Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 12
Jizọs kụziiri ndị mmadụ banyere Alaeze eluigwe. Ọ kụzikwaara ha ka ha na-ekpe ekpere ka e doo aha Chineke nsọ, ka Alaeze ya bịa, nakwa ka e mee uche ya n’ụwa. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, kọwaara nwa gị ihe ihe ndị e kwuru n’ekpere a pụtara nakwa uru ha baara anyị. Jizọs ekweghị ka Setan mee ka ọ kwụsị ife Chineke. Jizọs họọrọ ndịozi ya, ha abụrụ ndị mbụ n’ime ndị ga-eso ya chịa n’Alaeze Chineke. Mee ka ọ ghọta na Jizọs ejighị ife Chineke ezigbo ofufe gwuo egwu. Jizọs chọrọ inyere ndị mmadụ aka. Ọ bụ ya mere o ji gwọọ ndị ọrịa, nye ndị agụụ ji nri, kpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. O ji ọrụ ebube ndị a ọ rụrụ gosi ihe Alaeze Chineke ga-emere ndị mmadụ.
NÁ NKEBI A
ISI NKE 75
Ekwensu Nwara Jizọs Ọnwụnwa
Ekwensu nwara Jizọs ọnwụnwa ugboro atọ. Olee ọnwụnwa atọ ọ nwara ya? Olee ihe Jizọs mere?
ISI NKE 76
Jizọs Mere Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha
Gịnị mere Jizọs ji chụpụ anụmanụ n’ụlọ nsọ ma kpuo tebụl ndị na-agbanwe ego ihu n’ala?
ISI NKE 77
Otu Nwaanyị Nke Bịara n’Olulu Mmiri
O juru otu nwaanyị Sameria anya na Jizọs na-agwa ya okwu. Gịnị mere o ji ju ya anya? Olee ihe Jizọs gwara ya nke ọ na-agwabeghị mmadụ ọ bụla?
ISI NKE 78
Jizọs Kwusara Ozi Ọma Alaeze Chineke
Jizọs gwara ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bụrụ “ndị na-akụta mmadụ.” O mechara kụziere ndị na-eso ụzọ ya iri asaa otú e si ekwusa ozi ọma.
ISI NKE 79
Jizọs Rụrụ Ọtụtụ Ọrụ Ebube
Ebe ọ bụla Jizọs gara, ndị ọrịa na-abịakwute ya ka ọ gwọọ ha, ya agwọọ ha. Ọ kpọlitedịrị otu nwatakịrị nwaanyị n’ọnwụ.
ISI NKE 82
Jizọs Kụziiri Ndị Na-eso Ụzọ Ya Otú E Si Ekpe Ekpere
Olee ihe ndị ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-arịọ?
ISI NKE 83
Jizọs Nyere Ọtụtụ Puku Mmadụ Nri
Gịnị ka ọrụ ebube a na-akụziri anyị banyere Jizọs na Jehova?
ISI NKE 84
Jizọs Gara Ije n’Elu Mmiri
Olee otú i chere obi dị ndịozi Jizọs mgbe ha hụrụ ọrụ ebube a?
ISI NKE 85
Jizọs Gwọrọ Mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike
Gịnị mere na ọ bụghị mmadụ niile ka obi dị mma n’ihe a o mere?
ISI NKE 86
Jizọs Kpọlitere Lazarọs n’Ọnwụ
Mgbe Jizọs hụrụ Meri ka ọ na-ebe ákwá, o bewekwara ákwá. Ma obere oge, obi malitere ịtọ ha ụtọ.