Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 14

Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 14

Ndị Kraịst oge mbụ ziri ozi ọma Alaeze Chineke ruo n’ebe kacha anya n’ụwa. Jizọs gwara ha ebe ndị ha ga-ekwusa ozi ọma. Ọ rụkwara ọrụ ebube mee ka ha zie ndị mmadụ ozi ọma n’asụsụ ha. Jehova mere ka ha kwusaa ozi ọma n’atụghị ụjọ, nyekwa ha ike ha ji die nsogbu karịrị akarị ndị mmadụ nọ na-enye ha.

Jizọs gosiri Jọn onyeozi ebube Jehova n’ọhụụ. N’ọhụụ ọzọ, Jọn hụrụ ka Alaeze eluigwe meriri Setan ma bibie ọchịchị ya ruo mgbe ebighị ebi. Jọn hụrụ ka Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) na-achị. Ọ hụkwara ka e mere ka ụwa niile bụrụ paradaịs, ndị niile bi na ya ana-efe Jehova, birikwa n’udo.

NÁ NKEBI A

ISI NKE 94

Mmụọ Nsọ Dakwasịrị Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs

Olee ọrụ ebube mmụọ nsọ nyere ha ike ịrụ?

ISI NKE 95

O Nweghị Ihe Ga-eme Ka Ha Kwụsị Izi Ozi Ọma

Ndị isi okpukpe ndị gburu Jizọs na-achọzi ime ka ndị na-eso ụzọ ya kwụsị izi ozi ọma. Ma ha agaghị akwụsịli ha.

ISI NKE 96

Jizọs Họọrọ Sọl

Sọl bụ ezigbo onye iro Ndị Kraịst. Ma, ndụ ya ga-agbanwe n’oge na-adịghị anya.

ISI NKE 97

Mmụọ Nsọ Dakwasịrị Kọnịliọs

Gịnị mere Chineke ji ziga Pita n’ụlọ nwoke a na-abụghị onye Juu?

ISI NKE 98

E Zisara Ozi Ọma n’Ọtụtụ Mba

Pọl onyeozi na ndị ya na ha so bidoro ikwusa ozi ọma n’obodo ndị dị anya.

ISI NKE 99

Onye Na-elekọta Ụlọ Mkpọrọ Ghọrọ Onye Kraịst

Gịnị gbasara mmụọ ọjọọ, ala ọma jijiji, nakwa mma agha n’akụkọ a?

ISI NKE 100

Pọl na Timoti

Ha abụọ bụ enyi, ha rụkọkwara ọrụ ọnụ ruo ọtụtụ afọ.

ISI NKE 101

A Kpọgara Pọl Rom

Ọtụtụ nsogbu bịaara Pọl onyeozi mgbe ọ na-aga ebe ahụ, ma o meghị ka ike gwụ ya.

ISI NKE 102

Mkpughe E Kpugheere Jọn

Jizọs mere ka Jọn hụ ọhụụ dị iche iche ndị gosiri ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu.

ISI NKE 103

“Ka Alaeze Gị Bịa”

Mkpughe e kpugheere Jọn gosiri otú Alaeze Chineke ga-esi mee ka ihe dị mma n’ụwa.