IHE Ị GA-AMỤTA N’AKỤKỌ BAỊBỤL

Jehova Mere Ka Obi Sie Ịlaịja Ike

Igbo
Jehova Mere Ka Obi Sie Ịlaịja Ike
https://cms-imgp.jw-cdn.org/img/p/1102016057/univ/art/1102016057_univ_sqr_xl.jpg
lfb ihe ọmụmụ 47

ISI NKE 47

Jehova Mere Ka Obi Sie Ịlaịja Ike

Jehova Mere Ka Obi Sie Ịlaịja Ike

Mgbe Jezibel nụrụ na Ịlaịja gburu ndị amụma Bel, ezigbo iwe were ya. O ziri ozi ka e zie Ịlaịja, sị: ‘Echi, ị ga-anwụ otú ahụ ndị amụma Bel nwụrụ.’ Ezigbo egwu tụwara Ịlaịja, ya agbaga n’ọzara. Ọ nọzi ebe ahụ kpee ekpere, sị: ‘Jehova, ike agwụla m. Gbuo m ka m nwụọ.’ Ụra buuru ya n’okpuru otu osisi n’ihi otú ike si gwụchaa ya.

Otu mmụọ ozi bịara kpọtee ya ma jiri nwayọọ sị ya: “Bilie rie nri.” Ịlaịja hụrụ achịcha dị n’elu nkume dị ọkụ na otu nnukwu iko mmiri. Ọ tara achịcha ahụ, ṅụọ mmiri, hiwe ụra ọzọ. Mmụọ ozi ahụ kpọtekwara ya ọzọ, sị ya: ‘Rie nri, ka i nweta ume ị ga-eji aga ebe ị ga-aga.’ Ịlaịja biliri ritụkwuo nri. O mechaziri gawa ije ụbọchị iri anọ ehihie na abalị tupu ya eruo n’Ugwu Horeb. N’ebe ahụ, ọ banyere n’otu ọgba ka o hie ụra. Ma, Jehova kpọrọ ya òkù, jụọ ya, sị: “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme ebe a?” Ịlaịja sịrị ya: ‘Ndị Izrel anaghị eme ihe ha kwere gị ná nkwa. Ha akụtuola ebe ịchụàjà gị, gbuokwa ndị amụma gị. Ugbu a, ha na-achọkwa igbu m.’

Jehova gwara ya, sị: ‘Gaa guzoro n’ugwu a.’ Jehova mere ka oké ifufe fee n’ọgba ahụ. Ihe ọzọ o mere bụ ime ka ala maa jijiji. Mgbe ala ọma jijiji ahụ kwụsịrị, ọkụ malitere ịgba n’ugwu ahụ. N’ikpeazụ, Ịlaịja nụrụ olu dị ala nke ji nwayọọ na-agwa ya okwu. Ọ chịịrị uwe fụchie ihu ya ma gaa guzoro n’ihu ọgba ahụ. Jehova jụziri ya ihe mere o ji gbaa ọsọ. Ịlaịja gwara ya, sị: ‘Ọ bụ naanị m fọrọ.’ Ma, Jehova gwara ya, sị: ‘Ọ bụghị naanị gị fọrọ. A ka nwere puku mmadụ asaa (7,000) n’Izrel na-efe m. Gaa tee Ịlaịsha mmanụ ka ọ bụrụ onye amụma ga-anọchi gị.’ Ozugbo Ịlaịja nụrụ ihe a, ọ gawara ime ihe Jehova gwara ya. Ì chere na Jehova ga-enyekwara gị aka ma i mee ihe ọ chọrọ ka i mee? N’eziokwu, ọ ga-enyere gị aka. Ugbu a, ka anyị chọpụta ihe mere n’oge ahụ ọkọchị kọrọ.

“Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, na-ekpenụ ekpere, na-arịọsikwanụ Chineke arịrịọ ike ma na-ekele ya. Ọ bụ otú unu ga-esi mee ka ọ mara ihe unu na-arịọ.”​—Ndị Filipaị 4:6