IHE Ị GA-AMỤTA N’AKỤKỌ BAỊBỤL

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 5

Igbo
Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 5
https://cms-imgp.jw-cdn.org/img/p/1102016135/univ/art/1102016135_univ_sqr_xl.jpg
lfb p. 58-59

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 5

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 5

Ọnwa abụọ ndị Izrel gafechara Oké Osimiri Uhie, ha ruru n’Ugwu Saịnaị. Ha na Jehova nọ ebe ahụ gbaa ndụ, ha abụrụ mba ya pụrụ iche. O chebere ha ma gbooro ha mkpa ha. O nyere ha mana ka ha rie, mee ka uwe ha ghara ịka aka, meekwa ka ha nweta ebe ndị dị mma ha mara ụlọikwuu. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere nwa gị aka ka ọ ghọta ihe mere Jehova ji nye ndị Izrel Iwu, gwa ha rụọ ụlọikwuu, meekwa ka ha nwee ndị nchụàjà. Mee ka ọ ghọta ihe mere anyị ji kwesị ịna-emezu nkwa anyị kwere, ịna-adị umeala n’obi ma na-erubere Jehova isi mgbe niile.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 23

Nkwa Ndị Izrel Kwere Jehova

Ndị Izrel kwere Chineke nkwa pụrụ iche mgbe ha mara ụlọikwuu n’Ugwu Saịnaị.

ISI NKE 24

Ha Emezughị Nkwa Ha Kwere

Ndị Izrel mere mmehie jọgburu onwe ya mgbe Mosis gara n’ugwu ka Chineke nye ya Iwu Iri ahụ.

ISI NKE 25

Ụlọikwuu A Ga-anọ Na-efe Chineke

Igbe ọgbụgba ndụ dị n’ụlọikwuu a pụrụ iche.

ISI NKE 26

Ndị Nnyopụta Iri na Abụọ

Joshụa na Keleb dị iche na mmadụ iri ndị ọzọ so nyopụta ala Kenan.

ISI NKE 27

Ha Nupụụrụ Jehova Isi

E nwere ihe dị mkpa Detan, Abaịram, na narị ụmụ nwoke abụọ na iri ise (250) na-aghọtaghị banyere Jehova.

ISI NKE 28

Jakị Belam Kwuru Okwu

Belam ahụghị onye jakị ya na-ahụ.