Abụ Ọma 95:1-11

  • Ife Chineke na irubere ya isi

    • “Taa, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu ya” (7)

    • “Unu akpọchila obi unu” (8)

    • “Ha agaghị eso m zuo ike” (11)

95  Bịanụ ka anyị tie mkpu ọṅụ n’ihu Jehova. Ka anyị tie mkpu ọṅụ ma too Oké Nkume na-azọpụta anyị.+  2  Ka anyị bịa n’ihu ya kelee ya.+ Ka anyị tie mkpu ọṅụ ma bụkuo ya abụ otuto.  3  N’ihi na Jehova bụ Chineke ukwu. Ọ bụ Eze kacha chi ọzọ niile.+  4  Ebe ndị kacha mie emie n’ụwa dị ya n’aka. Ọ bụkwa ya nwe elu elu ugwu niile.+  5  Ọ bụ ya kere oké osimiri, ọ bụkwa ya nwe ya.+ O ji aka ya kee ala nkịtị.+  6  Bịanụ ka anyị fee ya ma kpọọrọ ya isiala. Ka anyị gbuo ikpere n’ala n’ihu Jehova bụ́ Onye kere anyị.+  7  N’ihi na ọ bụ Chineke anyị,Anyị bụ ndị ọ na-elekọta,Bụrụkwa ìgwè atụrụ ọ na-enye nri.+ Taa, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu ya,+  8  Unu akpọchila obi unu otú nna nna unu hà mere na Meriba,*+Otú ha mere mgbe ha nọ na Masa,* n’ala ịkpa,+  9  Mgbe nna nna unu hà nwara m ọnwụnwa.+ Ha mara m aka n’agbanyeghị na ha hụrụ ihe ndị m mere.+ 10  M kpọrọ ọgbọ ahụ asị ruo afọ iri anọ, m sịkwara: “Ha bụ ndị isi ike, ndị na-eme naanị ihe dị ha n’obi. Ha amatabeghị m.” 11  M wee jiri iwe ṅụọ iyi, sị: “Ha agaghị eso m zuo ike.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Meriba pụtara “Esemokwu.”
Masa pụtara “Ọnwụnwa.”