ISI NKE 55
Mmụọ Ozi Jehova Napụtara Hezekaya
Ndị Asiria weghaara alaeze Izrel dị ebo iri. Senakerib eze Asiria chọwaziri iweghara alaeze Juda dị ebo abụọ. O ji nwayọọ nwayọọ na-ewekọrọ obodo ndị dị na Juda. Ma, obodo ọ chọsiri ike ka o weghara bụ Jeruselem. Ihe ọ na-amaghị bụ na Jehova na-echebe Jeruselem.
Hezekaya eze Juda nyere Senakerib nnukwu ego ka ọ hapụ iweghara Jeruselem. N’agbanyeghị na Senakerib naara ya ego ahụ, o zigakwara ndị agha ya ka ha gaa bibie Jeruselem. Mgbe ndị agha Asiria rutewere Jeruselem, ezigbo ụjọ jidere ndị Juda. Hezekaya gwaziri ha, sị: ‘Unu atụla egwu. Ndị agha Asiria siri ike, ma Jehova ga-eme ka anyị dị ike karịa ha.’
Senakerib zigara Rabshake ka ọ gaa Jeruselem kparịa ndị bi na ya. Rabshake gara guzoro n’akụkụ mgbidi Jeruselem ma jiri olu dara ụda na-agwa ha, sị: ‘Jehova agaghị enyeliri unu aka. Unu ekwela ka Hezekaya rafuo unu. E nweghị chi ga-anapụtali unu n’aka anyị.’
Hezekaya jụrụ Jehova ihe ya ga-eme. Jehova gwara ya, sị: ‘Ekwela ka ihe a Rabshake kwuru menye gị ụjọ. Senakerib agaghị eweghara Jeruselem.’ Senakerib mechara zigara Hezekaya akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ahụ, ọ sịrị: ‘Chịlierenụ anyị aka elu. Jehova agaghị azọpụtali unu.’ Hezekaya rịọrọ Chineke, sị: ‘Jehova, biko, napụta anyị, ka onye ọ bụla mara na ọ bụ naanị gị bụ ezi Chineke.’ Jehova gwara ya, sị: ‘Eze Asiria agaghị abata na Jeruselem. M ga-echebe obodo m.’
Senakerib chere na o nweghị ihe ga-eme ka ọ ghara iweghara Jeruselem. Ma n’otu abalị, Jehova zigara otu mmụọ ozi ya n’ebe ndị agha Asiria mara ụlọikwuu. Mmụọ ozi ahụ gburu ndị agha Asiria dị otu narị puku na
puku iri asatọ na puku ise (185,000). Ndị kacha ike ná ndị agha Eze Senakerib nwụrụ. O nweghị ihe ọzọ Senakerib ma ọ ga-eme ma ọ́ bụghị ịla n’ụlọ ya n’ihi na e meriela ya. Jehova napụtara Hezekaya na Jeruselem otú o kwuru ọ ga-eme. Ọ bụrụ na ị nọ na Jeruselem n’oge ahụ, ị̀ gaara atụkwasị Jehova obi?“Mmụọ ozi Jehova na-echebe ndị na-atụ egwu ya, ọ na-anapụtakwa ha.”—Abụ Ọma 34:7