Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AJỤJỤ NKE 14

Ajụjụ nke 14: Olee ihe ị ga-eme ka ị ghara ịna-emefusị ihe i nwere?

“Onye oriri na nkwari na-amasịkarị ga-ada ogbenye. Onye na-anaghị eji anya ahụ mmanya na mmanụ agaghị aba ọgaranya.”

Ilu 21:17

‘Onye gbazitere ihe bụ ohu onye gbazinyere ya ihe.’

Ilu 22:7

“Ò nwere onye n’ime unu chọrọ ịrụ ụlọ elu, na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu, ka ọ mara ma ò nwere ihe ga-ezu iji rụchaa ya? Ma ọ́ bụghị ya, o nwere ike ịtọ ntọala ya ma ọ gaghị arụchali ya. Ndị niile hụrụ ya ga-amalitekwa ịkwa ya emo, na-asị: ‘Onye a bidoro ịrụ ụlọ ma ọ rụchalighị ya.’”

Luk 14:28-30

“Mgbe ha rijuchara afọ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Tụtụkọtanụ ihe ha rifọrọ, ka ihe ọ bụla ghara ịla n’iyi.’”

Jọn 6:12