ISI NKE 67

Mgbidi Jeruselem

Mgbidi Jeruselem

N’oge Ezra nọ ndụ, e nwere onye Izrel aha ya bụ Nehemaya. O bi n’obodo dị na Peshia aha ya bụ Shushan na-ejere Eze Atazaksis ozi. Nwanne Nehemaya si Juda gaa Babịlọn ma kọọrọ ya otú ihe si kwụrụ na Jeruselem. Ọ gwara ya, sị: ‘Ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta nọ n’ọnọdụ ọjọọ. A rụghachibeghị mgbidi na ọnụ ụzọ ámá ndị Babịlọn bibiri.’ Ihe a wutere Nehemaya. Ọ bụ ya mere o ji chọọ ịga Jeruselem ka o nyere ha aka. N’ihi ya, o kpere ekpere rịọ Chineke ka o mee ka eze kwe ya ka ọ gaa.

Eze Atazaksis mechara chọpụta na ihu Nehemaya gbarụrụ agbarụ. Ọ sịrị: ‘Ahụtụbeghị m ebe ihu gị gbarụrụ otú a. Gịnị mere?’ Nehemaya gwara ya, sị: ‘Gịnị mere ihu m agaghị agbarụ agbarụ ebe ọ bụ na a rụghachibeghị obodo anyị bụ́ Jeruselem e bibiri ebibi?’ Eze jụrụ ya, sị: ‘Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị?’ Ozugbo ahụ, Nehemaya kpere ekpere n’obi ya. Ọ gwaziri eze, sị: ‘Biko, hapụ m ka m gaa Jeruselem rụghachi mgbidi ya.’ Eze gwara ya ka ọ gawa. Ọ kpọnyekwara ya ndị agha ka ihe ọ bụla ghara ime ya n’ogologo njem ọ ga-aga. O mekwara Nehemaya gọvanọ Juda ma bunye ya osisi ọ ga-eji rụọ ọnụ ụzọ ámá Jeruselem.

Mgbe Nehemaya ruru Jeruselem, ọ gara leruo mgbidi Jeruselem anya. Ọ kpọkọtaziri ndị nchụàjà na ndị isi ma gwa ha, sị: ‘Ọnọdụ anyị nọ na ya dị njọ. Anyị kwesịrị ịmalite ọrụ.’ Ha kwetara ihe o kwuru ma malite ịrụghachi mgbidi Jeruselem.

Ma, ụfọdụ ndị iro ndị Izrel malitere ịchị ha ọchị ma sị ha: ‘Nkịta ọhịa nwedịrị ike ịkwatu ihe a unu na-arụ.’ Ndị Izrel gbachiri ha nkịtị ma rụrụ ọrụ ha na-arụ na-aga. Ha rụliri mgbidi ahụ elu, rụsiekwa ya ike.

Ndị iro ahụ kpebiri na ha ga-esi ebe dị iche iche lụso ha ọgụ na Jeruselem mgbe ha na-agaghị ama. Mgbe ndị Juu nụrụ ya, ụjọ tụrụ ha. Ma, Nehemaya gwara ha, sị: ‘Unu atụla egwu. Jehova nọnyeere anyị.’ Nehemaya dowere ndị nche ka ha na-eche ndị na-arụ ọrụ nche. N’ihi ya, ndị iro enweghị ike ịlụso ndị Izrel agha.

Ndị Izrel ji naanị abalị iri ise na abụọ rụchaa mgbidi ahụ na ọnụ ụzọ ámá ya. Nehemaya kpọtaziri ndị Livaị niile na Jeruselem ka ha nyefee ya Jehova. O kere ha ụzọ abụọ ka ha bụọ abụ. Ha si na steepụ e si agbago Ọnụ Ụzọ Ámá Isi Iyi gbagoro n’elu mgbidi ahụ. Ụfọdụ gawara aka nri, ndị ọzọ agawa aka ekpe, ha agaa Jeruselem gburugburu. Ha nọ na-egbu opi, na-akụ ájà, na-akpọ ụbọ akwara, na-abụkwara Jehova abụ. Ezra duuru otu ìgwè na-aga, Nehemaya eduru ndị nke ọzọ na-aga ruo mgbe ha ruru n’ụlọ nsọ. Mmadụ niile, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị ma ụmụntakịrị chụụrụ Jehova àjà, meekwa ememme. Obi tọrọ ha ezigbo ụtọ nke na ndị nọ n’ebe dị anya nụrụ mkpọtụ ha na-eme.

“Ngwá ọgụ ọ bụla a kpụrụ ka e jiri lụso gị ọgụ agaghị enwe isi.”​—Aịzaya 54:17