ISI NKE 47

Jehova Mere Ka Obi Sie Ịlaịja Ike

Jehova Mere Ka Obi Sie Ịlaịja Ike

Mgbe Jezibel nụrụ na Ịlaịja gburu ndị amụma Bel, ezigbo iwe were ya. O ziri ozi ka e zie Ịlaịja, sị: ‘Echi, ị ga-anwụ otú ahụ ndị amụma Bel nwụrụ.’ Ezigbo egwu tụwara Ịlaịja, ya agbaga n’ọzara. Ọ nọzi ebe ahụ kpee ekpere, sị: ‘Jehova, ike agwụla m. Gbuo m ka m nwụọ.’ Ụra buuru ya n’okpuru otu osisi n’ihi otú ike si gwụchaa ya.

Otu mmụọ ozi bịara kpọtee ya ma jiri nwayọọ sị ya: “Bilie rie nri.” Ịlaịja hụrụ achịcha dị n’elu nkume dị ọkụ na otu nnukwu iko mmiri. Ọ tara achịcha ahụ, ṅụọ mmiri, hiwe ụra ọzọ. Mmụọ ozi ahụ kpọtekwara ya ọzọ, sị ya: ‘Rie nri, ka i nweta ume ị ga-eji aga ebe ị ga-aga.’ Ịlaịja biliri ritụkwuo nri. O mechaziri gawa ije ụbọchị iri anọ ehihie na abalị tupu ya eruo n’Ugwu Horeb. N’ebe ahụ, ọ banyere n’otu ọgba ka o hie ụra. Ma, Jehova kpọrọ ya òkù, jụọ ya, sị: “Ịlaịja, gịnị ka ị na-eme ebe a?” Ịlaịja sịrị ya: ‘Ndị Izrel anaghị eme ihe ha kwere gị ná nkwa. Ha akụtuola ebe ịchụàjà gị, gbuokwa ndị amụma gị. Ugbu a, ha na-achọkwa igbu m.’

Jehova gwara ya, sị: ‘Gaa guzoro n’ugwu a.’ Jehova mere ka oké ifufe fee n’ọgba ahụ. Ihe ọzọ o mere bụ ime ka ala maa jijiji. Mgbe ala ọma jijiji ahụ kwụsịrị, ọkụ malitere ịgba n’ugwu ahụ. N’ikpeazụ, Ịlaịja nụrụ olu dị ala nke ji nwayọọ na-agwa ya okwu. Ọ chịịrị uwe fụchie ihu ya ma gaa guzoro n’ihu ọgba ahụ. Jehova jụziri ya ihe mere o ji gbaa ọsọ. Ịlaịja gwara ya, sị: ‘Ọ bụ naanị m fọrọ.’ Ma, Jehova gwara ya, sị: ‘Ọ bụghị naanị gị fọrọ. A ka nwere puku mmadụ asaa (7,000) n’Izrel na-efe m. Gaa tee Ịlaịsha mmanụ ka ọ bụrụ onye amụma ga-anọchi gị.’ Ozugbo Ịlaịja nụrụ ihe a, ọ gawara ime ihe Jehova gwara ya. Ì chere na Jehova ga-enyekwara gị aka ma i mee ihe ọ chọrọ ka i mee? N’eziokwu, ọ ga-enyere gị aka. Ugbu a, ka anyị chọpụta ihe mere n’oge ahụ ọkọchị kọrọ.

“Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, na-ekpenụ ekpere, na-arịọsikwanụ Chineke arịrịọ ike ma na-ekele ya. Ọ bụ otú unu ga-esi mee ka ọ mara ihe unu na-arịọ.”​—Ndị Filipaị 4:6