Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 36

Jefta Ekwe Jehova Nkwa

Jefta Ekwe Jehova Nkwa

Ndị Izrel hapụkwara Jehova, ma malite ife chi ọzọ. Mgbe ndị Amọn lụsoro ndị Izrel agha, chi ndị ahụ ha na-efe enyereghị ha aka. Ndị Izrel tara ahụhụ ruo ọtụtụ afọ. Ha mechara gwa Jehova, sị: ‘Anyị emehiela. Biko, napụta anyị n’aka ndị iro anyị.’ Ha mebiri arụsị ha niile, maliteghachi ife Jehova. Jehova achọghị ka ha nọgide na-ata ahụhụ.

Jehova họpụtara otu dike aha ya bụ Jefta ka o duru ndị Izrel gaa lụso ndị Amọn agha. Jefta gwara Jehova, sị: ‘Ọ bụrụ na i mee ka anyị merie n’agha a, m lọta, m ga-enye gị onye mbụ pụtara izute m.’ Jehova zara ekpere Jefta ma nyere ya aka ya emerie n’agha ahụ.

Mgbe Jefta lọtara, onye mbụ bịara izute ya bụ nwa ya nwaanyị. Ọ bụ naanị ya ka ọ mụrụ. Ọ kụụrụ ịgbà, gbara egwú na-abịa ka o zute nna ya. Gịnị ka Jefta ga-emezi? O chetara nkwa o kwere, ma sị: ‘Ewoo, ada m! I meela ka obi gbawaa m. Ekwela m Jehova nkwa. Ka m nwee ike imezu nkwa a, m ga-eziga gị n’ụlọikwuu dị na Shaịlo ka i jewere ya ozi.’ Ma, ọ gwara nna ya, sị: ‘Ọ bụrụ na i kwela Jehova nkwa, mezuo ya. Biko, tupu mụ agaa, nye m ọnwa abụọ ka mụ na ndị enyi m gaa n’ugwu nọtụ. Anyị lọta, mụ agawa.’ Ada Jefta ji obi ya niile jeere Chineke ozi n’ụlọikwuu n’oge niile ọ dị ndụ. N’afọ ọ bụla, ndị enyi ya na-aga eleta ya na Shaịlo.

“Onye hụkwara nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’anya nke ukwuu karịa otú ọ hụrụ m ekwesịghị m.”—Matiu 10:37