Abụ Ọma 150:1-6

  • Ka ihe niile na-eku ume too Jaa

    • Haleluja! (1, 6)

150  Toonụ Jaa!*+ Nọrọnụ n’ụlọ nsọ Chineke too ya.+ Nọrọnụ n’okpuru mbara igwe nke na-egosi na ọ dị ike too ya.+   Toonụ ya n’ihi nnukwu ọrụ ndị ọ na-arụ.+ Toonụ ya maka na ọ bụ nnọọ onye ukwu.+   Fụọnụ opi too ya.+ Jirinụ ụbọ akwara na une too ya.+   Jirinụ obere ịgbà+ too ya, gbaakwanụ egwú a na-agba gburugburu gburugburu. Jirinụ ụbọ+ na ọjà+ too ya.   Jirinụ ájà ndị na-ada ụda too ya. Jirinụ ájà ndị na-adasi ụda ike too ya.+   Ka ihe niile na-eku ume too Jaa. Toonụ Jaa!*+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.
Ma ọ bụ “Haleluja!” “Jaa” bụ mkpọbiri aha Jehova.