ISI NKE 32
Onye Ndú Ọhụrụ na Ụmụ Nwaanyị Abụọ Katara Obi
Mgbe Joshụa duru ndị Izrel ruo ọtụtụ afọ, ọ nwụrụ mgbe ọ dị otu narị afọ na iri (110). N’oge Joshụa nọ ndụ, ndị Izrel na-efe Jehova. Ma mgbe ọ nwụrụ, ha bidoro ikpere arụsị otú ndị Kenan na-eme. Jehova kwere ka eze ndị Kenan aha ya bụ Jebin taa ndị Izrel ahụhụ maka na ha kwụsịrị irubere Jehova isi. Ha rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka. Ọ bụ ya mere Jehova ji nye ha onye ndú ọhụrụ aha ya bụ Berak. Ọ ga-enyere ha aka ịlọghachikwute Jehova.
Debora, onye amụma nwaanyị, ziri Berak ozi ka ọ bịa. E nwere ozi Jehova ziri ya ka o zie Berak. Jehova ziri ya, sị: ‘Kpọrọ puku ụmụ nwoke iri (10,000) gaa lụso ndị agha Jebin agha n’iyi Kaịshọn. Ị ga-emeri Sisera, onyeisi ndị agha Jebin, n’ebe ahụ.’ Berak gwara Debora, sị: ‘M ga-aga ma ọ bụrụ na ị ga-eso m aga.’ Debora sịrị ya: ‘M ga-eso gị aga. Ma, mara na ọ bụghị gị ga-egbu Sisera. Jehova kwuru na ọ bụ nwaanyị ga-egbu ya.’
Debora so Berak na ndị agha ya gbagoo n’Ugwu Tebọ ka ha kwadebe maka agha. Ozugbo Sisera nụrụ ihe a, ọ kpọkọtara
ndị na-agba ụgbọ ịnyịnya agha ya na ndị agha ya gaa na ndagwurugwu Kaịshọn. Debora gwara Berak, sị: ‘Taa ka Jehova ga-eme ka i merie.’ Berak na puku ụmụ nwoke iri (10,000) ahụ si n’ugwu ahụ gbadaa ka ha lụso ndị agha Sisera siri ezigbo ike agha.Jehova mere ka iyi Kaịshọn tojuo. Ụgbọ ịnyịnya agha Sisera tọrọ n’apịtị. Sisera hapụrụ ụgbọ ịnyịnya ya gbawa ọsọ. Berak na ndị agha ya meriri ndị agha Sisera, ma Sisera gbafuru. Ọ gara zoo n’ụlọikwuu otu nwaanyị aha ya bụ Jeel. Jeel nyere ya mmiri ara ehi ka ọ ṅụọ, werezie ákwà e ji achụ oyi kpuchie ya. Ụra buuru dike a n’ihi na ike gwụchara ya. Jeel jizi nwayọọ here ehere were ntu kụnye ya n’isi, ya anwụọ.
Berak bịara na-achọ Sisera. Jeel si n’ụlọikwuu ya pụta, sị ya: ‘Bata. M ga-egosi gị nwoke ị na-achọ.’ Berak banyere n’ụlọikwuu ahụ ma hụ ozu Sisera. Berak na Debora bụrụ abụ ha ji too Jehova maka na o mere ka ndị Izrel merie ndị iro ha. Ndị Izrel biri n’udo ruo afọ iri anọ.
“Ụmụ nwaanyị ndị na-ezisa ozi ọma dị ọtụtụ.”—Abụ Ọma 68:11