Abụ Ọma 150:1-6
150 Toonụ Jaa!*+
Nọrọnụ n’ụlọ nsọ Chineke too ya.+
Nọrọnụ n’okpuru mbara igwe nke na-egosi na ọ dị ike too ya.+
2 Toonụ ya n’ihi nnukwu ọrụ ndị ọ na-arụ.+
Toonụ ya maka na ọ bụ nnọọ onye ukwu.+
3 Fụọnụ opi too ya.+
Jirinụ ụbọ akwara na une too ya.+
4 Jirinụ obere ịgbà+ too ya, gbaakwanụ egwú a na-agba gburugburu gburugburu.
Jirinụ ụbọ+ na ọjà+ too ya.
5 Jirinụ ájà ndị na-ada ụda too ya.
Jirinụ ájà ndị na-adasi ụda ike too ya.+
6 Ka ihe niile na-eku ume too Jaa.
Toonụ Jaa!*+
Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji
^ Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
^ Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.