Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 3

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 3

Mgbe Iju Mmiri ahụ gachara, Baịbụl gwara anyị aha mmadụ ole na ole fere Jehova. Otu n’ime ha bụ Ebreham. Na Baịbụl, a kpọrọ ya enyi Jehova. Gịnị mere e ji kpọọ ya enyi Jehova? Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere nwa gị aka ka ọ mata na Jehova hụrụ ya n’anya, chọọkwa inyere ya aka. Anyị nwere ike iji obi anyị niile rịọ Jehova ka o nyere anyị aka ime ka Ebreham, Lọt, Jekọb, na ndị ọzọ fere Jehova. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-emezu nkwa niile o kwere anyị.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 7

Ụlọ Elu Babel

Ụfọdụ ndị malitere ịrụ obodo na ụlọ elu ga-eru eluigwe. Gịnị mere Chineke ji mee ka ha sụwa asụsụ dị iche iche na mberede?

ISI NKE 8

Ebreham na Sera Rubeere Chineke Isi

Gịnị mere Ebreham na Sera ji hapụ ụlọ ha n’obodo Ọọ ma gaa na-ebi ebe dị iche iche na Kenan?

ISI NKE 9

Ebreham na Sera Mechara Mụta Nwa

Olee otú Chineke ga-esi mezuo nkwa ahụ o kwere Ebreham? Ọ̀ bụ Aịzik ka ọ̀ bụ Ishmel ka ọ ga-esi n’aka ya mezuo nkwa a?

ISI NKE 10

Cheta Nwunye Lọt

Chineke mere ka ọkụ na sọlfọ zo na Sọdọm na Gọmọra. Gịnị mere o ji bibie obodo ndị ahụ? Gịnị mere anyị ga-eji cheta nwunye Lọt?

ISI NKE 11

Chineke Lere Okwukwe Ebreham Ule

Chineke gwara Ebreham, sị: ‘Biko, kpọrọ nwa gị nwoke ị mụrụ naanị ya, gaa n’Ugwu Moraya jiri ya chụọrọ m àjà.’ Ebreham ọ̀ ga-emenụ ihe Chineke gwara ya mee?

ISI NKE 12

Jekọb Ketara Ihe A Na-ekenye Ọkpara

Aịzik na Ribeka mụrụ ejima. Ha bụ Ịsọ na Jekọb. E bu ụzọ mụọ Ịsọ, e kwesịrị inye ya ihe ruuru ọkpara. Gịnị mere o ji nye ya Jekọb n’ihi otu efere ofe?

ISI NKE 13

Jekọb na Ịsọ Kpeziri

Olee otú mmụọ ozi si gọzie Jekọb? Olee otú Jekọb na Ịsọ si kpezie?