ISI NKE 50

Jehova Nyeere Jehoshafat Aka

Jehova Nyeere Jehoshafat Aka

Jehoshafat eze Juda bibiri ebe ịchụàjà Bel, kpochapụkwa arụsị na Juda. Ọ chọrọ ka ndị obodo ya mara iwu Jehova. Ọ bụ ya mere o ji ziga ndị isi na ndị Livaị ka ha gaa na Juda niile kụziere ndị mmadụ iwu Jehova.

Obodo ndị dị Juda nso na-atụ ụjọ ịbịa lụso ya agha n’ihi na ha ma na Jehova na-enyere ndị Juda aka. Ha na-ewetadịrị Eze Jehoshafat onyinye. Ma ndị Moab, ndị Amọn, na ndị bi na Sia bịara ịlụso ndị Juda agha. Jehoshafat ma na enyemaka Jehova dị ya mkpa. O mere ka ụmụ nwoke niile, ụmụ nwaanyị niile, na ụmụntakịrị niile bịakọta na Jeruselem. Ọ nọ n’ihu ha niile kpee ekpere, sị: ‘Jehova, anyị agaghị emerili n’agha a ma ọ bụrụ na i nyereghị anyị aka. Biko, gwa anyị ihe anyị ga-eme.’

Jehova zara ekpere ya. Ọ gwara ya, sị: ‘Unu atụla egwu. M ga-enyere unu aka. Nọrọnụ ebe unu kwesịrị ịnọ. Guzoronụ otu ebe ka unu hụ otú m ga-esi zọpụta unu.’ Olee otú Jehova si zọpụta ha?

N’echi ya, Jehoshafat họọrọ ndị na-abụ abụ ma gwa ha ka ha bụrụ abụ na-aga n’ihu, ndị agha esoro ha n’azụ. Ha ji ụkwụ si Jeruselem garuo n’ọgbọ agha, n’ebe a na-akpọ Tekoa.

Ka ndị ahụ ji ọṅụ na-abụsi abụ ike ma na-eto Jehova, Jehova lụụrụ ha agha. O mere ka ndị Amọn na ndị Moab ghara ịma ihe ha na-eme eme, nke mere ka ha malite igburịta ibe ha. O nweghị otu onye n’ime ha fọrọ ndụ. Ma, Jehova chebere ndị Juda, ndị agha ha, na ndị nchụàjà. Mgbe mba ndị nọ ha gburugburu nụrụ ya, ha matara na Jehova ka na-alụrụ ndị ya agha. Olee otú Jehova si azọpụta ndị ya? O nwere ọtụtụ ụzọ o si eme ya. Enyemaka mmadụ adịghị ya mkpa iji mee ya.

“Unu agaghị eso alụ agha a. Nọrọnụ ebe unu kwesịrị ịnọ. Guzoronụ otu ebe ka unu hụ otú Jehova ga-esi zọpụta unu.”​—2 Ihe E Mere 20:17