na-achị ha chọrọ ka ha mee. Ime otú ahụ na-eme ka ehi ahụ merụọ onwe ya ahụ́. Ọ bụ otú a ka e si nweta okwu bụ́ ‘ịgba ndụdụ e ji achị anụ ụkwụ.’—Ọrụ 26:14, ihe e dere n’ala ala peeji ya; Ikp 3:31.
-
Nihilọt.
Okwu a dị n’okwu mmeghe Abụ Ọma nke ise. Ihe ọ pụtara edochaghị anya. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ ngwá egwú a na-afụ afụ nakwa na ọ bụ nwanne okwu Hibru e si sụgharịta ọjà (cha·lilʹ). Ma, ọ ga-abụ na Nihilọt bụ abụ dị ụtọ.
-
Nkume e ji egwe nri.
Ọ bụ nkume dị okirikiri a na-adọkwasị n’elu nkume ọzọ yiri ya, jiri ya gwee ọka ka ọ ghọọ ntụ ọka. A na-akụnye osisi n’etiti nkume nke dị n’okpuru ka nkume nke dị n’elu nwee ike ịna-atụgharị atụgharị. N’oge a na-ede Baịbụl, ụmụ nwaanyị na-ejikarị nkume e ji egwe nri ndị nke a na-eji n’aka egwe nri n’ụlọ ha. Ebe ọ bụ na nkume a bụ ihe ezinụlọ ọ bụla ji akwadebe ihe ha na-eri kwa ụbọchị, Iwu Mosis kwuru na mmadụ ekwesịghị iburu nkume onye o binyere ego ji egwe nri ka ọ bụrụ ihe ibé. E nwekwara nnukwu nkume ndị e ji egwe nri. Ọ bụ anụmanụ na-akwagharị ha.—Di 24:6; Mk 9:42.
-
Nkume ji ụlọ.
Ọ bụ nkume a na-egwunye n’isi isi ụlọ, n’ebe ahụ́ ụlọ abụọ bịakọtara ọnụ. Ọ bụ nkume a na-ejikọta ahụ́ ụlọ abụọ ahụ. Nkume kacha mkpa n’ime nkume niile ji ụlọ bụ nke a na-egwunye na ntọala ụlọ. A rụwa ụlọ ọhaneze ma ọ bụ mgbidi obodo, ọ bụ nkume siri ezigbo ike ka a na-ahọrọkarị ka ọ bụrụ nkume ji ụlọ. E ji okwu ahụ mee ihe atụ otú e si tọọ ntọala ụwa. E ji ọgbakọ Ndị Kraịst tụnyere ụlọ, kwuzie na Jizọs bụ “nkume ji ụlọ e ji tọọ ntọala” ọgbakọ ahụ.—Efe 2:20; Job 38:6.
-
Nkwa.
-
Nnukwu onye nchụàjà.
N’Iwu Mosis, ọ bụ onye nchụàjà a na-anọchite anya ndị mmadụ n’ihu Chineke. Ọ bụkwa ya na-elekọta ọrụ ndị nchụàjà ndị ọzọ na-arụ. A na-akpọkwa ya “onyeisi nchụàjà.” (2Ih 26:20; Ezr 7:5) Ọ bụ naanị ya ka a na-ekwe ka ọ banye n’Ebe Kacha Nsọ, ya bụ, n’ime ime ụlọikwuu nakwa n’ime ime ụlọ nsọ. Ọ bụ naanị n’Ụbọchị Ikpuchi Mmehie ka ọ na-abanye n’ebe ahụ. A kpọkwara Jizọs Kraịst “nnukwu onye nchụàjà.”—Le 16:2, 17; 21:10; Mt. 26:3; Hib. 4:14.
-
Nnukwu Onye Ndú.
E ji okwu a akọwa nnukwu ọrụ Jizọs Kraịst na-arụ n’ịnapụta ndị na-erubere Chineke isi n’aka mmehie nke na-akpa ha aka ọjọọ nakwa ọrụ ọ na-arụ iji mee ka ha nweta ndụ ebighị ebi.—Ọrụ 3:15; 5:31; Hib 2:10; 12:2.
-
Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị.
Ọ bụ nri e ji echeta ọnwụ Jizọs. Ọ bụ achịcha na-ekoghị eko nke nọchiri anya ahụ́ Kraịst na mmanya nke nọchiri anya ọbara ya ka e ji eme ya. Ebe ọ bụ na Akwụkwọ Nsọ gwara Ndị Kraịst ka ha na-eme ya iji cheta ọnwụ Jizọs, ọ dabara adaba na a na-akpọ ya “Ncheta Ọnwụ Jizọs.”—1Kọ 11:20, 23-26.
-
Nsọ; Ịdị nsọ.
Onye dị nsọ bụ onye omume ya dị ọcha nakwa onye na-enweghị ntụpọ ọ bụla. Ọ bụ Jehova kacha dị nsọ. (Ọp 28:36; 1Sa 2:2; Ilu 9:10; Aịz 6:3) N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, e kwuo na mmadụ (Ọp 19:6; 2Ez 4:9), anụmanụ (Ọg 18:17), ihe (Ọp 28:38; 30:25; Le 27:14), ebe (Ọp 3:5; Aịz 27:13), oge (Ọp 16:23; Le 25:12), ma ọ bụ ọrụ (Ọp 36:4) dị nsọ, ihe ọ pụtara bụ na onye ahụ ma ọ bụ ihe ahụ pụrụ iche ma ọ bụ na e kewapụrụ ya iche ma ọ bụkwanụ na e wepụtara ya maka Chineke onye dị nsọ, ya bụ, na e wepụtara ya maka ozi Jehova. N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, “nsọ” na “ịdị nsọ” pụtakwara iwepụta ihe iche maka Chineke. E jikwa okwu ndị a egosi na àgwà mmadụ dị ọcha.—Mk 6:20; 2Kọ 7:1; 1Pi 1:15, 16.
-
Ntụ ọbụ aka.
-
Nzukọ.
NW
-
Nwa Devid.
-
Nwa e bu ụzọ mụọ.
-
Nwa nke mmadụ.
E dere ya ihe dị ka ugboro iri asatọ n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn. Ọ bụ Jizọs Kraịst ka a na-akpọ ya. Ọ na-egosi na ọ bụghị mmụọ nke gbanwere ghọọ mmadụ, kama na mmadụ mụrụ ya ya abụrụ mmadụ nkịtị. Aha a na-egosikwa na Jizọs ga-emezu amụma dị na Daniel 7:13, 14. N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, a kpọrọ Ezikiel na Daniel aha a iji gosi na hanwa, bụ́ ndị mmadụ nkịtị, dị iche na Chineke, bụ́ onye ziri ha ozi.—Ezi 3:17; Da 8:17; Mt 19:28; 20:28.
O
-
Obodo Devid.
Ọ bụ aha a na-akpọ obodo Jebus mgbe Devid merichara ya ma rụọ obí ya n’ebe ahụ. A na-akpọkwa ya Zayọn. Ọ dị n’ebe ndịda Jeruselem, ọ bụkwa ebe kacha ochie n’obodo ahụ.—2Sa 5:7; 1Ih 11:4, 5.
-
Obodo mgbaba.
Ọ bụ obodo ndị Livaị, ebe onye gburu mmadụ n’amaghị ụma na-agbaga ka onye na-abọrọ onye nwụrụ anwụ ọbọ ghara igbu ya. Obodo ndị ahụ dị isii. Ha dị n’akụkụ niile nke Ala Nkwa ahụ. Mosis họtara ụfọdụ n’ime ha, Joshụa mechakwara họta ụfọdụ. Ọ bụ Jehova gwara ha ka ha họta obodo ndị ahụ. Onye gburu mmadụ gbarute n’obodo mgbaba, ọ na-anọ n’ọnụ ụzọ ámá gwa ndị okenye obodo ahụ ihe merenụ, ha anabata ya nke ọma. A ga-ekpe onye ahụ gburu mmadụ ikpe n’obodo ọ nọ gbuo mmadụ ka e wee mata ma aka ya ọ̀ dị ọcha ka ọ̀ bụ na ọ dịghị. Ihe a ga-eme ka a ghara ichebe ndị kpachaara anya gbuo mmadụ ma ọ bụrụ na ha agbaga n’obodo mgbaba. Ọ bụrụ na aka onye ahụ gburu mmadụ dị ọcha, a ga-akpọghachi ya n’obodo mgbaba ahụ ọ gbagara. Ọ ga-ebikwa n’ebe ahụ ndụ ya niile ma ọ bụ ruo mgbe nnukwu onye nchụàjà nwụrụ.—Ọg 35:6, 11-15, 22-29; Jos 20:2-8.
-
Oche ikpe.
Ọ na-abụkarị ebe a rụlitere elu n’èzí, ọ na-enwekwa steepụ. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ndị na-ekpe ikpe na-anọ agwa ndị mmadụ okwu ma kwuo ihe ha kpebiri n’ikpe. E kwuru gbasara “oche ikpe Chineke” na “oche ikpe Kraịst” na Baịbụl. Ha abụọ nọchiri anya ndokwa Jehova mere ikpe ndị mmadụ ikpe.—Ro 14:10; 2Kọ 5:10; Jn 19:13.
-
Odeakwụkwọ.
Ọ bụ aka ochie n’idepụta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ndị odeakwụkwọ bụ otu ìgwè ụmụ nwoke ma Iwu Mosis nke ọma. Ha anaghị eji anya ahụ Jizọs.—Ezr 7:6; Mk 12:38, 39; 14:1.
-
Oge a.
Ọ bụ ihe a na-asụgharị okwu Grik bụ́ ai·onʹ ma ọ bụrụ na ihe ọ pụtara bụ otú ihe si aga n’otu oge ma ọ bụ ihe ndị na-eme n’otu oge nke mere ka oge ahụ dị iche n’oge ndị ọzọ ma ọ bụ n’ọgbọ ndị ọzọ. Baịbụl kwuru gbasara “ụwa a” ma ọ bụ oge a mgbe ọ na-ekwu otú ihe si aga n’ụwa nakwa otú ndị bi n’ụwa si ebi ndụ. (2Ti 4:10) Chineke malitere otu oge pụrụ iche mgbe ya na ndị Izrel ji Iwu Mosis gbaa ndụ. Ụfọdụ nwere ike ịkpọ oge ahụ oge ndị Izrel, ma ọ bụ oge ndị Juu. Mgbe Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà, Chineke si n’aka ya malite otu oge ọzọ dị iche. Ndị o ji malite ya bụ ọgbakọ ndị nọ na ya bụ Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Otú a ka oge ọhụrụ si malite, ọ bụkwa n’oge a ka ihe ọgbụgba ndụ ahụ e ji Iwu Mosis gbaa nọchiri anya ya bịara doo anya. Mgbe ụfọdụ, okwu a na-egosi oge dị iche iche, ma ọ bụ otú ihe dị iche iche si gaa n’oge gara aga ma ọ bụ otú ha ga-esi aga n’ọdịnihu.—Mt 24:3; Mk 4:19; Ro 12:2; 1Kọ 10:11.
-
Oge ikpeazụ.
E kwuru gbasara oge ikpeazụ n’amụma ụfọdụ e buru na Baịbụl. Ọ bụ oge ga-agafe ma ọ bụ ihe ndị ga-eme tupu ihe nke ikpeazụ n’amụma e buru emezuo. (Ezi 38:16; Da 10:14; Ọrụ 2:17) N’amụma ụfọdụ, oge ikpeazụ nwere ike ịbụ afọ ole na ole. N’amụma ndị ọzọ, o nwere ike ịbụ ọtụtụ afọ. Oge ikpeazụ kacha mkpa Baịbụl kwuru okwu ya bụ “oge ikpeazụ” nke oge a, ya bụ, oge ọnụnọ Jizọs.—2Ti 3:1; Jes 5:3; 2Pi 3:3.
-
Ogidi.
Ọ bụ ihe guzo kwem a rụrụ ka o jide ụlọ. E nwere ndị nke a na-arụ ka e jiri ha na-echeta nnukwu ihe mere n’obodo. E nwere ogidi ndị dị n’ụlọ nsọ, nweekwa ndị Solomọn rụrụ mgbe ọ na-arụ obí ya. Ndị na-ekpere arụsị na-arụ ogidi arụsị ha na-efe. E nwekwara oge dị iche iche ndị Izrel mere ụdị ihe a.—Ikp 16:29; 1Ez 7:21; 14:23.
-
Ogidi arụsị.
Ọ bụ ogidi kwụ ọtọ. Ọ na-abụkarị okwute ka e ji arụ ya, ọ na-eyikwa ihe mmadụ ji bụrụ nwoke. Ọ na-anọchi anya Bel ma ọ bụ chi ụgha ọ bụla ọzọ.—Ọp 23:24.
-
Ogige.
Ọ bụ mbara èzí a gbara ogige n’ebe a mara ụlọikwuu. O mechakwara bụrụ ihe a na-akpọ mbara èzí e ji mgbidi gbachie n’ụlọ nsọ. Ọ bụ n’ogige ụlọikwuu nakwa n’ogige dị n’ime n’ụlọ nsọ ka ebe ịchụàjà nke àjà a na-esu ọkụ dị. (Gụọ B5, B8, B11.) Baịbụl kwukwara gbasara ogige ndị e nwere n’ụlọ ndị mmadụ nakwa n’obí ndị eze dị iche iche.—Ọp 8:13; 27:9; 1Ez 7:12; Es 4:11; Mt 26:3.
-
Ogwe osisi arụsị.
Okwu Hibru bụ́ (ʼashe·rahʹ ) pụtara (1) ogwe osisi arụsị nke nọchiri anya chi Ashera ndị Kenan na-efe, nke ha sịrị na ọ bụ chi ọmụmụ, ma ọ bụ (2) ogwe osisi a tụrụ Ashera na ya. O nwere ike bụrụ osisi a na-apịghị apị ma ọ bụdị osisi dị ndụ.—Di 16:21; Ikp 6:26; 1Ez 15:13.
-
Ohu na-eje ozi.
Ọ bụ otú e si sụgharịa okwu Grik bụ́ di·aʹko·nos. A na-asụgharịkarị ya “onye na-eje ozi” ma ọ bụ “ohu.” “Ohu na-eje ozi” bụ onye na-enyere ndị okenye aka n’ọgbakọ. Mmadụ ga-abụrịrị ụdị onye Baịbụl kwuru ohu na-eje ozi kwesịrị ịbụ tupu a họpụta ya.—1Ti 3:8-10, 12.
-
Oké mkpagbu.
Okwu Grik a sụgharịrị “mkpagbu” pụtara ahụhụ mmadụ na-ata n’ihi nsogbu ndị na-abịara ya. Jizọs kwuru banyere “oké mkpagbu” a ga-enwe na Jeruselem, nke a na-enwetụbeghị ụdị ya. O kwukwara banyere nke a ga-enwe n’ụwa niile mgbe ọ ga-abịa ‘n’ebube dị ukwuu’ n’ọdịnihu. (Mt 24:21, 29-31) Pọl kọwara na oké mkpagbu a bụ ihe kwesịrị ekwesị Chineke ga-eji laa “ndị na-amaghị Chineke na ndị na-anaghị erube isi n’ozi ọma” banyere Jizọs Kraịst n’iyi. Mkpughe isi 19 gosiri na ọ bụ Jizọs ga-edu ndị agha nọ n’eluigwe gaa lụso “anụ ọhịa ahụ na ndị eze ụwa na ụsụụ ndị agha ha” agha. (2Te 1:6-8; Mkp 19:11-21) Akwụkwọ Mkpughe kwuru na a ga-azọpụta “oké ìgwè mmadụ” n’oké mkpagbu ahụ. (Mkp 7:9, 14)—Gụọ AMAGEDỌN.
-
Okenye.
Ọ bụ dimkpa nwoke. Ma n’Akwụkwọ Nsọ, okenye bụ onye e nyere ikike ilekọta ndị ọzọ n’obodo ma ọ bụ onye nwere ọrụ dị mkpa ọ na-arụ n’obodo. N’akwụkwọ Mkpughe, e nwere ndị nọ n’eluigwe a kpọrọ “ndị okenye.” A na-asụgharị okwu Grik bụ́ pre·sbyʹte·ros “okenye” ma ọ bụrụ na a na-ekwu banyere onye ma ọ bụ ndị na-elekọta ọgbakọ Ndị Kraịst.—Ọp 4:29; Ilu 31:23; 1Ti 5:17; Mkp 4:4.
-
Okporo ahịhịa amị e ji atụ̀ ihe.
Ọ na-adị kubit isii n’ogologo. E jiri kubit ọtụtụ ndị ji atụ̀ ihe tụọ ya, ọ na-adị mita 2.67 (amaụkwụ 8.75). E jiri kubit dị ogologo tụọ ya, ọ na-adị mita 3.11 (amaụkwụ 10.2). (Ezi 40:3, 5; Mkp 11:1)—Gụọ B14.
-
Okwuchi igbe ahụ.
Ọ bụ okwuchi igbe ọgbụgba ndụ. N’Ụbọchị Ikpuchi Mmehie, nnukwu onye nchụàjà na-efesa ọbara anụ e ji chụọ àjà n’ihu igbe ahụ. Okwu Hibru e si na ya sụgharịa okwuchi igbe pụtara “ikpuchi (mmehie)” ma ọ bụkwanụ “ihichapụ (mmehie).” E ji ọlaedo rụọ okwuchi igbe a. A kpụkwara ndị cherob abụọ n’elu ya, otu n’otu akụkụ, otu n’akụkụ nke ọzọ. (Ọp 25:17-22; 1Ih 28:11; Hib 9:5)—Gụọ B5.
-
Okwu mmeghe.
Ọ bụ ihe a na-ede ná mmalite abụ ndị dị n’akwụkwọ Abụ Ọma. Ọ na-ekwu onye dere abụ ahụ ma ọ bụ ihe mere mgbe e dere ya. Ọ na-ekwukwa otú a ga-esi abụ abụ ahụ, ihe a ga-eji abụ ahụ eme, ma ọ bụkwanụ ihe mere e ji bụọ ya. Na Baịbụl a, e dee amaokwu nke “0,” ihe a na-ekwu bụ okwu mmeghe. Dị ka ihe atụ, e dee “Abụ Ọma 3:0,” ọ bụ okwu mmeghe Abụ Ọma nke Atọ ka a na-ekwu.—Gụọ okwu mmeghe Abụ Ọma nke 3, 4, 5, 6, 7, 30, 38, 60, 92, 102.
-
Oma.
Ọ bụ ihe e ji atụ̀ ihe dị gharị gharị. Otu oma bụ lita 2.2. E kee otu efa ụzọ iri, otu ụzọ ya bụ otu oma. (Ọp 16:16, 18)—Gụọ B14.
-
Onye amụma.
-
Onye a tọghatara atọghata.
-
Onye Hibru; Ndị Hibru.
Ọ bụ Ebram (ya bụ, Ebreham) bụ onye mbụ a kpọrọ onye Hibru iji gosi na ọ dị iche ná ndị Amọraịt bụ́ ndị agbata obi ya. A kpọrọ ndị Jekọb, nwa nwa Ebreham, mụrụ ndị Hibru. A na-akpọkwa asụsụ ha sụrụ asụsụ Hibru. N’oge Jizọs nọ n’ụwa, e nweela ọtụtụ okwu Arameik e tinyere n’asụsụ Hibru. Ọ bụ asụsụ Hibru ka Kraịst na ndị na-eso ụzọ ya sụrụ.—Je 14:13; Ọp 5:3; Ọrụ 26:14.
-
Onyeisi nchụàjà.
Ọ bụ aha ọzọ a na-akpọ “nnukwu onye nchụàjà” n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ọ bụ ụmụ nwoke ndị nọ n’isi n’ọrụ nchụàjà 2Ih 26:20; Ezr 7:5; Mt 2:4; Mk 8:31.
ka a kpọrọ “ndị isi nchụàjà.” Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịbụ nnukwu ndị nchụàjà a chụturu n’ọkwá ma ọ bụ ndị isi ìgwè ndị nchụàjà iri abụọ na anọ na-arụ ọrụ n’ụlọ nsọ.— -
Onyeisi ndị mmụọ ozi.
-
Onye ji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.
-
Onye na-ajụ ndị mmụọ ase.
Ọ bụ onye na-ekwu na ya na ndị nwụrụ anwụ na-ekwu okwu.—Le 20:27; Di 18:10-12; 2Ez 21:6.
-
Onye na-akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu.
-
Onye na-eduzi abụ.
Otú e si dee okwu Hibru e si na ya sụgharịa okwu a n’Abụ Ọma yiri ka ọ̀ na-egosi na ọ pụtara onye na-ahazi abụ, onye na-eduzi otú a ga-esi bụọ abụ, na onye na-akụziri ndị Livaị abụ. Ọ bụkwa onye a na-eduzi abụ ma e mewe ihe n’obodo. Baịbụl ndị ọzọ sụgharịrị okwu a “onyeisi abụ” ma ọ bụ “onyeisi egwú.”—Ọm 4:0; 5:0 (Okwu Mmeghe).
-
Onye na-emegide Kraịst.
Okwu Grik a sụgharịrị onye na-emegide Kraịst pụtara ụzọ ihe abụọ. Ọ pụtara onye na-ama Kraịst aka. O nwekwara ike ịpụta Kraịst ụgha, onye chọrọ ịnọchi Kraịst. Ọ bụrụ na e nwere òtù ma ọ bụ ìgwè mmadụ ma ọ bụ ndị ji aghụghọ na-asị na ha na-anọchi anya Kraịst ma ọ bụkwanụ na ha bụ Mezaya ma ọ bụkwanụ na-ama Kraịst aka ma na-enye ndị na-eso ụzọ ya nsogbu, e nwere ike ikwu na ha bụ ndị na-emegide Kraịst.—1Jn 2:22.
-
Onye Nazaret.
Ihe a bụ aha a na-akpọ Jizọs maka na obodo ya bụ Nazaret. Ọ ga-abụ na okwu a bụ nwanne okwu Hibru e si sụgharịta “ome” nke dị n’Aịzaya 11:1. E mechara kpọwa ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị Nazaret.—Mt 2:23; Ọrụ 24:5.
-
Onye Naziraịt.
Okwu Hibru e si sụgharịta okwu a pụtara “Onye E Wepụtara Iche,” “Onye E Nyefere Chineke.” E nwere ụdị ndị Naziraịt abụọ. Nke mbụ bụ ndị ji aka ha wepụta onwe ha ịbụ ndị Naziraịt. Nke abụọ abụrụ ndị Chineke họọrọ ka ha bụrụ ndị Naziraịt. Nwoke ma ọ bụ nwaanyị nwere ike ikwe Jehova nkwa na ya ga-abụ onye Naziraịt ruo oge o kpebiri. Onye kwere ụdị nkwa a nwere ihe atọ ọ na-agaghị eme. Ọ gaghị na-aṅụ mmanya ọ bụla na-aba n’anya ma ọ bụ rie ihe ọ bụla e ji mkpụrụ vaịn mee. Ọ gaghị na-akpụ isi ya. Ọ gaghịkwa emetụ ozu mmadụ aka. Ndị Chineke họọrọ ka ha bụrụ ndị Naziraịt ga-abụ ya ruo mgbe ha ga-anwụ. Ọ bụkwa Jehova na-ekwu ihe ndị ha ga na-eme na ihe ndị ha na-agaghị na-eme.—Ọg 6:2-7; Ikp 13:5.
-
Onye nche.
Ọ bụ onye na-eche ndị mmadụ ma ọ bụ ngwongwo nche ka aka ghara ịkpa ha, karịchaa n’abalị. Ọ na-emekwa ka ndị ọ na-eche nche mara ma e nwee nsogbu ọ hụrụ na-abịanụ. Ndị nche na-anọkarị n’elu mgbidi obodo nakwa n’ụlọ nche ka ha nwee ike ịhụ ndị na-abịa ebe ha na-eche nche tupu ndị ahụ erute nso. E jikwa ndị amụma dị iche iche e nwere n’Izrel tụnyere ndị nche n’ihi na ha na-agwa ndị Izrel gbasara mbibi a ga-ebibi ha.—2Ez 9:20; Ezi 3:17.
-
Onye nchụàjà.
Ọ bụ nwoke na-anọchite anya Chineke. Ọ na-akụziri ndị ọ na-achụ àjà maka ha gbasara Chineke na iwu ya. Ndị nchụàjà na-anọchitekwa anya ndị mmadụ, na-achụrụ Chineke àjà maka ha, na-arịọkwa ya ka ọ gbaghara ha. Tupu e nye Iwu Mosis, ọ bụ onyeisi ezinụlọ na-achụ àjà maka ndị ezinụlọ ya. Mgbe a malitere idebe Iwu Mosis, ndị nchụàjà e nwere bụ ụmụ nwoke ndị si n’ezinụlọ Erọn, n’ebo Livaị. Ụmụ nwoke ndị ọzọ si n’ebo Livaị na-enyere ha aka. N’ọgbụgba ndụ ọhụrụ, Izrel nke Chineke ghọrọ ndị nchụàjà, ebe Jizọs Kraịst bụ Nnukwu Onye Nchụàjà.—Ọp 28:41; Hib 9:24; Mkp 5:10.
-
Onye Nlekọta.
Nwoke ọrụ ya bụ ilekọta na ịzụ ọgbakọ ka atụrụ. Ebe e si nweta okwu a bụ n’okwu Grik bụ́ e·piʹsko·pos, nke pụtara ilekọta ihe otú aka na-agaghị akpa ya. N’ọgbakọ Ndị Kraịst, onye bụ́ “okenye” (pre·sbyʹte·ros) bụkwa “onye nlekọta.” A sị na mmadụ bụ “okenye,” ọ pụtara na onye ahụ na-akpa àgwà ndị e ji mara onye tozuru etozu, nke mere e ji họpụta ya. A sị na mmadụ bụ “onye nlekọta,” ọ na-egosi ọrụ e ji maka ya họpụta ya.—Ọrụ 20:28; 1Ti 3:2-7; 1Pi 5:2.
-
Onye nweere onwe ya; Onye e mere ka o nwere onwe ya.
N’oge ndị Rom na-achị ụwa, a na-akpọ nwa amaala Rom na-abụghị 1Kọ 7:22.
ohu “onye nweere onwe ya.” Ọ na-enwetakwa ihe niile ụmụ amaala kwesịrị inweta. Ma a na-akpọ ohu e mechara tọhapụ “onye e mere ka o nwere onwe ya.” Ọ bụrụ na e mee ka ndị ọchịchị Rom mara na a tọhapụla ohu, onye ahụ bụ́bu ohu na-aghọ nwa afọ Rom nweere onwe ya, ma a naghị enye ya ọkwá n’ọchịchị. Ọ bụrụkwanụ na e meghị ka ndị ọchịchị Rom mara na a tọhapụla ohu, onye ahụ bụ́bu ohu ga-akwụsị ịgba ohu, ma ọ gaghị enweta ihe ndị ruuru ụmụ amaala Rom.— -
Onye ogbugbo.
-
Onyeozi.
Isi ihe onyeozi pụtara bụ “onye e dunyere ozi.” A kpọrọ Jizọs onyeozi, ọ bụkwa ihe a kpọrọ ụfọdụ ndị ọzọ e dunyere ka ha jeere ndị ọzọ ozi. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ Jizọs, ndị o ji aka ya họpụta ka ha bụrụ ndị na-anọchi anya ya, ka a kpọrọ “ndịozi.”—Mk 3:14; Ọrụ 14:14; Hib. 3:1.
-
Onye ọhụ ụzọ.
Ọ bụ onye Chineke na-akọrọ uche ya otú ọ ga-aghọta ya, onye na-ahụ ma ọ bụ ghọta ihe ndị ọzọ na-agaghị ahụli ma ọ bụ ghọta. Okwu Hibru e si nweta okwu a pụtara “ịhụ ụzọ.” O nwere ike bụrụ ịhụ ụzọ nkịtị ma ọ bụkwanụ ya abụrụ nke nwere ihe ọ nọchiri anya ya. Ndị mmadụ nwee nsogbu, ha na-agakwuru onye ọhụ ụzọ ka ọ gwa ha ihe bara uru ha ga-eme gbasara ya.—1Sa 9:9.
-
Onyinye ebere.
Ọ bụ onyinye a na-enye onye nọ ná mkpa. A kpọghị “onyinye ebere” aha kpọmkwem n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, ma Iwu Mosis gwara ndị Izrel ihe ndị ha kwesịrị ịna-emere ndị ogbenye.—Mt 6:2.
-
Opi.
Ọ bụ ngwá egwú a na-afụ afụ e ji ígwè rụọ. A na-eji ya ezi ozi, na-ejikwa ya agụ egwú. N’Ọnụ Ọgụgụ 10:2, Jehova gwara Mosis ka o jiri ọlaọcha rụọ opi abụọ ọ ga-eji na-agwa ndị Izrel mgbe dị iche iche ha ga-ezukọta, mgbe ha ga-akwali, ma ọ bụ mgbe a ga-ama ọkwa na agha esula. Ọ ga-abụ ụdị opi nke na-adị ogologo ka Mosis rụrụ, ọ bụghị ụdị nke na-arọji arọji a na-eji mpi anụmanụ eme. Opi sokwa ná ngwá egwú ndị na-adị n’ụlọ nsọ, ma e kwughị otú e si rụọ ha. A na-ekwukarị na a fụrụ opi tupu Jehova ekwuo ihe o kpebiri ime ma ọ bụ tupu ya emee ihe ọzọ gbara ọkpụrụkpụ. Ma, ịfụ opi a nwere ihe ọ na-anọchi anya ya.—2Ih 29:26; Ezr 3:10; 1Kọ 15:52; Mkp 8:7–11:15.
-
Osisi a na-akwụwa mmadụ.
Ọ bụ osisi guzo kwem a na-akwụwa mmadụ. Ụfọdụ obodo na-akwụwa mmadụ n’osisi, ya anọrọ na ya nwụọ ma ọ bụkwanụ, ha gbuchaa onye ahụ, ha akwụwa ozu ya n’osisi ka ndị ọzọ jiri ya mụta ihe ma ọ bụ ka e menye onye ahụ ihere n’ihu ọha. Ndị Asiria, ndị obi fere azụ, na-akwụwa ndị ha dọtara n’agha n’osisi pịrị ọnụ. Ha na-amanye osisi ahụ n’afọ onye ha dọtara n’agha, ya eruo ya n’obi, ha egwunyezie osisi ahụ n’ala. Ma, n’iwu ndị Juu, ọ bụrụ na mmadụ akpaa arụ, dị ka ikwulu Chineke ma ọ bụ ikpere arụsị, a na-ebu ụzọ jiri nkume tụgbuo onye ahụ ma ọ bụ e si otú ọzọ gbuo ya. E mechazie, a kwụwa ozu onye ahụ n’elu osisi ka ndị ọzọ jiri ihe e mere ya mụta ihe. (Di 21:22, 23; 2Sa 21:6, 9) Mgbe ụfọdụ, naanị ihe ndị Rom na-eme bụ ikegide onye a mara ikpe ọnwụ n’osisi. Onye ahụ nwere ike ịnọ ọtụtụ ụbọchị tupu ahụ́ mgbu, akpịrị ịkpọ nkụ, agụụ, na anwụ egbuo ya. Ihe ọzọ ha na-eme bụ ịkpọgide aka na ụkwụ onye ahụ n’osisi otú ahụ ha si kpọgide Jizọs, ya anwụọ. (Lu 24:20; Jn 19:14-16; 20:25; Ọrụ 2:23, 36)—Gụọ OSISI ỊTA AHỤHỤ.
-
Osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ.
-
Osisi ịta ahụhụ.
Ọ bụ ihe a sụgharịrị okwu Grik bụ́ stau·rosʹ. Ọ pụtara osisi ma ọ bụ ogwe osisi guzo ọtọ. Ọ bụ n’ụdị osisi a ka a kpọgidere Jizọs. E nweghị ihe gosiri na okwu Grik a pụtara obe, dị ka nke ndị na-ekpere arụsị na-eji efe arụsị ọtụtụ narị afọ tupu Kraịst abịa n’ụwa. Ịkpọ stau·rosʹ “osisi ịta ahụhụ” dabara nnọọ adaba n’ihe ọ pụtara n’asụsụ Grik, n’ihi na e kwukwara gbasara stau·rosʹ mgbe a na-akọwa ụdị ahụhụ a ga-ata ndị na-eso ụzọ Jizọs ma ọ bụ ụdị ihere a ga-emenye ha. (Mt 16:24; Hib 12:2)—Gụọ OSISI A NA-AKWỤWA MMADỤ.
-
Osisi nke ndụ.
-
Òtù.
Ọ bụ ndị kweere otu ihe ma ọ bụ ndị nwere onyeisi ma na-akpa àgwà otú na-adaba nnọọ n’ihe ha kweere. Ọ bụ ihe a na-akpọ Ọrụ 5:17; 15:5; 24:5; 28:22; Mkp 2:6; 2Pi 2:1.
ndị Farisii na ndị Sadusii, bụ́ ìgwè abụọ nọ n’isi n’okpukpe ndị Juu. Ndị na-abụghị Ndị Kraịst kpọkwara Ndị Kraịst “òtù” ma ọ bụ ‘òtù ndị Nazaret.’ Ọ ga-abụ na ha weere na Ndị Kraịst si n’okpukpe ndị Juu kewapụ onwe ha. Ka oge na-aga, a bịara nwee òtù dị iche iche n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Akwụkwọ Mkpughe kpọrọ otu n’ime ha “òtù Nikọleyọs.”— -
Otu ụzọ n’ụzọ iri.
Ọ bụ ihe mmadụ nwe o kere ụzọ iri ma were otu ụzọ ya nye onyinye ma ọ bụ tụọ ụtụ. A na-emekarị ihe a n’ihe gbasara okpukpe. (Mal 3:10; Di 26:12; Mt 23:23) Iwu Mosis kwuru na n’afọ ọ bụla, ndị Izrel ga na-enye ndị Livaị otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe ala ha mepụtara nakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke ìgwè ewu na atụrụ na ehi ha. Ndị Livaị na-ewerezi otu ụzọ n’ụzọ iri n’ihe ndị a e nyere ha nye ndị nchụàjà si n’ezinụlọ Erọn. E nwekwara ihe ndị ọzọ ndị Izrel kwesịrị isi na ha na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri. E nyeghị Ndị Kraịst iwu ka ha na-enye otu ụzọ n’ụzọ iri.
-
Ozi ọma.
N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ọ pụtara ozi ọma gbasara Alaeze Chineke nakwa gbasara nzọpụta a ga-azọpụta ndị nwere okwukwe na Jizọs Kraịst.—Lu 4:18, 43; Ọrụ 5:42; Mkp 14:6.
Ọ
-
Ọdọ ọkụ.
E ji ya mee ihe atụ. A kpọrọ ya ‘ọdọ ọkụ nke sọlfọ na-eme ka ọ na-enwusi ike,’ kwuokwa na ọ bụ “ọnwụ nke abụọ.” A ga-atụba Ekwensu na ndị mmehie na-ekweghị echegharị n’ebe ahụ, tụbakwa ọnwụ na ili (ma ọ bụ Hedis) na ya. Ebe ọ bụ na e kwuru na a ga-atụba ma Ekwensu ma ọnwụ ma Hedis n’ebe ahụ, bụ́ ihe ndị ọkụ na-agaghị ereli, ọ pụtara na ọdọ ọkụ ahụ abụghị ọkụ nkịtị a ga-eji taa ndị dị iche iche ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi, kama ọ nọchiri anya mbibi ebighị ebi.—Mkp 19:20; 20:14, 15; 21:8.
-
Ọgbakọ.
Ọ bụ ìgwè mmadụ ndị bu otu ihe n’obi zukọta ma ọ bụ ndị zukọtara ka ha mee ihe. N’ọtụtụ ebe n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, a kpọrọ mba Izrel ọgbakọ. N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, e kwuo ọgbakọ, ihe ọ pụtara bụ ọgbakọ dị iche iche nke Ndị Kraịst. Ma ọtụtụ mgbe, ihe ọ na-apụta bụ ọgbakọ Ndị Kraịst niile.—Le 4:14; Ọrụ 9:31; Ro 16:5.
-
Ọgbụgba ndụ.
Ọ bụ ihe mmadụ na Chineke, ma ọ bụ mmadụ na mmadụ ibe ya, kwekọrịtara na ha ga-eme ma ọ bụ na ha agaghị eme. Oge ụfọdụ, ọ na-abụ naanị otu onye ga-eme ihe e kwekọrịtara mgbe a gbara ndụ (ọ na-abụkarị nkwa otu onye kwere onye ọzọ). N’oge ndị ọzọ, ọ bụ mmadụ abụọ ahụ ma ọ bụ ndị niile gbara ndụ ahụ ga-eme ihe ha kwekọrịtara. E wepụ ndụ Chineke na ndị mmadụ gbara, Baịbụl kwukwara banyere ndụ ndị mmadụ na ibe ha gbara, nke ebo na ebo gbara, ma ọ bụ nke mba na mba gbara. Ụfọdụ n’ime ọgbụgba ndụ ndị kacha baara ndị mmadụ uru bụ nke Chineke na Ebreham gbara, nke Chineke na Devid gbara, nke Chineke na ndị Izrel gbara (ọgbụgba ndụ Iwu), na nke Chineke na Izrel nke Chineke gbara (ọgbụgba ndụ ọhụrụ).—Je 9:11; 15:18; 21:27; Ọp 24:7; 2Ih 21:7.
-
Ọgwụgwụ oge a.
Ọ bụ ngwụcha nke oge Setan na-achị. Oge a na oge ọnụnọ Kraịst bụ otu. Jizọs ga-enye ndị mmụọ ozi ntụziaka, ha ‘esi n’ebe ndị ezi omume nọ kpọpụta ndị ajọ omume’ ma bibie ha. (Mt 13:40-42, 49) Ndị na-eso ụzọ Jizọs chọrọ ịma mgbe bụ́ oge “ọgwụgwụ.” (Mt 24:3) Tupu Jizọs alaghachi n’eluigwe, o kwere ndị na-eso ụzọ ya nkwa na ya ga-anọnyere ha ruo n’oge ahụ.—Mt 28:20.
-
Ọka Spelt.
Ọ dị ka ọka wit (Triticum spelta), ma, ọka wit ka ya mma. Ọ naghị adịcha mfe isi ná mkpo ya wepụta mkpụrụ ya.—Ọp 9:32.
-
Ọkpụite.
-
Ọnaozi.
Ihe ọ pụtara bụ nwoke a pịrị amụ. A na-ahọpụtakarị ndị ọnaozi ka ha jewe ozi n’obí eze ma ọ bụ ka ha lekọtawa ndị nwunye eze na ndị iko eze. Ndị ọzọ a na-akpọ ndị ọnaozi bụ ụmụ nwoke a họpụtara ka ha rụwa ọrụ n’obí eze, n’agbanyeghị na a pịghị ha amụ. E nwekwara ndị ọzọ a kpọrọ ‘ndị ọnaozi n’ihi Alaeze.’ Ha bụ ndị na-ejide onwe ha ka ihe ọ bụla ghara imegharị ha anya n’ozi Chineke.—Mt 19:12; Es 2:15; Ọrụ 8:27.
-
Ọnịks.
Ọ bụ nkume na-adịchaghị oké ọnụ. O siri ike ka nkume aget. O yikwara nkume kalsedoni. O nwere ebe na-acha ọcha, nwee ebe na-eji oji, nwee ebe na-acha nchara nchara, nwee ebe na-acha ọbara ọbara, nwee ebe na-acha ntụ ntụ, nweekwa ebe na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ. A na-etinye ya n’uwe pụrụ iche nnukwu onye nchụàjà na-eyi.—Ọp 28:9, 12; 1Ih 29:2; Job 28:16.
-
Ọnụnọ.
N’ebe ụfọdụ okwu a gbara n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ihe a na-ekwu bụ oge Jizọs Kraịst bụ́ Mezaya bụ eze, ya bụ, malite mgbe e chiri ya eze n’eluigwe gawazie n’oge ikpeazụ a. Ọnụnọ Kraịst abụghị ihe ga-eme n’otu ntabi anya, nke ọ ga-abụ Jizọs bịa, ya alaakwa ozugbo. Kama, ọnụnọ ya ga-ewe ọtụtụ afọ.—Mt 24:3.
-
Ọnwa ọhụrụ.
Ọ bụ ụbọchị mbụ n’ọnwa ọ bụla na kalenda ndị Juu. N’ụbọchị a, ndị Izrel na-agbakọ, mee oriri, chụọkwa àjà pụrụ iche. O mechara bụrụ ụbọchị ha ji eme ememme dị ezigbo mkpa nakwa ụbọchị ndị mmadụ na-anaghị aga ọrụ.—Ọg 10:10; 2Ih 8:13; Kọl 2:16.
-
Ọrịa na-efe efe.
Ọ bụ ọrịa ọ bụla na-efe ndị mmadụ n’ike n’ike, nke nwekwara ike igbu mmadụ. E nwere oge Chineke na-ejikarị ya ata ndị mehiere ya ahụhụ.—Ọg 14:12; Ezi 38:22, 23; Em 4:10.
-
Ọrụ ebube.
Ọ bụ ọrụ a na-eji ike karịrị ike mmadụ arụ. A na-ewere ya ka ọrụ si n’aka onye karịrị mmadụ. Ihe ndị ọzọ a kpọrọ ya na Baịbụl bụ “ihe àmà,” “ihe ịtụnanya,” na “ihe ebube.”—Ọp 4:21; 1Ez 13:3; Ọrụ 4:22; Hib 2:4.
-
Ọtọsị.
P
-
Papaịrọs.
O yiri ahịhịa amị. Ọ na-adị na mmiri. A na-eji ya akpa nkata, arụ igbe, na ụgbọ mmiri. A na-ejikwa ya emepụta ihe yiri akwụkwọ e ji ede ihe. Ọ bụkwa ya ka e ji mee ọtụtụ akwụkwọ mpịakọta.—Ọp 2:3.
-
Paradaịs.
Ebe mara mma ma ọ bụ ogige okooko osisi ndị mara mma juru. Ebe mbụ dị otú a bụ ogige Iden. Jehova mere ka ọ maa mma ka Adam na Iv biri na ya. Ihe Jizọs gwara otu onye omekome a kpọgidere n’osisi n’akụkụ ya gosiri na ụwa ga-aghọ paradaịs. Paradaịs e kwuru okwu ya ná 2 Ndị Kọrịnt 12:4 bụ nke a ga-enwe n’ọdịnihu. Ma, nke e kwuru okwu ya ná Mkpughe 2:7 bụ nke dị n’eluigwe.—So 4:13; Lu 23:43.
-
Pentikọst.
Ọ bụ ememme nke abụọ n’ime nnukwu ememme atọ a chọrọ ka ụmụ nwoke ndị Juu niile na-eme na Jeruselem. Pentikọst pụtara “(Ụbọchị) nke Iri Ise.” N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, a kpọrọ ya Ememme Owuwe Ihe Ubi ma ọ bụ Ememme Izu. Mana, n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, a kpọrọ ya Ememme Pentikọst. Ọ bụrụ na e si n’abalị iri na isii n’ọnwa Naịsan gụrụ ụbọchị gawa, a na-eme ememme a n’ụbọchị nke iri ise ya.—Ọp 23:16; 34:22; Ọrụ 2:1.
-
Peshia; Ndị Peshia.
Ọ na-abụkarị e kwuwe okwu kpọọ Peshia, a kpọọkwa Midia. A kpọọ ndị Peshia, a kpọọkwa ndị Midia. E nwere ihe jikọrọ obodo abụọ a. N’oge ochie, ndị Peshia bi naanị n’ebe ndịda Ịran. N’oge Saịrọs Onye Ukwu na-achị, ndị Peshia bịara kara ndị Midia ike, ọ bụ eziokwu na ha abụọ jikọrọ aka na-achị. (Ụfọdụ ndị oge ochie na-akọ akụkọ ihe mere eme kwuru na papa Saịrọs Onye Ukwu bụ onye Peshia, mama ya abụrụ onye Midia.) Saịrọs meriri Alaeze Ukwu Babịlọn n’afọ 539 Tupu Oge Ndị Kraịst. Ọ hapụkwara ndị Juu a dọọrọ n’agha ka ha laghachi n’ala ha. Alaeze Ukwu Peshia nọ na-achị malite n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Indus ruo n’ebe ọdịda anyanwụ Oké Osimiri Ejiyan. Ndị Juu so ná ndị ndị Peshia nọ na-achị ruo mgbe Alegzanda Onye Ukwu meriri ndị Peshia n’afọ 331 Tupu Oge Ndị Kraịst. Daniel hụrụ Alaeze Ukwu Peshia n’ọhụụ, e kwukwara gbasara ya n’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Ezra, Nehemaya, na Esta. (Ezr 1:1; Da 5:28)—Gụọ B9.
-
Pim.
Ọ bụ nkume e ji atụ̀ ihe, bụrụkwa ego ole ndị Filistia na-ana onye ha mụụrụ ngwá ọrụ ndị e ji ígwè rụọ. E nwere nkume ụfọdụ e ji atụ̀ ihe nke ndị ọkachamara n’ihe gbasara ihe ndị mgbe ochie gwupụtara n’Izrel. E nwekwara ebe e ji mkpụrụ akwụkwọ Hibru ndị bụ́ mgbochiume dee “pim” n’ahụ́ nkume ndị ahụ. Nke ọ bụla n’ime ha dị ihe dị ka gram asatọ n’arọ, ya bụ, e kee otu shekel ụzọ atọ, ihe dị ka ụzọ abụọ ya.—1Sa 13:20, 21.
-
Pomigranet.
Ọ bụ mkpụrụ osisi yiri apụl. Ihe yiri okpueze na-adị n’isi ya. Azụ ya na-esi ike. Mkpụrụ na-acha pink ma ọ bụ ọbara ọbara na-eju n’ime ya, mmiri na-ejukwa n’ime mkpụrụ ndị ahụ. A na-eji ihe ndị yiri pomigranet chọọ uwe nnukwu onye nchụàjà mma. A na-adụnye ha n’ọnụ ọnụ ala uwe ya na-acha anụnụ anụnụ, nke na-enweghịkwa aka. A kpụnyekwara ihe yiri pomigranet n’elu ogidi abụọ dị n’ihu ụlọ nsọ. A na-akpọ otu n’ime ogidi ndị ahụ Jekin, na-akpọ nke ọzọ Boaz.—Ọp 28:34; Ọg 13:23; 1Ez 7:18.
-
Porneia.—
Gụọ ỊKWA IKO.
-
Prifekt.
-
Purim.
Ọ bụ ememme a na-eme kwa afọ n’abalị iri na anọ na abalị iri na ise n’ọnwa Eda. Ndị Juu ji ya echeta mgbe a napụtara ha n’oge a chọrọ igbukpọ ha mgbe Esta bụ nwunye eze. Pu·rimʹ abụghị okwu Hibru. Ọ pụtara “nza.” Ihe mere e ji akpọ ya Ememme Purim, ma ọ bụ Ememme Nza, bụ n’ihi na Heman fere Pua (ya bụ, Nza) ka ọ mata ụbọchị ọ ga-egbuchapụ ndị Juu.—Es 3:7; 9:26.
R
-
Rabaị; Rabonaị.
Ọ pụtara “Onye Ozizi.” Tupu a mụọ Jizọs, e bidoro itu ụfọdụ ndị “Rabaị” iji kwanyere ha ùgwù. Ọ pụtakwara “onye ukwu m; onye ọma m.” Ụfọdụ ndị gụrụ akwụkwọ, ndị odeakwụkwọ, na ndị na-akụzi Iwu Mosis na-achọ ka ndị mmadụ na-etu ha aha a.—Mt 23:6, 7, ihe e dere n’ala ala peeji ya; Jn 1:38; 20:16.
-
Rehab.
Ọ bụ aha e ji mee ihe atụ n’akwụkwọ Job, Abụ Ọma, na Aịzaya (ọ dị iche na nwaanyị aha ya bụ Rehab nke a kọrọ akụkọ ya n’akwụkwọ Joshụa). Ihe a na-ekwu n’ebe a kpọrọ Rehab aha n’akwụkwọ Job gosiri na Rehab bụ nnukwu anụ mmiri. N’ebe ndị ọzọ, ihe a na-ekwu gosiri na nnukwu anụ mmiri ahụ nọchiri anya Ijipt.—Job 9:13; Ọm 87:4; Aịz 30:7; 51:9, 10.
S
-
Saịvan.
-
Sameria.
Ọ bụ isi obodo alaeze ebo iri nke dị n’ebe ugwu Izrel. Ọ bụgidere isi obodo ruo ihe dị ka narị afọ abụọ. A na-akpọkwa ebo iri ahụ niile Sameria. Obodo a dị n’ugwu a na-akpọ Sameria. N’oge Jizọs nọ n’ụwa, Sameria dị n’agbata Galili na Judia. Galili dị n’ebe ugwu ya, Judia adịrị n’ebe ndịda ya. Jizọs anaghị aga Sameria ekwusa ozi ọma, ma, ọ na-esi ebe ahụ agafe mgbe ụfọdụ, ziekwa ndị bi na ya ozi ọma. Pita ji mkpịsị ugodi Alaeze, nke nwere ihe ọ nọchiri anya ya, mee ka ndị Sameria nweta mmụọ nsọ. Ọ bụ mkpịsị ugodi nke abụọ e nyere ya. (1Ez 16:24; Jn 4:7; Ọrụ 8:14)—Gụọ B10.
-
Sanhedrin.
Ọ bụ nnukwu ụlọikpe ndị Juu nwere. Ọ dị na Jeruselem. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ndị na-ekpe ikpe na ya na-adị mmadụ iri asaa na otu. Ndị so na ha bụ nnukwu onye nchụàjà na ndị ọzọ bụtụrụla nnukwu ndị nchụàjà, ndị si n’ezinụlọ e si ahọpụta nnukwu onye nchụàjà, ndị okenye, ndị isi n’ezinụlọ na ndị isi nke ebo dị iche iche, nakwa ndị odeakwụkwọ.—Mk 15:1; Ọrụ 5:34; 23:1, 6.
-
Setan.
-
Setrap.
Ọ bụ gọvanọ ma ọ bụ onye na-achị otu mpaghara n’aha eze, n’ọchịchị ndị Babịlọn na nke ndị Peshia. Ọ bụ eze na-ahọpụta onye setrap ka ọ chịwa.—Ezr 8:36; Da 6:1.
-
Sia.
-
Sietis.
-
Sila.
Ọ na-abụ mgbe e kwuwere ihe gbasara egwú ma ọ bụ abụ ka a na-ekwute okwu a. Ọ dị ma n’akwụkwọ Abụ Ọma ma n’akwụkwọ Habakọk. O nwere ike ịbụ nkwụsịtụ ndị na-abụ abụ na-akwụsịtụ ma ha bụwa abụ ma ọ bụ nke ndị na-akụ egwú na-akwụsịtụ ma ha kụwa egwú, ma ọ bụkwanụ nke a na-akwụsịtụ mgbe a na-akụ egwú, na-abụkwa ya abụ. Ha na-akwụsịtụ ka e nwee ike chebara ihe ahụ ha na-agụ echiche ma ọ bụkwanụ ka ihe ha ka gụchapụrụ doo nnọọ anya. Ihe Baịbụl a na-akpọ Septuagint Grik kpọrọ “sila” bụ di·aʹpsal·ma, nke pụtara “oge egwú kwụsịtụrụ.”—Ọm 3:4; Hab 3:3.
-
Siria; Ndị Siria.—
Gụọ ERAM; NDỊ ERAM.
-
Siza.
Ọ bụ aha otu ezinụlọ bụ́ ndị Rom na-aza. O mechaziri bụrụ aha a na-etu ndị eze Rom. E turu Ọgọstọs, Taịbiriọs, na Klọdiọs aha a na Baịbụl. Ọ bụ eziokwu na a kpọghị Niro aha na Baịbụl, o so ná ndị e turu Siza. N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, “Siza” pụtakwara ọchịchị ma ọ bụ ndị na-achị achị.—Mk 12:17; Ọrụ 25:12.
SH
-
Shekel.
Ọ bụ ihe ndị Hibru kacha eji atụ̀ otú ego na ihe ndị ọzọ hà. Ọ na-adị gram 11.4. Ọ ga-abụ na a na-ekwu “shekel dị n’ebe nsọ” iji mee ka o doo anya na shekel ndị mmadụ ji atụ̀ ihe kwesịrị ịha ka nke e ji atụ̀ ihe n’ụlọ nsọ. Ọ ga-abụ na eze nwere shekel nke ya (nke dị iche na shekel nkịtị), ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na e nwere shekel há otú shekel kwesịrị ịna-aha nke e dosara n’obí eze.—Ọp 30:13.
-
Sheminit.
Ọ bụ okwu gbasara egwú. N’asụsụ Hibru, ọ pụtara “nke asatọ.” Ọ ga-abụ ụda egwú na-ada gbim gbim. Ọ bụrụ gbasara ngwá egwú, ọ ga-abụ ngwá egwú ndị na-ada ka udu. Ọ bụrụkwanụ gbasara egwú, ọ ga-abụ egwú na-ada ka udu, ndị na-agụ ya ejiri olu na-ada ka nke dimkpa nwoke na-agụ ya.—1Ih 15:21; Ọm 6:0; 12:0.
-
Shibat.
-
Shiol.
T
-
Talent.
Ọ bụ ya kacha n’ihe niile ndị Hibru ji atụ̀ ego nakwa ihe ndị ọzọ. Ọ na-adị kilogram 34.2. Talent ndị Grik aharughị ka nke ndị Hibru. Nke ndị Grik na-adị kilogram 20.4. (1Ih 22:14; Mt 18:24)—Gụọ B14.
-
Tamọz.
(1) Ọ bụ aha chi. Ọ bụ ya ka ụmụ nwaanyị Hibru ndị kwụsịrị ife Chineke beere ákwá na Jeruselem. E nwere ndị na-ekwu na Tamọz bụ eze mgbe ọ dị ndụ, ma a malitere fewe ya mgbe ọ nwụrụ. N’otu ihe e dere n’asụsụ Sumerian, ihe a kpọrọ Tamọz bụ Dumuzi. E dekwara na ọ bụ iko chi a na-akpọ Inanna (nke ndị Babịlọn na-akpọ Ishta). Ha kweere na chi a na-enye nwa. (Ezi 8:14) (2) Mgbe ndị Juu si Babịlọn lọta, ọ bụ aha ha malitere ịkpọ ọnwa nke anọ na kalenda ha dị nsọ. Ọ bụkwa ọnwa nke iri na kalenda nkịtị (kalenda ọrụ ubi) nke ndị Juu. Ọnwa a na-amalite n’etiti ọnwa Jun ruo n’etiti ọnwa Julaị.—Gụọ B15.
-
Tatarọs.
Okwu a dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik. Ọ bụ ọnọdụ Chineke dowere ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi n’oge Noa dị ndụ iji weda ha ala. Ha nọzi ka ndị a tụrụ mkpọrọ. Okwu Grik bụ́ tar·ta·roʹo (ya bụ, “ịtụba n’ime Tatarọs”), nke dị na 2 Pita 2:4, apụtaghị na a tụbara ‘ndị mmụọ ozi ahụ mehierenụ’ n’ebe ndị na-ekpere arụsị na-akpọ Tatarọs (ya bụ, ụlọ mkpọrọ dị n’ime ala, ebe gbara ọchịchịrị ụmụ obere chi na-anọ). Kama, ọ pụtara na Chineke wedara ha ala, chụpụ ha n’eluigwe ha bi, napụkwa ha ọkwá dị iche iche ha nwere, ma mee ka uche ha gbaa oké ọchịchịrị nke na ha enweghịzi ike ịma ihe ndị dị ebube Chineke zubere ime. Ihe ga-emecha mee ha bụ ihe ọzọ mere e ji sị na ha nọ n’ọchịchịrị. Baịbụl kwuru na a ga-ebibi ha na Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye na-achị ha. Ha agaghịkwa adị ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi ihe a niile, ịtụba ndị mmụọ ozi ahụ nupụrụ isi na Tatarọs pụtara na Chineke wedara ha ezigbo ala. Ọ dị iche “n’abis” e kwuru okwu ya ná Mkpughe 20:1-3.
-
Terafim.
Ọ bụ arụsị ma ọ bụ chi ezinụlọ na-efe. A na-ajụ ya ase mgbe ụfọdụ ka a mata ihe ga-eme n’ọdịnihu. (Ezi 21:21) Ụfọdụ terafim na-eyi mmadụ, harakwa ka mmadụ, ma ụfọdụ na-adị ezigbo obere. (Je 31:34; 1Sa 19:13, 16) Ihe ndị e gwupụtara n’ala na Mesopotemia na-egosi na ihe na-eso eme ka mmadụ keta akụ̀ ezinụlọ bụ ma ọ bụrụ na onye ahụ ji terafim. (O nwere ike ịbụ ihe a mere Rechel ji were terafim nna ya.) Ọ bụ eziokwu na ọ ga-abụ na ọ bụghị otú ndị Izrel na-eme, ma n’oge ndị ikpe nọ n’Izrel nakwa n’oge ndị eze dị iche iche nọ na-achị ha, e nwere ndị na-eji terafim ekpere arụsị. Terafim sokwa n’ihe ndị Josaya, bụ́ eze rubeere Chineke isi, bibiri mgbe ọ na-achị.—Ikp 17:5; 2Ez 23:24; Ho 3:4.
-
Tibet.
Ọ bụ aha a na-akpọ ọnwa nke iri na kalenda dị nsọ nke ndị Juu. Ọ bụkwa ọnwa nke anọ na kalenda nkịtị (kalenda ọrụ ubi) nke ndị Juu. A malitere ịkpọ ya Tibet mgbe ndị Juu si Babịlọn lọta. Ọnwa a na-amalite n’etiti ọnwa Disemba ruo n’etiti ọnwa Jenụwarị. A na-akpọkarị ya “ọnwa nke iri.” (Es 2:16)—Gụọ B15.
-
Tishri.—
U
-
Ugwu ndị dị na Lebanọn.
Ọ bụ ugwu ndị kwụ n’ahịrị n’ala Lebanọn. A na-akpọ ndị nke dị n’ebe ọdịda anyanwu ugwu Lebanọn, Di 1:7; Ọm 29:6; 92:12)—Gụọ B7.
na-akpọ ndị nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ ugwu Amana. Ihe kebiri ugwu abụọ ndị a kwụ n’ahịrị bụ otu ndagwurugwu dị ogologo nke na-eme nri nke ọma. Ugwu Lebanọn chere ihu n’ụsọ oké osimiri Mediterenian. Ebe kacha elu na ya dị n’agbata mita 1,800 na mita 2,100 (n’agbata amaụkwụ 6,000 na amaụkwụ 7,000). N’oge ochie, ihe juru na Lebanọn bụ nnukwu osisi sida. Ọ na-amasịkarị mba ndị gbara Lebanọn gburugburu ịzụrụ osisi ndị a. ( -
Uwe agha; Ekike agha.
Ọ bụ ihe ndị agha na-eyi iji chebe onwe ha n’agha. Ihe ndị ahụ bụ okpu agha, uwe agha, ájị̀, ihe e ji ígwè rụọ e ji ekpuchi ụkwụ, nakwa ọta.—1Sa 31:9; Efe 6:13-17.
Ụ
-
Ụbọchị e ji akwadebe maka Ụbọchị Izu Ike.
-
Ụbọchị Ikpe.
Ọ bụ ụbọchị, oge, ma ọ bụ mgbe ìgwè mmadụ dị iche iche, mba dị iche iche, ma ọ bụ mmadụ niile ga-aza Chineke ajụjụ. O nwere ike ịbụ oge a ga-ebibi ndị a mara ikpe ọnwụ. Oge ikpe ahụ nwekwara ike ịbụ oge a ga-azọpụta ụfọdụ ndị, ha enweta ndụ ebighị ebi. Jizọs Kraịst na ndịozi ya kwuru banyere “Ụbọchị Ikpe” dị n’ihu nke ga-agbasa ma ndị dị ndụ ma ndị nwụrụ n’oge gara aga.—Mt 12:36.
-
Ụbọchị Ikpuchi Mmehie.
Ọ bụ ụbọchị kacha mkpa n’ụbọchị niile ụmụ Izrel weere ka ụbọchị dị nsọ. A na-akpọkwa ya Yọm Kipọọ (e si n’okwu Hibru bụ́ yohm hak·kip·pu·rimʹ, ya bụ, “ụbọchị mkpuchi,” nweta ya). Ọ bụ abalị iri n’ọnwa Etanim bụ Ụbọchị Ikpuchi Mmehie. Naanị n’ụbọchị a n’afọ ka nnukwu onye nchụàjà na-abanye n’Ebe Kacha Nsọ n’ụlọikwuu ma ọ bụ n’ụlọ nsọ. Ọ na-anọ n’ebe ahụ jiri ọbara chụọ àjà maka mmehie ya, maka mmehie ndị Livaị ndị ọzọ, nakwa maka mmehie ndị Izrel ndị ọzọ. Ndị Izrel na-enwe mgbakọ dị nsọ n’ụbọchị a, ha na-ebukwa ọnụ. Ọ na-abụ ụbọchị izu ike, ụbọchị ha na-anaghị arụ ọrụ ọ bụla.—Le 23:27, 28.
-
Ụbọchị Izu Ike.
Okwu Hibru e si sụgharịta Ụbọchị Izu Ike pụtara “izu ike; ịrara ume.” A bịa n’otú ndị Juu si agụ ụbọchị, ọ bụ ụbọchị nke asaa n’izu (ya bụ, malite ná mgbede Fraịdee ruo ná mgbede Satọdee). Ụbọchị ndị ọzọ a na-akpọ ụbọchị izu ike bụ ụbọchị ụfọdụ a na-eme ememme n’afọ. A na-akpọkwa afọ asaa ọ bụla na afọ iri ise ọ bụla afọ izu ike. E wezụga ọrụ ndị nchụàjà na-arụ n’ụlọ nsọ, e nweghị ọrụ ọ bụla a na-arụ n’Ụbọchị Izu Ike. N’Afọ Izu Ike, ndị Hibru anaghị akọ ihe ọ bụla n’ugbo, ha anaghịkwa agba ibe ha ụgwọ. Ihe ndị e kwuru n’Iwu Mosis ka a ghara ịna-eme n’Ụbọchị Izu Ike agaghị eme ka ihe siere mmadụ ike, ma ndị isi okpukpe ji nwayọọ nwayọọ na-etinye ihe ndị ọzọ, nke meziri ka idebe Ụbọchị Izu Ike na-esiri ndị mmadụ ike n’oge Jizọs nọ n’ụwa.—Ọp 20:8; Le 25:4; Lu 13:14-16; Kọl 2:16.
-
Ụgbọ ịnyịnya.
-
Ụgbọ mmiri Tashish.
Ọ bụ ihe a na-akpọbu ụgbọ mmiri ndị na-aga Tashish n’oge ochie. (Tashish bụ ebe a na-akpọ Spen ugbu a.) Ọ ga-abụ ihe e mechaziri kpọwa nnukwu ụgbọ mmiri ọ bụla ga-agali ebe dị anya. Solomọn na Jehoshafat na-eji ụdị ụgbọ mmiri a ebulata ihe dị iche iche ha zụrụ.—1Ez 9:26; 10:22; 22:48.
-
Ụlọikwuu.
Ọ bụ ụlọ a na-ebugharị ebugharị nke ndị Izrel na-anọ efe Chineke mgbe ha si n’Ijipt pụta. A na-anọ n’ụlọikwuu a achụ àjà, na-anọ na ya efe Chineke, na-ebusakwa igbe ọgbụgba ndụ Jehova na ya, nke na-egosi na Chineke nọ ebe ahụ. Mgbe ụfọdụ, a na-akpọ ya “ụlọikwuu nzute.” E ji osisi rụọ ya, jirikwa ákwà linin kpuchie akụkụ ya niile. A kpanyegasịrị ndị cherob n’ákwà linin ndị ahụ. O nwere ọnụ ụlọ abụọ. A na-akpọ nke mbụ Ebe Nsọ, na-akpọ nke ọzọ Ebe Kacha Nsọ. (Jos 18:1; Ọp 25:9)—Gụọ B5.
-
Ụlọikwuu nzute.
-
Ụlọ nsọ.
Ọ bụ ụlọ a rụrụ na Jeruselem e ji dochie ụlọikwuu ahụ a na-ebugharị ebugharị. Ndị Izrel na-anọ na ya efe Chineke. Ọ bụ Solomọn rụrụ nke mbụ ya, ma, ndị Babịlọn kwaturu ya. Zerubabel rụrụ nke abụọ mgbe ndị Izrel si Babịlọn lọta, Herọd Onye Ukwu emechaakwa rụzigharịa ya. Akwụkwọ Nsọ na-akpọkarị ụlọ nsọ a “ụlọ Jehova.” (Ezr 1:3; 6:14, 15; 1Ih 29:1; 2Ih 2:4; Mt 24:1)—Gụọ B8 na B11.
-
Ụlọ nzukọ.
Okwu Grik a sụgharịrị ụlọ nzukọ pụtara “iwekọta ọnụ; ndị gbakọtara ọnụ.” Mana, n’ọtụtụ amaokwu Baịbụl, ihe ọ pụtara bụ ụlọ ma ọ bụ ebe ndị Juu na-ezukọ ka a kụziere ha ihe ma ọ bụ ka ha gụọ Akwụkwọ Nsọ, zie ozi ọma ma kpee ekpere. N’oge Jizọs nọ n’ụwa, obodo ọ bụla butụrụ ibu n’Izrel na-enwe otu ụlọ nzukọ, ma obodo ndị nke buru ezigbo ibu na-enwe ihe karịrị otu ụlọ nzukọ.—Lu 4:16; Ọrụ 13:14, 15.
-
Ụmụ Erọn.
Ọ bụ ndị si n’ezinụlọ Erọn, bụ́ nwa nwa Livaị. Erọn bụ onye mbụ a họpụtara ka ọ bụrụ nnukwu onye nchụàjà mgbe e nyere Iwu Mosis. Ụmụ Erọn na-arụ ọrụ ndị nchụàjà na-arụ n’ụlọikwuu na n’ụlọ nsọ.—1Ih 23:28.
-
Ụtụ.
Ọ bụ ihe otu obodo na-enye obodo ọzọ na-achị ha ma ọ bụ nke otu onye ọchịchị na-enye onye ọchịchị ọzọ ọ nọ n’okpuru ya. A na-atụ ụtụ a ka udo dịrị ma ọ bụkwanụ ka ndị a na-atụrụ ya na-echebe ndị na-atụrụ ha ya. (2Ez 3:4; 18:14-16; 2Ih 17:11) E nwekwara ụtụ ndị mmadụ n’otu n’otu na-atụ.—Neh 5:4; Rom 13:7.
-
Ụzọ.
Ọ bụ okwu Baịbụl na-eji egosi àgwà ma ọ bụ omume na-amasị Jehova ma ọ bụkwanụ nke na-anaghị amasị ya. E nwere mgbe e kwuru na ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst na-eso “Ụzọ Onyenwe anyị.” Ihe ọ pụtara bụ na ihe kacha ha mkpa ná ndụ bụ inwe okwukwe na Jizọs Kraịst na ịkpa àgwà ka ya.—Ọrụ 19:9.
V
-
Varanda Solomọn.
N’oge Jizọs nọ n’ụwa, ọ bụ varanda dị n’ebe ọwụwa anyanwụ ogige dị n’èzí ụlọ nsọ. A kụchiri elu ya akụchi. Ọtụtụ ndị na-ekwu na o so n’ihe fọrọ n’ụlọ nsọ Solomọn rụrụ. E nwere oge Jizọs nọ na-ejegharị ebe ahụ ‘n’oge oyi.’ N’oge ndịozi Jizọs, Ndị Kraịst na-ezukọkwa ebe ahụ efe Chineke. (Jn 10:22, 23; Ọrụ 5:12)—Gụọ B11.
Y
-
Yok.
Ọ bụ osisi mmadụ na-anya n’ubu ma konye ibu n’isi ya abụọ. E nwekwara ụdị nke a na-atụkwasị n’olu anụmanụ abụọ (ọ na-abụkarị ehi), jiri ha dọkpụrụ ụgbọala ma ọ bụ ihe e ji akọ ugbo. Ndị ohu na-ejikarị yok ebu ibu na-anyị ezigbo arọ. Ọ bụ ya mere a na-eji eji yok ama atụ ịgba ohu ma ọ bụ mmadụ ịnọ n’okpuru onye ọzọ, jirikwa ya eme ihe atụ onye a na-emegbu emegbu na onye a na-ata ahụhụ. E kwuo na a nyapụrụ mmadụ yok ma ọ bụ na a gbajiri yok mmadụ nya, ọ pụtara na onye ahụ enwerela onwe ya, a naghịzi emegbu ya, nakwa na a naghịzi erigbu ya.—Le 26:13; Mt 11:29, 30.
-
Yufretis.
Ọ bụ osimiri kacha ogologo na nke kacha mkpa n’agbata ebe ndịda na ebe ọdịda anyanwụ Eshia. Ọ bụkwa otu n’ime nnukwu osimiri abụọ dị na Mesopotemia. Ebe mbụ a kpọrọ osimiri a aha bụ na Jenesis 2:14. Ọ bụ otu n’ime osimiri anọ dị n’Iden, a kpọkwara ya “nnukwu osimiri.” Ọ bụ n’osimiri a ka ala e kenyere ụmụ Izrel kwụsịrị n’ebe ugwu. (Je 15:18; Mkp 16:12)—Gụọ B2.
-
Yurim na Tọmịm.
Ha bụ ihe nnukwu onye nchụàjà na-eji amata ihe bụ́ uche Chineke ma mba Izrel nwee ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa ha chọrọ ka Jehova zaa ha. Otú e si eji ya amata ihe bụ́ uche Chineke yiri otú e si eji ife nza amata ihe bụ́ uche Chineke. A na-etinye Yurim na Tọmịm n’akpa nnukwu onye nchụàjà na-anya n’obi ma ọ banyewe n’ụlọikwuu. Ọ ga-abụ na a kwụsịrị iji ha eme ihe mgbe ndị Babịlọn bibiri Jeruselem.—Ọp 28:30; Neh 7:65.
Z
-
Zayọn; Ugwu Zayọn.
Ọ bụ ihe a na-akpọ obodo ndị Jebus a rụsiri ike nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jeruselem. Mgbe Devid weghaara obodo ahụ, ọ rụrụ obí ya ebe ahụ, a kpọwazie ya “Obodo Devid.” (2Sa 5:7, 9) Ọ bụ mgbe Devid mere ka e buga Igbe Ọgbụgba Ndụ n’Ugwu Zayọn ka ugwu ahụ ghọrọ ugwu dị nsọ n’anya Jehova. Ebe a rụrụ ụlọ nsọ n’Ugwu Moraya mechakwara soro n’ebe a na-akpọ Ugwu Zayọn. Oge ụfọdụ, a na-akpọkwa Jeruselem niile Ugwu Zayọn. A na-ejikarị ya eme ihe atụ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.—Ọm 2:6; 1Pi 2:6; Mkp 14:1.
-
Ziv.
Ọ bụ aha a na-akpọbu ọnwa nke abụọ na kalenda dị nsọ nke ndị Juu. Ọ bụkwa ọnwa nke asatọ na kalenda nkịtị (kalenda ọrụ ubi) nke ndị Juu. A kpọrọ ya Iya n’akwụkwọ okpukpe ndị Juu a na-akpọ Talmud nakwa n’ihe ndị ọzọ ndị Juu dere mgbe ha si Babịlọn lọta. Ọnwa a na-amalite n’etiti ọnwa Eprel ruo n’etiti ọnwa Mee. (1Ez 6:37)—Gụọ B15.
-
Zus.
Ọ bụ chi kachanụ n’ime chi niile ndị Grik na-efe. Na Listra, ndị mmadụ kpọrọ Banabas Zus maka na ha chere na ọ bụ chi. E nwere ihe ndị mgbe ochie a hụrụ n’ebe dị nso na Listra. Ihe e dere na ha bụ “onye nchụàjà Zus” na “Zus chi anyanwụ.” Ihe a tụrụ n’ahụ́ ụgbọ mmiri Pọl bara n’agwaetiti Mọlta bụ “ụmụ Zus.” Ụmụ Zus ahụ bụ ejima. Aha ha bụ Kastọ na Polọs.—Ọrụ 14:12; 28:11.