ISI NKE 12
Jekọb Ketara Ihe A Na-ekenye Ọkpara
Aịzik dị afọ iri anọ mgbe ọ lụrụ Ribeka. Ọ hụrụ ya n’anya nke ukwuu. Ha mechara mụta ụmụ nwoke abụọ bụ́ ejima.
Aha nke mbụ bụ Ịsọ. Aha nke abụọ abụrụ Jekọb. Ịsọ na-agakarị n’ọhịa. Ọ makwa otú e si achụ nta. Ma, Jekọb na-anọkarị n’ụlọ.
N’oge ahụ, a na-ekenye ọkpara ala na ego buru ibu karịa ụmụnne ya ma nna ya nwụọ. A na-akpọ ya ihe a na-ekenye ọkpara. Ma, a bịa n’ezinụlọ Aịzik, nkwa ndị Jehova kwere Ebreham so n’ihe ọkpara Aịzik kwesịrị inweta. Ịsọ ejighị nkwa ndị ahụ kpọrọ ihe, ma Jekọb ji ha kpọrọ ihe.
Otu ụbọchị, Ịsọ si ịchụ nta lọta, ezigbo ike gwụkwara ya. Ọ nụrụ ísì ọmarịcha nri Jekọb nọ na-esi. Ọ sịrị ya: ‘Agụụ agụgbuola m. Kunyetụ m ofe ahụ na-acha ọbara ọbara.’ Jekọb sịrị ya: ‘M ga-ekunye gị ya, ma buru ụzọ nyefee m ihe i kwesịrị inweta dị ka ọkpara.’ Ịsọ zara ya, sị: ‘Olee uru ọ baara m? Werenụ ya, achọrọ m iri nri.’ Ì chere na ihe a Ịsọ mere bụ ihe o kwesịrị ime? Mba. Ịsọ tụfuru ihe dị ezigbo mkpa n’ihi otu efere ofe.
Mgbe Aịzik merela ezigbo agadi, ọ gwara ọkpara ya ka ọ bịa ka ya gọzie ya. Ma, Ribeka nyeere Jekọb, bụ́ nwa ya nke obere aka, Aịzik agọzie ya. Mgbe Ịsọ matara ihe
merenụ, ezigbo iwe were ya. Ọ chọwara otú ọ ga-esi egbu nwanne ya. Aịzik na Ribeka achọghị ka Ịsọ gbuo Jekọb. Ọ bụ ya mere ha ji gwa Jekọb, sị: ‘Gakwuru nwanne nne gị Leban ka gị na ya biri ruo mgbe iwe nwanne gị dajụrụ.’ Jekọb mere ihe a nne na nna ya gwara ya.“Olee uru ọ ga-abara mmadụ ma o nwetachaa ụwa niile ma tụfuo ndụ ya? Ma ọ bụ, gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere ndụ ya?”—Mak 8:36, 37