Abụ Ọma 95:1-11
95 Bịanụ ka anyị tie mkpu ọṅụ n’ihu Jehova.
Ka anyị tie mkpu ọṅụ ma too Oké Nkume na-azọpụta anyị.+
2 Ka anyị bịa n’ihu ya kelee ya.+
Ka anyị tie mkpu ọṅụ ma bụkuo ya abụ otuto.
3 N’ihi na Jehova bụ Chineke ukwu.
Ọ bụ Eze kacha chi ọzọ niile.+
4 Ebe ndị kacha mie emie n’ụwa dị ya n’aka.
Ọ bụkwa ya nwe elu elu ugwu niile.+
5 Ọ bụ ya kere oké osimiri, ọ bụkwa ya nwe ya.+
O ji aka ya kee ala nkịtị.+
6 Bịanụ ka anyị fee ya ma kpọọrọ ya isiala.
Ka anyị gbuo ikpere n’ala n’ihu Jehova bụ́ Onye kere anyị.+
7 N’ihi na ọ bụ Chineke anyị,Anyị bụ ndị ọ na-elekọta,Bụrụkwa ìgwè atụrụ ọ na-enye nri.+
Taa, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu ya,+
8 Unu akpọchila obi unu otú nna nna unu hà mere na Meriba,*+Otú ha mere mgbe ha nọ na Masa,* n’ala ịkpa,+
9 Mgbe nna nna unu hà nwara m ọnwụnwa.+
Ha mara m aka n’agbanyeghị na ha hụrụ ihe ndị m mere.+
10 M kpọrọ ọgbọ ahụ asị ruo afọ iri anọ, m sịkwara:
“Ha bụ ndị isi ike, ndị na-eme naanị ihe dị ha n’obi.
Ha amatabeghị m.”
11 M wee jiri iwe ṅụọ iyi, sị:
“Ha agaghị eso m zuo ike.”+