ISI NKE 102
Mkpughe E Kpugheere Jọn
Mgbe Jọn onyeozi nọ n’ụlọ mkpọrọ n’agwaetiti Patmọs, Jizọs mere ka ọ hụ ọhụụ iri na isii gosiri ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ọhụụ ndị ahụ gosiri otú a ga-esi doo aha Jehova nsọ, otú Alaeze ya ga-esi bịa, nakwa otú uche ya ga-esi mee n’ụwa otú o si eme n’eluigwe.
N’otu n’ime ọhụụ ndị ahụ, Jọn hụrụ Jehova ka ọ nọ n’ocheeze ya dị ebube n’eluigwe, ndị okenye iri abụọ na anọ agbaa ya gburugburu. Ndị okenye ahụ yi ákwà ọcha, kpurukwa okpueze ọlaedo. Àmụ̀mà si n’ocheeze ahụ na-egbu, égbè eluigwe esikwa na ya na-agba. Ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ na-akpọrọ Jehova isiala, na-efekwa ya. N’ọhụụ ọzọ, Jọn hụrụ oké igwe mmadụ ndị si ná mba niile, ndị niile, na asụsụ niile ka ha na-efe Jehova. Jizọs bụ́ Nwa Atụrụ ahụ na-azụ ha ka atụrụ, durukwa ha na-aga na mmiri nke ndụ. O mechara hụ ọhụụ ọzọ. N’ọhụụ a, Jizọs ghọrọ Eze, malite ịchị n’eluigwe, ndị okenye iri abụọ na anọ ahụ sokwa ya na-achị. N’ọhụụ ọzọ, Jọn hụrụ ka Jizọs na-alụso dragọn bụ́ Setan na ndị mmụọ ọjọọ agha. Jizọs si n’eluigwe chụda ha n’ụwa.
Jọn hụrụ ọhụụ ọzọ mara mma nke gosiri ebe Nwa Atụrụ ahụ na otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ (144,000) guzo n’Ugwu Zayọn. Ọ hụkwara ebe otu mmụọ ozi na-efegharị n’ụwa ma na-agwa ndị mmadụ ka ha tụọ egwu Chineke ma nye ya otuto.
Ọ hụkwara ọhụụ ọzọ gosiri ebe a na-alụ agha Amagedọn. N’agha ahụ, Jizọs na ndị agha ya meriri Setan na ndị niile na-akwado ya. N’ọhụụ nke ikpeazụ, Jọn hụrụ na udo dịzi ma n’eluigwe ma n’ụwa. E bibiela Setan na ndị niile so ya na-enupụrụ Chineke isi. Ndị niile nọ n’eluigwe nakwa n’ụwa na-edo aha Jehova nsọ ma na-efe naanị ya.
“M ga-eme ka gị na nwaanyị ahụ dịrị n’iro, meekwa ka nwa gị na nwa ya dịrị n’iro. Nwa ya ga-egwepịa gị isi, ị ga-emerụkwa ya ahụ́ n’ikiri ụkwụ.”—Jenesis 3:15